You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị mkpa: 'Anyị ga efe ọkọlọtọ Biafra' - BIM
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ncheta ụbọchị Biafra,
Otu na-azọ nwereonwe Biafra bụ BIM ekwuola na ndị agha Naịjiria agaghị egbochi ha ị bunyi ma fee kwa okoloto Biafra maka ncheta ụbọchị ya n'onwa mee.
Otu ahụ na-akwado kwa ị fee okoloto a n'obodo dị icheiche n'ala Igbo.
Ebe ọzọ na Naịjirịa,
Gọọmentị etiti enyela iwu ka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara nrị na ọgwụ bụ NAFDAC laghachị n'ọdọ ụgbọmmiri dị icheiche.
Nke a bụ ka ha nweike mee ngwa ahịa na-abata nyocha zuruoke maka ndị na-esi ụzọ azụ ebubata ọgwụ Codeine.
N'akụkọ ofesi,
Orue la na nchịkọta nkwado niile gbasara alụm di na nwunye n'etiti Meghan Markle na Okparaeze Harry ga-eme n'ụlọụka St George's dị n'ime obieze Windsor ụtụtụ echi.
Ezenwaanyị Elizabeth bụ onye nyere ha ikike ị gba akwụkwọ n'ụlọụka ahụ. Ọ bụ kwa ezinaụlọ Harry ga-akwụ ụgwọ agbamakwụkwọ ahụ.
N'Egwuregwu,
Akpọpụtala aha onye ọgbaa bọọlụ ama ama bụ Cristiano Ronaldo dịka onye ga-eso otu bọọlụ mba Portugal aga asọmpị iko mba ụwa.
N'otu aka ahụ otu egwuregwu bọọlụ naịjiriịa nke nta bụ Flying eagles ga-ezute ibe ha nke maba Guniea Bissau echị maka ị tozu asọmpị iko mba Afirịka.
Gee nkeji ụtụtụ a: