You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ọkụ si repịa ọdọ gassị ma gbuo mmadụ 5 na Legọs
Mgbe e biputara ya
Ọkụ gbara ebe a na-ere gassị na mpaghara Ipaja dị na Legọs gburu mmadụ asatọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ihe mere kọwara na ọ bụ n'ụlọ ọrụ Best Roof Cooking Gas ka mberede a mere.
A mabeghị ihe kpatara ọkụ a n'oge akụkọ a pụtara.
Ndị ọrụ gbata gbata na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ si ụlọọrụ dị iche iche gara ebe ahụ itinyụ ọkụ ahụ.
Ihe ometụtara
Dịka ọ kwụ ugbua a, ọkụ metụtara ọtụtụ ihe nke gunyere ụlo obibi na ụlọ ala.
Lee etu ọ kwụ dịka onyeisi Lasema zitere BBC:
- Ụlọ 25
- Ụlọ ahịa 16
- Otu ụlọ akwụkwọ prịmarị
Ọ sịkwa na ọkụ a mebiri ụgbọala na-ebu gassị otu, otu keke na otu ụgbọala pickup.