Enugu Security: Enugwu enweela kọmishọna ndị uweojii ọhụrụ

Ebe foto si, NPF
Onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Adamu Mohammed enyela iwu ka Ahmad Abdulrahman were oche dịka Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu steeti.
Ọ tụgakwara Suleiman Balarabe bụ onye nọbu n'ọkwa ahụ na ngalaba na-eme nnyocha na FCID, Abuja.
Nke a na-eme dịka akụkọ nsogbu ogbugbu mmadụ, ntọ na mpụ ndị ọzọ na-arị ibe ya elu na Enugwu steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mba bụ onye gbara ama nke a n'ozi o binyere aka ụbọchị Tuzde, kwuru na Mohammed nyere Abdulraham iwu ka o tinye n'ọrụ amamihe o nweterela n'ọrụ uweojii nakwa nnyocha were hazigharịa usoro nchekwa nke steeti ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Tupu e nye ya ọkwa ọhụrụ a, Abdulraman bụbu kọmịshọna ndị uweojii na-ahụ maka ngalaba nnyocha na FCID, Abuja.
Ọ rụọla ọrụ dịka Kọmịshọna uweojii na steeti dịga ichiche dịka Kaduna, Bayelsa nakwa Ekiti.
Cheta na a tụtaburu Suleiman Balarabe dịka Kọmishọna ndị uweojii Enugwu steeti n'ọnwa Febụwari afọ 2019 dịka a na-akwado ntuliaka 2019.
Ndị uweojii nwuchiri Biodun Fatoyinbo nke COZA

Ebe foto si, @Biodun Fatoyinbo
Dịka ọ dị ugbua, Biodun Fatoyinbo nke COZA no n'aka ndi uweojii ebe ha na agba ya ajụjụ.
Ndị uweojii gara n'ụlọ ya were nwuchie ya.
Cheta na Busola Dakolo bụ nwunye otiegwu Timi Dakolo boro ya ebubo mwakpo.
Akụko ka na-abia . . .
Nwa Sirleaf ọ ga-aga mkpọrọ?

Ebe foto si, Getty Images
Charles Sirleaf bụ nwa Ellen Johnson-Sirleaf onye bụbu onyeisiala mba Liberia, ekwuola na aka ya dị ọcha n'ihe gbasara ebubo imefu ego ala ha ruru ijeri kwuru ijeri dọla, e boro ya.
A nwụchiri ya n'izu gara aga dịka e kwuru na ego ruru ijeri dọla otu narị na anọ furu n'akpaego ụlọakụ etiti Liberia nke ọ bụbu osote gọvanọ ya.
N'egwuregwu,
Flying Eagles nke Naịjirịa ji goolu ise a satara anọ na penariti 'gbaa ka anyị laa' merie mba Malị iji banye n'agba ngwụcha nke asọmpi 'African Games' a na-eme na mba Moroko.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Central Bank na ndị ji ha ụgwọ achụwala ndị ji ha ụgwọ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọbaego etiti bụ Central Bank nke Nigeria nakwa ụlo orụ ndi ọzọ na-ebinye ego enweela nkwekọrịta na isi n'ọba ego ndị ọzọ ndi mmadụ ji ha ụgwo nwere weghara ego niile e ji ha.
Ha kwuru nke a n'ọgbako ha nwere na Legos n'ụbochi Monde.
Dịka nkwekọrịta ahụ si dị, onye ọbụla chọrọ ibite ego ga-binye aka n'awụkwọ ma kwenye ka e si n'oba ego ọzọ o nwere weghara ego ahụ ma ọ bụrụ na ọkwughị ya n'ọge.
Ya bụ na onye ji ọbaego 'A' ụgwọ, e nwere ike isi n'ọbaego 'B' weghara ego ahụ ma ọ bụrụ na o nwere ego ebe ahụ.
A ga-eme nke a site n'akara "Bank Verification Number" bụ nke jikọrọ akara ọbaego niile mmadụ nwere.
Iwu gbasara inye Mita ọkụ latrịk

Ebe foto si, AFP
Ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik bụ 'National Electricity Regulatory Commission' (NERC) enyela ụloọrụ niile na-ekesa ọkụ latrik iwu itinye meter n'ụlọọrụ gọomenti niile dị na Naijiria.
NERC nyekwara ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik ikike ichabi ọkụ latrik nke ụlọọrụ Gọomenti ọbụla ji ha ụgwọ.
Ha nyere ruo ọgwụgwụ ọnwa Ọgọstụ 2019 itinye metre ndị a.
Kenya na-erezi mmanu agbidi

Mba Kenya esorola na mba na ere mmanụ agbidi na Afríka.
Ụlọọrụ Chemchina nke dị na UK bụ ndị mbụ zutara mmanu agbidi ruru barrel puku narị abụo na iri anọ (240,000 barrels).
Kenya na atụ anya irite uru nde dolla iri asatọ na anọ n'ime afo abụo site na ire mmanu agbidi.
A na-atụkwa anya na mba Kenya ga-erite ihe ruru nde dollar iri asatọ na anọ ($84m) n'afọ abụọ na-abia abịa.
Ụgbọ ahapụla Blessing Okagbare

Ebe foto si, Getty Images
Egwu eriala Blessing Okagbare na-agbara Naijirịa ọso dịka a chụpụrụ ya maka echeghị ka egbuo opi tupu ọ gbapụ ọso na asọmpi African Games.
Nke a ga-agbawa ndị otu "Athletics Federation of Nigeria" obi n'ihi na Okagbere so na ndị a na-ele anya itutere Naijiria ugo n'asọmpị ahụ.
Mana nwaada Naijiri ọzọ, Joy Udo-Gabriel, meriri n'ogoogo nke ya iji tozuo oke isonye n'agba nke ikpeazụ n'ọsọ "one hundre metres" nke ụmụnwanyị.
Naijirịa na agba onye nke isii na African games dika ha ji olaedo ise, ọla ọcha ise na ọla nchara asatọ.
Gee nkeji akụko BBC n'otu nkeji































