Supreme Court: Buhari ekpunyela Musa Abji okpu dika ọkaipke ụlọikpe ukwu
Akụkọ dị mkpa:
Ụlọikpe mkpeghari enwetala ọkaikpe ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyeela Musa Abaji ọka dịka ọkaikpe nke ụlọikpe nke mkpecha.
Akụkọ ntụrụ ugo Abaji a pụtara n'akara Twitter ndị ụlọomeiwu nke ukwu.
Kọmịtị ọrụ agaala hụ nke bụ eziokwu n'ọrụ ụzọ gọọmenti

Komitee na-ahụ maka ọrụ n'ụlọomeiwu nke obele nke Toby Okechukwu nọ n'isi oche ya nọ njem nyocha ọrụ gọọmentị etiti na arụgasị n'ala Igbo.
Onye ntaakụkọ BBC so na njem a na-akọwa na kọmiti a ga-esi Enugwu, gawa onisha, ma nyocha ụzọ okporo a na-arụ na mpaghara ahụ. Ha ga-agatukwa ukwa n'ebe akwa ọhụrụ Naija dị.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ngalaba uweojii ụwa niile nke akpọro Interpol ahọpụtara Kim Jong-yand dịka onyeisi ha.
Maazi Kim, bụ onye South Korea, pụtara ka mba otu narị na iri itoolu na anọ so n'Interpol mechara ntuliaka eji ahọpụta onye ga-abụ isi oche ha.
Kim meriri Alexander Prokopchuk bu onye Russia.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, NFF/twitter
Asisat Oshoala ekwuola na asọmpị otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Falcons na ndị nke Zambia ga-agba taa bụ nke ha ga emeriri ma ya bụrụ na ha chọro ịga ihu na iko mba Afịrịka nke ụmụnwaanyị.
Ụmụnwaanyị South Afrịrịka meriri ndị Super Falcons n'asọmpị nke mbụ ha gbara n'iko mba Afịrịka nke afọ a.
Gee nkeji n'uju ebe a:
Akụkọ ụgha gbasara Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisiala n'ihe gbasara ikpe bụ Okoi Obono-Obla, edegarala otu nchekwa DSS nakwa ndị uweojii Naịjirịa akwụkwọ ozi ka ha nyochaa onye na-ebu akụkọ ụgha maka Onyeisiala Muhammadu Buhari.
N'ime akwụkwọ ozi ahụ, ọ na-ekwu ka ha nyochaa otu nwoke a kpọrọ ụkọchukwu Eze Orieke, maka akwụkwọ o kwuru si n'ụlọọgwụ London Bridge (Regional Medical Laboratory) o tinyere n'elu Facebook.
Obono-Obla kwuru na akwụkwọ ndị Orieke wepụtara, gụnyere asambodo ọnwụ nke Bekee kpọrọ "death certificate", dị n'aha Buhari, nke o kwuru sị na ndị ngalaba "National Population Commission" dere n'ọnwa Septemba 2017.
APC Imo steeti
Uche Nwosu bụ onye na-atụ anya ịzọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'okpuru APC, ekwuola na ndị Imo kwesịrị ị na-ajụ ihe ọ ga-emere ha ma ọ bụrụ Gọvanọ, hapụ ị na-ekwu maka etu o si bụrụ ọgọ Rochas Okorocha.
Aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan agbaala ama na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji okwu ụmụakwụkwọ Chibok megide ya na ntuliaka 2015.
Ọ tụkwara arịrị na nsogbu ịzụ vootu akarịala, ma kpọọ oku ka e wugharịa ebe a na-anọ eme ntuliaka nke Bekee kpọrọ "polling booth".
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:
Na mba ofesi,
Ihe nwụrụ n'obodo Kabul eruola iri ise 50 ebe ihe ruru iri asatọ 80 merụrụ ahụ ka otu onye omekataraihepụọụjọ tụrụ ogbunigwe ebe ndị nkuzi ndị alakụba gbakọtara ime ncheta ọmụmụ Prọfet Mohammed.

Ebe foto si, EPA
N'egwuregwu,
Onye egwu Brazil bụ Neymar gbara bọọlụ naanị nkeji isii makana ọ merụrụ ahụ n'asọmpi enyi na enyi ha na Kamerun gbara ebe ndị otu ha meriri Kamerun.
Cheta na Super Eagles nke Naịjirịa na Yuganda enyeghi goolu ka ha gbara onwe ha onye aba onye laba na nke ha gbara n'Asaba.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gere akụkọ BBC na nkeji ebe:
Lere ihe nkiri:
Onye kachasị bụrụ nwata n'ime ndị na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Chike Ukaegbu agwala BBC Igbo ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche.































