Coronavirus Second Wave: Lee atụmatụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ tinyere iji gbochie mfesa ọrịa nke abụọ

Mgbe e biputara ya

Ndị butere nje coronavirus na Naịjirịa agafeela mmadụ otu narị puku (100,000) ugbua.

Ihe karịrị mmadụ otu puku (1024) ka nnyocha gosiri na ha butere nje covid19 na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde, dịka ngalaba 'National Centre for Disease Control' (NCDC) si gụpụta.

O teela ndị ọkachamara n'okwu ahụike ji ama ọkwa na ọrịa coronavirus ga-amalitekwa ifesa ọzọ, ya bụ ihe ebidola na Naịjirịa ugbua.

Ụfọdụ steeti na Naịjirịa etinyekwala iwu dị icheiche iji belata mfesa nke abụọ a.

Legọs steeti amachiela nnukwu ọgbakọ ndị mmadụ ma belatakwa ọgbakọ okpukperechi.

Ekiti steeti ehiwela mmachi ngagharị n'abalị ma kagbuo ọgbakọ ọbụla karịrị mmadụ iri abụọ.

BBC kpọtụụrụ steeti niile dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ iji chọpụta njikere ha dị, lee ihe ha gwara anyị:

Abia steeti

Kọmishọna mgbasa ozi n'Abia steeti bụ John Okiyi-Kalu kwuru na ha emeela mkpuchi imi ka ọ bụrụ iwu na steeti ahụ niile.

O kwukwara na gọọmentị emepeela nke bekee kpọrọ 'sample collection points' n'okpuru ọchịchị niile na steeti ahụ ka o wee dị mfe ime nnyocha maya bụ ọrịa.

Okiyi-Kalu kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ụlọakwụkwọ dị na steeti anyị ga-amalite agụmakwụkwọ ọzọ taa, anyị etinyela ihe niile dị mkpa iji chekwaa ụmụakwụkwọ anyị."

"Anyị nwere obere ụlọọgwụ n'ụlọakwụkwọ ọbụla iji dopu nwata akwụkwọ ọbụla na-arịa ọrịa iche tupu ụgbọala ahụike abịa buru ya gaa ụlọọgwụ."

"Ikpuchi ihu bụkwa iwu n'ụlọakwụkwọ niile."

Okiyi kwukwara na gọọmentị emeziela ụlọọgwụ ndopu iche (isolation centres) dị na steeti ahụ, ebe e nwere ohere ga-anabata ihe ruru mmadụ narị abụọ ugbua.

Anambara Steeti

Kọmishọna ahụike n'Anambara steeti bụ Vincent Okpala kọwara na ihe kacha kpalite mfesa nke a bụ maka ndị njem sigasị mba dị icheiche bata.

Okpala gara n'ihu kwuo na gọọmentị amalitekwala mgbasa ozi siri ike iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị.

O kwuru sị: "Anyị agaala n'ọdọ ụgbọala, ahịa, nakwa ụlọụka dị icheich iji nye ndị mmadụ ọzụzụ maka ichekwa onwe ha."

"Anyị adọkwaala aka na ntị na gọọmentị nwere ike imechi ahịa maọbụ ụlọọụka ọbụla ebe ndị mmadụ anaghị eme ihe ha kwesịrị ime."

"Ọzọkwa bụ na mkpuchi ihu bụ iwu n'ụlọọrụ gọọmentị ọbụla, onye eyighi ya agaghị enwe ike ịbata."

Mana Okpala kwuru na nchekwa onwe bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla, "maka na a ghara ndụ kpaa akụ, onye iro erie ya".

Kọmishọna ahụike nke Enugwu, Ebonyi nakwa Imo steeti azaghị oku anyị kpọrọ ha, mana kọmishọna mgbasaozi Imo steeti kwuru ka a kpọghachi ya azụ.

Zọba isi onwe gị

Vincent Okpala bụ kọmishọna ahụike na Anambra steeti kwuru na "ihe kacha mkpa bụ ka onye ọbụla kpachapụrụ onwe ya anya."

Ụzọ mmadụ ga-esi na-echekwa onwe ya gụnyere: Iyi mkpuchi ihu, ịkwọcha aka oge niile, izere ọgbakọ nnukwu mmadụ, ịnọte ndị mmadụ aka nke bekee kpọrọ 'social distancing'.

Ugbua abụghị oge ndị mmadụ ji arụ ụka ma coronavirus ọ bụ eziokwu ka ọ bụghị.

Onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ ga-aracha ya. Ukpana okpoko gburu, ntị chiri ya."