You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gọvanọ Ugwuanyi: Ego ọnwa ndị nọ ezumike nka agbagoola n'Enugwu steeti
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:
Buhari ekwela Theresa May nkwa
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ ga-akwado ntuliaka ziri ezi n'afọ 2019, O kwere nkwa a ka ya na Theresa May bụ praịm minista ndị Briten zụkọrọ n'Abuja ụnyaahụ.
Cheta na May bịara Naịjirịa ka ya na Buhari kpaa maka azụmahịa, nchekwa nakwa ịgba mgbere mmadụ.
Ugwuanyi
Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ekwuola sị na ụgwọ a na-akwụ ndị lara ezumike nka arigoola ihe karịrị nde narị naịra ise site na nde narị naịra abụọ ọ bụbu.
O kwuru sị n'agbanyeghị na ego ahụ dịka ibu anyị danda nye gọọmentị, na obi dị ha mma na ịkwụ ya na-eme ka ndụ dịrị ndị agadị mfe.
Na mba ofesi,
Mba Jamini ebughachitela okpokoro isi ndị mba Namibia nwụrụ na mgbukpọ nke agbụrụ ihe karịrị afọ narị gara aga.
E zigara ọkpụkpụ ndị ahụ Jamini maka nchọpụta ahụ akatọrọla nke bụ iji gosi na ndị ọcha ka ndị isi ojii mma.
N'egwuregwu,
A pịapụla Andy Murray n'agba nke abụọ nke asọmpi tenis bụ US Open.
Fernando Verdasco meriri ya n'ihe bụ asọmpi Grand slam nke ise ọ na-esonye kemgbe a wachara ya ahụ maka ahụ o merụrụ n'ukwu na Jenụwarị.
Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Ụfọdụ ndị Igbo ekwuputela ihe ha ga-achọ ka Praịm Mịnịsta Briten mere ha ka ya na onyeisiala Muhammadu Buhari zukọrọ.