Nigerian Foods: Lee uzọ iri ị ga-esi sie akpụ gị ka ọ bụrụ dachịị

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
  • Mgbe e biputara ya

Ọ karịala afọ narị ise gara aga akpụ batara Afịrịka, ma turuzie ugo n'ala Igbo.

Ọ bụ nri na-enye ọtụtụ ndị na-eri ya ume.

A sị na onweghị ụzọ isi jewe Ọnicha ọ dị mfe mana nke a abụghị maka akpụ, makana ma onye ukwu ma onye nta ga-egotenwu, ga-esinwu ya ma na-erinwu ya.

Enwereike ịbacha ya, sie ya, ghe ya eghe, gbakpọ ya maọbụ baa ya na mmiri.

Enwere akpụ na-atọ ụtọ nakwa nke na-enu inu.

Lee ụzọ iri i ga-esi mee akpụ gị ka ọ bụrụ dachịị.

1) sụ akpụ asụ

Nke a ka ndị Igbo na-akpọ "santana" ma ahazicha ya n'efere.

I jụọ m ihe eji akpọ ya, amaghị m nwanne mana otu ihe m mara bụ na akpụ asụrụ asụ na ofe onugbu, ọra, egusi na nsala dị dịka di na nwunye na-ekweghị agba alụkwaghịm.

Lee ka esi esi akpụ asụrụ asụ

2) Abacha agwọrọ agwọ

Onye ọbụla na-eribeghị Abacha agwọrọ agwọ amaghị ihe ọ na-ekwofe makana ya bụ nrị bụ elelebe eje ọrụ ma ịhazicha ya.

Eji okporoko, anụ Kanda, azụ, anyara nakwa ihe ndị ọzọ na-adọ n'akpịrị were ahazi ya.

E nwere obodo ebe Abacha bụ ọjị a ga-enye gị tupu ebutezie nri ị ga-eri.

3) Nke a atọ bụ Garri

Nwanne o nwere ndị Garri na-ejere ozi ka ọ bụ odibo ha.

Ụfọdụ na-asị na akpụ asụrụ asụ na-esi ha isi n'aka ya mere ha ji ekopu ma ị nye ha Garri na ofe.

Garrị bụ akpụ ebechara, kwụọ ya, wunye n'akpa ma kwe ka ọ gụchasia mmiri tupu eghe ya nke ọma ka ọkpọ ọfụma.

Ọtụtụ mmadụ na-aṅụ Garrị dịka mgbadoume eji eche nri ka oghe.

Ya bụ nri kacha dị fecha fecha ime mana ka m kuziere gị ka ị ga-esi mee Garrị ị na-anụ anụ ka ọ tọwaa nti.

Ka esi mee ya

  • Wepụta oke ị ga-aṅụchali, tupucha ihe ọ bụla bụ ahịahịa dị na ya.
  • Gbanye ya mmiri ọfụma ma zapụ ya ugboro abụọ
  • Tinye ya mmanụ aṅụ
  • Benye ya akụ oyibo, wunye ya 'mik', wunye ọpụpa
  • Wunyekwuo ya mmiri juru oyi.

Chaị akpịrị gị akwụrụla ọtọ ugbua!!

4) Achicha bekee

Echekwala na ọ bụ naanị ọka maọbụ Witi akwọrọ akwọ ka eji eme achịcha.

Ị ta nke eji akpụ akwọrọ akwọ wee mee ị ga-achịkọrọ ihe niile i nwere nye onye nwere ya.

A na-eji akpụ na-enu inu eme ya.

Ka esi mee ya

  • Sacha ma becha akpụ gị
  • Kwọrie ya
  • Zachapụ mmiri dị na ya etu kwere gị
  • Hapụ n'ogbe n'ogbe ka ọ kọchapụ
  • Sụọ ya ma yọọ ya ayọ
  • Tinye ya nnu
  • Danye efere achịcha n'oku
  • Wunye akpụ ihazirila n'ime efere achịcha ma hapụ ka o ghee n'ọkụ na anaghị enwu nnukwu
  • Oghee tụgharịa ya ka okpuru ya gheekwuo
  • Hapụ ya ka ọ fụọ.

5. Akpụ Mmiri

Ị na-arụ oke ọrụ tụmadị oke anwụ na-acha gị, akpụ mmiri juru oyi na akụ oyibo ga-abịanyụ okpofu maọbụ mgbakasị ahụ na-eme gị.

Ọ naghị ahịa ahụ omume.

Ka esi eme ya

  • Bọpụta ma becha akpụ gị, ịchọkwa isie ya n'azụ ya
  • Oghee ị chere ka ọ juo oyi
  • I berisie ya kịrịkịrị
  • Banye ya na mmiri ka o fo chi
  • Sacha ọzọ ma tinye ya na nju oyi maọbụ mmiri juru oyi
  • Were akị maọbụ ọpụpa were taa ya, ịgaghị echezọ ụtọ ya echezọ.

6) Stachi a na-elo elo

Nri a dịka nwaanyị e ji eje emume maka etu o si acha.

Ndị Delta steeti ejighị ya egwu egwu .

Ha na-eji ofe a na-akpọ banga were eri ya. Ụfọdụ ndị sikwa na mpaghara ala Igbo na-erite ya ọfụma.

Ka esi eme ya

  • Bụpụta akpụ, bacha ya ma sacha ya ọfụma
  • Berisie ya
  • Tinye ya n'igwe eji akwọ ihe
  • Were akpoa yọ ya ayọ
  • Hapụtụ ihe yọpụtara ka odo obere
  • Wepụta stachị pụtara na ya
  • Gbarie ya n'obere mmiri ọfụma ka mkpụrụ ọbụla ghara ị dị ya ma sinye ya n'ọkụ
  • Tanye obere mmanụ
  • Tụgharịa ya ruo mgbe o situru ike tupu isesi we ya ike
  • Isekọta ya, ihapụtụ ya ka ọfụtụ.

Stachi gị eyelaaa!!

7)Kpekere eji akpụ eme

Nwaanne echekwala na ọ bụ sọ ọgede maọbụ unele na ji ka eji eme kpekere.

Ejikwa akpụ eme ya. Ọ hịaghị ahụ.

Mana ọ bụ ndị Ashịa na-emekarị ya.

Ka esi eme ya

  • Bacha akpụ ka ọ na-acha ọcha
  • Sacha ya ọfụma
  • Berie ya kịrịkịrị etu esi ebe kpekere
  • Gbanye mmanụ n'ite dị ọkụ
  • fesa nnu na oso kpọrọ nkụ na kpekere ahụ
  • Bido ghewe ruo mgbe chara ka ọlaedo.

Ị ga-atalị nke a ebe ọbụla ịnọ

8) Akwụkwọ akpụ bụkwa egwu eji

Akwụkwọ nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ.

Ọ dị mma oriri maọbụrụ na ịgbakpọcha ya. Nke a ga-eme ka 'Hydrogen Cyanide' dị n'ime pụcha ka ọ ghara igbu mmadụ.

Ụfọdụ na-eji ya esi ofe tụmadị ndị mba Centralụ Afịrịka, Sierra Leone na Liberia.

9) Eji akpụ ese nrị

10) Ihe ndị ọzọ ị na-amaghị maka akpụ:

  • Eji Akwụkwọ akpu esi nri
  • Akwụkwọ akpụ nwere protin karịa mgbọrọgwụ ya
  • Tupu erie akwụkwọ ya a ga-esiriri ya n'ọkụ ma wufuo mmiri ya
  • Akpụ dị mma n'ahụ onye na-achọghị gluten
  • Akpụ na-achụpụ ibu makana ọ na-eme ka agụrụ ghara igụ mmadụ
  • A na-eji akpu akwọrọ akwọ eme ka anụ ahụ na-akwọ murumuru
  • A na-eji mgborogwu akpụ eme ka ụburu rụọ ọrụ ọfụma
  • A naghị eri akpụ maọbụrụ na-esighị ya n'ọkụ nke ọma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị