You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Luis Enrique na-eru ụjụ maka ọnwụ ada ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Obi mgbawa na arịrị juru onye bụbu onye nchịtọka otu egwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Enrique obi ugbua.
Nke a bụ dịka ọ na-eru ụjụ maka ọnwụ nwa ya nwaanyị bụ Xana onye nwụrụ site n'ọrịa kansa ka ọ gbachara afọ itoolu.
Enrique bụ onye wepụtara ozi maka ọnwụ nwa ya na Twitter na mgbede Tọzde dịka ọ na-ekele ndị ụlọọgwụ nyere aka lekọta nwa n'ọnwa ise ikpeazụ ya.
O kwuru na nwata ahụ ga-abụ "kpakpando ga-ana atụziri ezinaụlọ anyị."
Enrique kelekwara ndị mmadụ maka nkwado ha.
Ka ọdị ugbua, otu dị icheiche etiela Enrique aka n'obi maka ọdachi a dakwasara ezinaụlọ ya.
Ha gụnyere UEfa, Manchester United, Laliga wdg.