Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Anthony Joshua eritela ntulugo ọhụrụ

Mgbe e biputara ya

Okwu APC na Okorocha ka na-aga...

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC adọọla aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha aka na ntị maka ịbo onyeisioche ha ebubo dị ịcheiche

Cheta na Okorocha boro onyeisioche APC bụ John Odigie-Oyegun ebubo na o kwanyeghị iwu ụlọikpe nyere gbasara ntụliaka imeụlọ APC na steeti ya ugwu.

Ọzọ

Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara akụnụba ọha esila n'ọnụ onyeisi ha bụ Alex Okoh kwuputa na gọọmentị na-akwado ịre ọtụtụ akụnụba Naịjirịa.

Okoh kwuru na nke a bụ ịji leta ego a ga-eji mezuo bọjeti nke afọ a.

Na mba ofesi,

Ndị e chere na ha bụ ndị oyiegwu Al-shabbab egbuola onye agha mba Amerịka na ndịda mba Somalia taa.

Ndịagha Amerịka ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe a wakpọrọ ha n'obodo Kismayo.

N'egwuregwu,

Nwa-afọ Naịjirịa ama ama n'egwuregwu ịpịa ọkpọ bụ Anthony Joshua eritela ntuliugo a kpọrọ 'Order of the British Empire'.

Ntuliugo a bịara ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ezenwaanyị mba Britain ma cheta kwa n'oritela ntuliugo yiri nke a bụ MBE maka ike ọ kpara n'asọmpị Olympics n'afọ 2013.

Gee akụkọ mere n'ime otu nkeji n'ụtụtụ a:

Ihe ọzọ ị kwesiri ị ma:

Kanayo O. Kanayo na-akwado ị zọ ọchịchị ọkwa ụlọomeiwu.