Femi Adesina: Ihe atọ mere Buhari ejighi bụrụ Jubril nke Sụdan

Ebe foto si, Femi Adesina
Dịka okwu na Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari bụ nwoke Sudan aha ya bụ Jubril, ọnu na-ekwuru ya bụ Femi Adesina apụtara kwuo hoo ha na ya bụ okwu bụ nke adigboroja.
N'ozi o dere dịka Onyeisiala Buhari na-eme emume ncheta ọmụmụ ya dịka ọ gbara afọ 78, Maazị Adesina sị na ọ ga-amasị ya na ndị mmadụ ghọtara onye Buhari bụ.
Lee ihe o kwuru:
1: Ọ bụ amaghị ihe na-eme ndị mmadụ ji asị na Buharị bụ Jibril
Maazị Adesina na-ekwu na ndị mmadụ na-ekwu na Buhari nwụrụ n'afọ 2017 nke mere onye Sudan jiri nọchie anya ya.
Ọ sị na okwu ahụ bụ okwu ndị amaghị ihe, n'agbanyeghi na ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ so ekwenye na ya.
2: Buhari ma onye m bu oge o si ọgwụgwọ ya lọta
Adesina gara n'ihu kọọ maka etu ya siri zute Buhari oge o si ụlọ ọgwụ n'ofesi lọta n'ọnwa Ọgụstụ 2017.
"Ka m kọrọ unu akụkọ. N'ụbọchị Buhari lọtara Naịjirịa na Ọgụstụ 2017, a gara m ebe Onyeisi ndị agha bụ Ọchịagha Abayomi Olonisakin na-agba nkwụ ada ya nwaanyị. Nke a mere na-akwadoro m ọfụma. yiri uwe agbada. E si m ebe ahụ gawa ọdọ ụgbọelu gaa izute ọnyeisiala.
"Anyị kwụ n'ahịrị. Onyeisiala were n'ekele onye ọbụla. Ka o ruru ebe m nọ o kwere m n'aka were sị m "Adesina, nke a bụ mbu m na-ahụ ka ịkwadoro etu a". Anyị abụọ chịri ọchị ọfụma nke mere ndị mmadụ ji na-ajụ ihe mere anyi ji achị ụdịrị ọchị a."
Adesina jụrụ ma: "Jubril onye Sudan ọ ga-ama na-aha m bu Adesina? Ọ ga-ama na adịghi eyikarị agbada?"
3: Buhari lotara onye ntaakụkọ
Adesina kọrọ akụkọ ọzọ banyere ihe mere Buhari jiri bụrụ Buahri.
Ọ sị: "Onye ntaakụkọ Lindsay Barret na Buhari bụ enyi kemgbe 1968. Otu oge, ọ gwara m ka m kele Buhari. Ka m gwara ya, Buhari sị: "Lindsay Barret. Echetere m oge mụ na ya zutere n'ihu agha na 1968. Ọ na-achụ ntaakụko n'agha. N'oge ahụ ọ fọrọ obele ihe ka egbu o ya. Ọ sị na ya bụ onye ụjọ na-agba mbọ Chineke nyere ohere ịdị ndụ."
Adesina jụrụ ma Jubril nke Sudan a ga-echete Barret bu onye ya na Buhari zutere n'ihu agha n'afọ 1968.
Kedụ ebe akụkọ Jubril onye Sudan siri pụta?
Ọ bụ Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) malitere ikwu na Buhari anwụọla e were nwoke Sudan aha ya bụ Jubril nọchie anya ya.
Buhari n'onwe ya asaala okwu mbụ ma kwuo na ya bụ Buhari asaala ebubo banyere onye bụ 'Jubrin'.
Ugbua Nnamdi na-ekwukwa na Jubril na onwe nke ya anwuọla, na ọ bụzị onye Nije nọchitere anya ya.
Okwu so n'ihe onye bụbu Osote ya na Ipob bụ Uche Okafor-Mefor gụnyere dịka ihe ya achọghị ka Nnamdi Kanu na-ekwu makana ọ sị na ọ na-ebutere ha akaja dịka ọtụtụ mmadụ ma na ọ bụ okwu asị.




























