Ọ bụ gị mbụ ịga Alabekee, lee ihe isii i kwesịrị ịma

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

I nwetala akwụkwọ njem ị ga mba Briten, Amerịka maọbụ mba ọzọ dị n'Yurop mana ị gabeghị ebe ahụ mbụ.

Lee ihe isii i kwesịrị ịma maka ala Bekee:

1. Mee nkwado maka ebe obibi gị tupu ịgawa

Ewezuga ụgwọ ụgbọelu ị ga-aba, tupu ịzọpụ ụkwụ ije, gbaa mbọ kwuo okwu ebe ị ga-ehi ma i rue Alabekee.

Ọ bụ n'ụlọ nwanne gị, enyị gị ka ọbụ ụlọ oriri na nkwari.

Ọ bụrụ na ibu onye ọbụla n'obi, gbaa mbọ hụ n'onye ahụ dị njikere ịnabata gị, ka ụkwụ ghara ịtọ gị n'ama ma i wuchie n'ọdụụgbọelụ.

Ka ọ ghara ime gị na mberede ma ị kpọwa ekwentị onye nke gị ma zara ghị gị.

E nwere ọtụtụ ụlọ obibi ndị ọnụ ha dị iche iche dịka akpa gị ha.

Ọ bụrụ na ị ga-anọtụ nwa oge, ọ ga-akara gị mma ịnọ n'ụlọ ndị a kpọrọ 'Airbnb' karịa ụlọ oriri.

Nke a ga-enyekwa gị ohere isiri onwe gị ụdị nri ị chọrọ.

Ga n'ịntanet chọta ụdị ị chọrọ dịka akpa gị ha nakwa nke ndị nso na mpaghara ebe ị chọrọ ị ga.

2. Jikere maka igbochi oke oyii

Ugbua, mba Briten, Amerịka na ala bekee ndị ọzọ nọ n'oke oyii.

Ọmụma atụ, London nọ na digri itoolu, ebe Nu Yọk nọ na deigri anọ.

Tupu ị hapụ Naijiria, ọ dị mkpa na ị ga-azụ akwa mgbochi oyii n'ihi na oyii alabekee abụghị ụkwa achị n'aka.

Anne Ifedigbo, onye bi mba Amerịka kọwara sị, " Ọ dị mkpa ka i jikere maka oke oyii jiri ịchafụ olu, okpu, akpụkpọụkwụ maka ojii, uwe oyii, trawụza, and ejije maka oyii ndị ọzọ."

3. Jikere maka ọrịa ntụmadị

Ọrịa anaghị ama ọkwa tupu ọ bịa, ọkachasị ma imee njem.

Gba mbọ zụọ ụmụ obere ọgwụ maka isi ọwụwa,ụkwara, afọ ọsịsa, ịba na ude na-ekpo ahụ ọkụ iji kee nkwụcha maka ha iwuchi na amaghị ọkwa ọbụla.

Inweta ụmụobere ọgwụ n'ala bekee nwere ike ọ gaghị adchara gị mfe ma ọ dị gị mkpa.

4. Zụọ akwụkwọ e ji eme njem ime obodo

Ọ bụrụ na i rute Alabekee, zụrụ akwụkwọ ịga njem nke a kpọrọ 'Oyster card' ma tinye ego n'ime ya.

Nke ga-eme ka ị gagharị dịrị gị mfe.

Ị ga-eji Oyster kaadị kwụọ ụgwọ ụgbọala maọbụ ụgbọoloko.

Mata na-ego ọnụ ụgbọoloko na-ada ọnụ karịa ụgbọala.

Ọzọ bụ na ụgbọala ga-enye fgị ohere na ị na-elegharị anya oge ị nọ na njem.

4. Cheta gaa ebe ihe nleta

Ọ bụrụ na ị gacha ihe buru gị bịa njem gị, cheta ilegharị anya.

E nwere ọtụ ihe na ebe nleta dị iche iche onye bịara njem ga-enwe mmasị ị ga lee ma ị ga- Alabekee.

Ọ bụrụ na Lọndọn, Osimiri Thames, Nu Yọk; Liberty Statue,

Ebe dịka ụlọ ụka St Paul's Cathedral ebe Adaeze Diana na Charles

5. Ị chọrọ izu ihe, gaa ebe ndị a

Ị gaa Alabekee, ọ ga-amasị gị ịzụrụ onwe gị nakwa ndị ezinaụlọ ihe ole na ole.

Ihe dịka akwa, akpụkpọụkwụ, ọlaaka, ọlaolu nakwa ihe ndị ọzọ nwere ebe ọ na-aka mma ịzụ ha.

Na Briten, Sentralụ Lọndọn bụ ebe aha a mara ama n'ihe gbasara ejiji dịka Tom Hilger,Tezeni, nwere ọdụahịa.

Woolrich dị na Lọndọn sokwa na ebe ị ga-enweta ihe dị ọnụ dị mma dịka akpa gị ha.

Ebe Depford bụ ebe ị ga-enweta ihe ndị sị aka fere aka ọnụala.

6. Ihe i kwesiri iji, nke e kwesighị

Isi a hụrụ kwaba okpu n' ịga ala bekeee bụ iji ezigbo akwụkwọ abụghị nke adigboroja.

Ihe ndị i kwesịghị iji gụnyere ọgwụ ike, egbe maọbụ ngwaọgụ, ụfọdụ ihe nri nakwa ihe dị mmiri mmiri.

N'ụfọdụ obodo, a gaghị ekwe ji ji ihe nri nwere mmiri dịka mmanu maọbụ ude isi ọma(perfume) banye ụgbọelu.

Kpachara anya dịka ndị enyi maọbụ ikwu na ibe gị na-enye gị ihe nye mmadụ n'alabekee ka ị ghara ịdaba na nsogbu ndị ji mmadụ ibe ha ebu ntụ.

Akụkọ ga-amasị gị: