Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mba Afrịka abụọ apụọla n'asọmpị iko mbaụwa

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị dị mkpa

Ndị uweojii achọtala ogbunigwe n'isi ụlọọrụ otu PDP na abakaliki nke butere nzụkọ gbata gbata n'etiti gọvanọ Umahi na ndị isi ọrụ nchekwa

Umahi kwukwara na ọ ziela ndị nchekwa ha mee nyocha zuruoke gwa ndị isi ha ebe ọ ga ezigara onyeisiala okwu maka ihe a mere.

Mahadum Obafemi Awolowo achụọla onye nkuzi chọrọ ị dina nwata akwụkwọ ya tupu ọ gafee ule ya.

Nke a bịara mgbe nyocha Mahadum ahụ mere gosiri na nwata akwụkwọ ahụ gafere ule ya. Ha kwuru na ha na-eme ihe ịhụ na akwụsịrị ndị nkuzi ị dịna ụmụakwụkwọ kpam kapm.

Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ebinyela aka n'iwu pụrụiche kwuru na agaghị ekewa ezinaụlọ ndị mbịara mbịara na-achọ ị bata Amerịka

O kwuru na ihe kachasị mkpa bụ nnọkọ ezịnaụlọ na nchekwa oke Amerịka na mba ndị ọzọ

N'egwuregwu,

Spen ji otu ọkpụ merie Iran ụnyaahụ ebe e wepuru goolu Iran nyere na agba nke abụọ.

Ajentina na-akwado ị zute Kroeshia taa ebe Fransi na Peru ga-asọmpị ebe elekere anọ nke ehihie.

Ihe ndi ọzọ ị kwesiri ị ma

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuputala na anya edoghi ya n'akwụkwọ bọọjetị 2018 nke o binyere aka na ya ụnyahụ.

O kwuru na o nwere ụfọdụ ego ndị ụlọomeiwu ukwu gbanwere tupu ha nye ya ya bụ bọọjetị.

Ọ kọwara ya n'ozi ọ gbasara site n'akara soshal midia twita ya

Gee nkeji nke ụtụtụ ebe a

Lee ihe Yul Edochie kwuru gbasara ndị ntorobia na-akwado ị zọ ọchịchị