You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị mkpa na mgbede a: Anyị ga-ewugharị SARS - Osinbajo
Osote onyeisiala mba Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo edepụtala akwụkwọ ozi kwuru na gọọmentị etiti ga-eme ihe niile dị n'ike ị kwụsị mkpa mkpa SARS na-akpa na Naịjirịa.
O kwuru ka ndị mmadụ nwee ndidi na n'oge adịghị anya, a ga-enwe ewughari SARS ọhụrụ dịka o kwesiri ị dị na mbụ.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari ezigarala ndị ide mmiri mebiri ihe na Kebbi steeti ozi itiakanobi.
O kwuru na ide mmiri a wutere ya ukwa n'ihi na o mebiri ubi rice ndi steeti ahụ kọchara.
Nke a na-abịa dịka ọ na-akwado ị ga njem mba Togo echi maka nzụkọ otu ECOWAS ga-eme n'isiobodo mba Togo bụ Lome.
N'akụkọ ofesi,
Pope Francis anabatala arụkwaghịm nke Theodore MaCarrick bụbu archibishop Washington degara ya n'abali Fraide.
Pope Francis agwala ya si ya "bie ndụ mwute na ekpere" ganye mgbe a ga-emecha nyocha ebubo eboro ya maka mmetọ ụmụaka.
N'egwuregwu,
Onye ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Kelechi Iheanacho esonyela ọzọ n'otu egwuregwu Leicester city nke mba Briten
O kwuru na obi dị ya ụtọ nakwa na ọ ga gba mbọ hụ Naịjirịa tozuru ikomba ụwa nke afọ 2022 n'abịa.
Gee nkeji nke mgbede a