You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Herdsmen attack: Miyetti Allah na Ibagwa Nike, Enugu State ebinyela aka udo n'akwụkwọ
Otu Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) na obodo Ibagwa Nike dị n'Enugu ekwekọrịtala ibi n'udo.
Ha mere nke a site n'ibinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta maka udo n'ụbọchị atọ nke ọnwa Sepụtemba n'ọgbakọ ndị obodo.
Onye kpokọbara ọgbakọ a bụ Igwe obodo Ibagwa Nike, Emmanuel Ugwu kwuru na o hibere ọgbakọ a ka ha ndị Miyetti Allah kparịta ụka etu ha ga-esi bi n'udo ma gbochie esemokwu.
Igwe Ugwu kwuru na obodo na-achụsọ udo agbanyeghị etu ndị ọchị ehi si enye nsogbu.
O kwukwara na ọgbakọ a ga-enye aka ime ka ndị ọchị ehi mara etu ha ga-esi na-akpa agwa ugbua ewepụtara ndị nche ime ọhia n'ọwụwa anyanwụ.
Ndị isi ndị ọchị ehi bịara ya bụ ọgbakọ kwere nkwa na ha ga-agba mbọ hụ na ndị ọchị ehị ọ bụla mebiri ugbo mmadụ ga-akwụ ụgwọ itiaka n'obi.
Onyeisi MACBAN bụ Ibrahim Umar kwuru na ọ ga-agwa ndị ọchị ehi ka ha ghara ị na-emebisi ugbo ndị mmadụ.
O tebeghị aka akụkọ pụtachara na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu machiri ichi ehi na mpaghara ọwụwa anyanwụ.