You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu na ihe mere ndị omeiwu Imo Steetị ji chụọ onyeisi ha bụ Chiji Collins
Ndị omeiwu Imo achụpụla Chiji Collins dịka onyeisi ha n'ụbọchị Fraịde.
Arthur Egwim bụ omeiwu 'chief whip' na-anọchiteanya mpaghara Ideato North gwara BBC Igbo ihe mere ha ji napụ Collins oche n'otele.
Ọ sị na ihe mere ha ji chutuo ya bụ maka na ọ na-eji aka ike achị ndị omeiwu ibe ya na o rikwara ego.
Egwim gara n'ihu kwuo na Collins na-agba ọchịchị gọọmentị Imo Steetị mgba okpuru ma rie ego ọha.
O kwuru na onye wepụtara atụmatụ ka a chutuo Collins bụ Nnodumele na-anọchịteanya okpuruọchịchị Osu-Ama.
Egwim gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị omeiwu 23 n'ime 27, gụnyere APC na PDP tinyere aka chụpụ ya n'ọkwa.
Ọ sị na ọ bụ eziokwu na Collins anọghị n'ụlọomeiwu mgbe a chuturu ya mana ha mere nke a n'usoro iwu dịka osote nọ ebe ahụ.
Onye ha ji dochie anya ya bụ Paul Emeziem nke na-anọchiteanya okpuruọchịchị Onuimo ga-abụ.
Mana ọnụ na-ekwuru Chiji Collins bụ Mike Ohaka sị na ọ bụghị eziokwu na a chụọla Collins.
Ọ sị na ndị omeiwu anaghị enwe nzukọ taa na ọ bụ n'izuụka na-abịa abịa.
Ohaka gara n'ihu kwuo na okwu banyere nke a ka na-aga n'ihu n'ụlọomeiwu