Ihe mere anyị na Myetti Allah ji nwee nkwekọrịta - Kọmịshọna Mgbasa ozi Ebonyi

Mgbe e biputara ya

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi na otu jikọrọ ndị na-achị ehi na Naịjirịa a kpọrọ "Myetti Allah Cattle Breeders Association" enweela nkwekọrịta na ha ga-arụkọ ọrụ gbochie ogbugbu mmadụ nakwa mmebi ihe a kọrọ n'ugbo na steeti ahụ.

Nke a pụtara dịka Myetti Allah an David Umahi mere nzukọ nchekwa na ogige nzụkọ Akanu Ibiam dị n'Abakiliki.

Mgbe e mechara nzụkọ a ka Umahi sị na agaghịzị ekwe ka ndị na-achị ehi na-akpọ ehi ha aga ịta nri n'abalị.

O kwukwara na agaghịzị ekwe ka a na-edugharị ehi n'abalị.

O sịkwa ka ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo kwụsị ịba ime ọhịa sọsọ otu onye iji gbochie ogbugbu.

Mkpebi ndị Myetti Allah na gọọmentị Ebonyi na-abịa dika nsogbu dapụtara n'etiti ndi na-achị ehi na ụfọdụ obodo na steeti ahụ nke butere ogbugbu mmadụ nakwa mmebi nri akọrọ n'ugbo.

Umahi dọrọ aka ntị ka ndị obodo kwụsị igbu ehi ma sịkwa ndị ọchị ehi ghara imebi ihe ndị obodo kọrọ n'ubi.

Ihe ọzọ dị na nkwekọrịta Myett Allah na gọọmentị Ebonyi bụ ịmachị ndị etozughi ịchị ehi n'Ebonyi.

Umahi sị: "Ya bụrụ na ị bụ onye na-achị obodo ndị ị na-achi gbuo ehi anyị were nwere kpebie ihe i ga-akpụ, yyabụrụ na ikweghi ịkwụ; yabụrụ na ịbụ ọchị ehi ehi ya mebiri nri akọrọ ị were si na ị gaghị akwụ, ọgaghi eme n'Ebonyi."

Ọ sịkwa na Myetti Allah ga-etinyeriri anya n'etu ndi ọchị ehi si steeti ndị ọzọ abata Ebonyi.

Ọ jụrụ, "Ọ pụtara n'Enugwu na Abia enweghị ọhịa?".

Umahi sị na ha ga-alụsi ndị na-ebute nsogbu n'etiti ndị Ọchi ehi na ndị Ebonyi, dịka ndị ọchị ehi ebirila na steeti kamgbe.

Ọ sị na ndị bu egbe agagharị abụghị ndị Naịjirịa nke mere ekwesiri ị na-agba ama maka ha.

Gee ihe kọmịshọna mgbasa ozi bụ Uchenna Orji kwuru n'uju

Ihe gbara ọkpụrụkpụ pụtara na ya bụ nzukọ:

Kọmịshọna mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji akọwala ihe pụtara na nzụkọ gọọmentị Ebonyi steeti na ndị otu Myetti Allah.

Mpụtara nzụkọ ha gụnyere -

1) Ka akwụsị ị na-achị ehi n'oge abali

2) Ka ụmu aka na-erubeghị afọ iri na asatọ kwụsị ị na-achị ehi

3) Onye obodo Ebonyi agaghị egbu ehi ndị ọchi ehi, onye gburu ehi ha ga-akwụ ụgwo ya

4) Onye obodo Ebonyi steeti tiri one ọchị ehi ihe maọbụ gbuo ya, ndị obodo ahụ ga-akpọpụta onye mere ya bụ ihe ma ọ bụghị ya, ndị isi obodo ahụ ga-agbara isi onye ahụ.

5) Onye ọchi ehi gburu maọbụ wakpo nwaanyị onye obodo, ndị ọchị ehi ga-akpopụtarịrị onye ahụ ma ọ bụghị ya ndị isi ha ga-agbara isi onye ahụ