Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: A ga-amatazị Israel ka mba ndị ofufe Jew
Isiokwu ndị dị mkpa n'ụtụtụ a
Gbasara IPOB na ntuliaka 2019
Ndị otu IPOB agwala ndị mpaghaghara ọwụwa-anyanwụ na ndị etiti Naịjirịa ka ha ghara isonye na ntuliaka 2019.
Ọnụ na-ekwuchitere IPOB bụ Emma Powerful kwuru na ọ baghị uru makana ịchịkọta otu ndọrọndọrọ ọchịchị niile ọnụ agaghị akwụsị mmeri Onyeisiala Muhammadu Buhari na ntuliaka a.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ntuliaka 2019: IPOB sị ka ndị ọwụwa-anyanwụ ghara ime ntuliaka
Na mba ofesi,
Ụlọomeiwu nke mba Israel etinyela iwu ọhụrụ na-akọwa na a ga-amata mba ha ka nke ndị ofufe Jew ma na-akọwa na Jerusalem bụ isi obodo ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọomeiwu Israel bụ ndị Arab ekwenyeghị n'atụmatụ a, mana onyeisiala ha bụ Benjamin Netanyahu kwadoro ya.
Ụgwọ ọpekata mpe

Onyeisi otu Trade Union Congress bụ Bobboi Kaigama kwuru na gọọmentị etiti na ngalaba na-ahụ maka ndịọrụ ekwekọrịtala ego ole ga-abụ ego ụgwọ ọnwa ọpekatampe.
O kwuru na ha ga-ekwuputa ego ole ọ bụ n'ọnwa August na-abịa.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ndị ọrụ oyibo ga-amata ụgwọọnwa ọhụrụ n'Ọgọst - TUC
N'egwuregwu
Otu Arsenal ebinyela ndị otu Porto nwaafọ Naịjirịa bụ Kelechi Nwakali.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Cheta na Nwakali sonyere otu Arsenal n'afọ 2016, mana ọ gbabeere ha bọọlụ maka na ọ gara mbinye n'otu MVV Maastricht nakwa otu VVV Venlo dị na Netherland.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri nke taa






























