You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Ụgwọ ezighi ezi anyị na-akwụ karịrị akarị' - Ndị gwongworo nọchiri ụzọ n'Ọnịcha
Ndị ọkwọụgbọala gwongworo na-eme nagaghịiwe n'Ọnịcha, Anambra steeti.
Ha sị na iwe ha bụ na ụtụisi ana ana ha karịrị akarị.
Osote onyeisi ndị na-anya gwongworo n'Ọnịcha bụ Boniface Ezekwesiri sị na ihe butere ngagharịiwe ha bụ maka "ego ekwesighi ekwesi na-akwụghị ọtụ nke ana ana ndị ọkwọụgbọala Tipa n'Anambra steeti".
Ezekwesiri bụ Osote onyeisi ndị "Great Tipper Drivers Association of Nigeria", mpaghara nke Ọnịsha sị n'ụbọchị Fraịde gara aga ka otu ndị bịara ịna ha ego ụtụisi ọzọ.
Ndị ahụ bịara sị na ya bụ ndị ọrụngo ọtawaike gọọmentị wetere ịnakọ ụtụisi esoghi na otu ha.
Ha gosikwara akwụkwọ ndị ahụ dọkanyere ha maka ego ha kwuru ụbọchị ahụ.
Iwe ha ọzọ bụ na ha amaghị ndị a bịara njem a.
"Ha abụghị ndị ọkwọụgbọala maọbụ ndị nwere tipa nke ha", dịka Ezekwesiri gbakwụnyere n'okwu ọ gwara BBC Igbo.
Ndị ahụ bịara sị na ọ bụ Kọmishọna njem ụgbọala Anambra steeti hiwere ha, nye ha ikike ibiputa mpempe akwụkwọ risiti ahụ ha ji.
Ezekwesiri na ndị ahụ gọọmentị hiwere bụ ndị agboro ka ha nyere ikike ịbịa nakọwa ha ụtụisi.
Ọ sịkwa na ọbụghị taa ka ha mewere ngagharịiwe maka oke ego ana ana ha, mana ha na Gọvanọ steeti ahụ ahụbeghị ihu na ihu ịji kapia ya bụ okwu.
Ndị otu ha sị na mgbe ụfọdụ, ego ha na-akwụ kwa ụbọchị na-erucha puku atọ.
Ego edere na ya bụ mpekere akwụkwọ ndị ahụ ji bụ N500.00.
Ndị ọkwọụgbọla ahụ buchirị ụgbọala ha ụzọ nke butere kpachịkpị n'ụzọ ahụ nke mere ndị ọkwọ ụgbọala ji eti mkpu.
Fidelis Okonji bụ onye ọkwọụgbọala sị na ụfọdị n'ime ha sị na ha anọrụola awa atọ n'ụzọ ahụ ma ghara ịzọpụkwụ kemgbe ụtụtụ.
Ihe gọọmentị Anambra steeti na-ekwu maka nke a
Gọọmentị Anambra steeti depụtara akwụkwọ ozi n'izuụka gara aga were sị na ha ga-anwuchi onye ọbụla ejidere na-anara ndị na-eme njem ego n'ụzọ na steeti ahụ.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke kọmịshọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Don Adinuba depụtara n'izuụka gara aga ka ha kwuru nke a.
Ha kọwara na ha enwetela akụkọ na e nwere ndị na-anakọ ndị na-eme njem na steeti ahụ ego.
Ebe ndị a gụnyere Onịcha, Obosi,Nnewi, Amasea, Ogidi an Nkpọ.
Gọọmwentị steeti a kwuru na omume ndị omekome a megidere iwu steeti ahụ ma kọwaa kwa na ego ndị a na-anata anaghị erute gọọmentị steeti ahụ aka.
Akwụkwọ ozi ha kwuru ka ndị madụ mee mkpesa mgbe ọbụla ha hụru onye dị etu a na-anakọ ego n'ụzọ.
Ha kwuru na ọ bụ iwu na ọdịmma ka e ji achị Anambra steeti ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha hụ na ehiwere ma mezuo iwu a.
E nwere ihe ndị uweojii na-eme?
Ndị uweojii Anambra steeti nwụchiri ndị agboro mmadụ iri abụọ na amanye ndị mmadụ ana ha ụtụisi n'Ọnịcha n'ụbọchị Frịde.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Harụna Mohammed kwuru na ndị ahụ sara asịsa na ọ bụ ndị mmadụ dunyere ha nakọtawa ụtụisi.
Onyeisi ndị ọrụ nchekwa ehiwere maka ịkpochapụ ndị ọjọọ n'ụzọ bụ ACP John Ogbuagbaka ṅụrụ iyi na ya ga-anwụchị ndị ọbụla na-enye ndị mmadụ nsogbu n'ụzọ anakọ ụtụisi.
N'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba ka gọọmentị Anambra steeti tinyere iwu maka ịkpochapụ ndị niile jị aghụghọ anakọ ndị mmadụ ụtụisi n'ụzọ.