Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Onyeisiala Buhari nwere ike ịlọta njem ya taa

Mgbe e biputara ya

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Buhari a ga-alọta taa?

Dịka Shehu Garba bụ ọnụ na-ekwuchitere ya si kwuo, Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-alọta Naịjirịa taa ka ọ nọchara ezumike ụbọọchị iri na ise na London.

Cheta na e kwuburu na ọ ga-anọ ezumike ahụ ụbọchị iri.

Kofi Annan anwụọla

Kofi Annan, onye bụbu onye odeakwụkwọ ukwu UN nwetara nturugo 'Nobel Peace Prize' anwụọla ka ọ gbachara afọ 80.

N'aka ọzọ,

Samuel Ogundipe bụ onye ntaakụkọ 'Premium Times' ndị uweojii jidere ma tọhapụ ka ụbọchị atọ gachara, ekeleela ndị Naịjirịa maka nkwado ha nyere ya oge a nwụchiri ya.

O kwuru na ọ bụ ọkụ ndị Naijiria kwanyere mere ya jiri nwere onwe ya.

Ohaneze adọọla Igbo aka na ntị:

Ohaneze Ndigbo adọọla ndị Igbo aka na ntị ka ha kwụsị ịkpọrị ndị Yoruba ọkachasị na soshal midia.

Odeakwụkwọ ha bụ Everest Ozonweke, kwukwara sị gbaa mbọ nyochapụta ma ihe ị chọrọ ide ọ bụ eziokwu tupu ị dee ya.

Mba Ofesi:

A na-edu Imran Khan iyi ọrụ dịka Praịm minista mba Pakistan n'ụtụtụ a.

Cheta na a họpụtara Khan dị afọ iri isii na ise na ntuliaka e mere n'ụlọomeiwu ala ha ụnyaahụ.

N'egwuregwu,

Chelsea na Arsenal ga-ama mbe nabọ nke bụ oke ma ha zute mgbe o ji ọkara gafee elekere ise nke mgbede taa.

Ebe otu Kelechi Iheanacho na-agbara bọọlụ bụ Leicester City na Wolverhampton ga-akụkọta mpi n'ehihie a.

Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji:

Ihe nkiri nke taa:

Ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị ọnụ na-eru n'okwu n'egwuregwu akọwala ụfọdụ nsogbu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị na-enwe na Naịjirịa.