You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Iker Casillas bụbụ oche goolu Real madrid awụsala ọwa n'afọ 39
Iker Casilas awụsala ọwa n'egwu bọọlụ n'afọ iri atọ na itoolu.
O cherela Real Madrid goolu ugboro narị asaa na iri abụọ na ise (725) n'ime afọ iri na isii (16) ya na ha nọ na Santiago Bernabeu.
O ritere iko Champions League ruru atọ na nke La Liga ruru ise.
O nyere mba Spain aka rite iko mba ụwa nke 2010 nakwa "European Championships" ugboro abụọ n'afọ 2008 nakwa 2012.
Casillas sonyere egwu bọọlụ Porto n'afọ 2015 mana ọ gbabeghị bọọlụ kamgbe April nke afọ 2019 maka nkoropu obi mere ya mgbe ọ na-eme ọzụzụ.
Mgbe ọ na-agbake, e nyere ya ọkwa n'ogo ndị nchịkọta otu bọọlụ ahụ na Julai nke afọ 2019.
Ihe o mere na Porto
Casillas agbarala ndị Porto bọọlụ ugboro 156 , merie ọkwa Primeira Liga ugboro abụọ nakwa iko Portuguese.
O gbara ndị mba Spain bọọlụ ugboro 167 site na 2000 ruo afọ 2016. Sergio Ramos bu onye ọgba bọọlụ ibe ya na Spain ka ya gbara mba ahụ bọọlụ ugboro ugboro.
O depụtara nwụsa ọwa ya na twitter ma si ihe kacha mkpa n'ụwa bụ njem ị gara na ndị so gị wee mee ya na abụghị ebe njem ahụ dụgara gị.
Ihe ndị ma ya na-ekwu maka nwụsa ọwa a
Real Madrid bụ otu egwuregwu e ji mara Casillas kwuru na o sonyere ha mgbe ọ dị afọ itoolu ma bụrụkwa ọkaibe na oche goolu ha kamgbe afọ 118 otu egwuregwu ahụ malitere.
Onye otu ya na Real Madrid bụ Sergio Ramos wepụtara ya na Casillas sere n'elu twitter iji we kele ọyị ya.
N'ọnwa February, ka o gosiri mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisioche Spanish Football Federation (RFEF) mana o mechara sere isi ya maka nsogbu Covid-19 butere na mba ahụ.