Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Palestine na-akwado ime ngagharị iwe
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Na Naịjirịa

Ebe foto si, Anglicancommunionawka.com
Bishọp Alex Ibezim ụka Aglican nke Awka Diocese ekwuola na ike agwula ndị Naịjiria ị nara ozi ị ti aka n'obi.
Ọ gwara onyeisiala Buhari ka ọ ghara ị hụ ndị na-achị ehi na-egbu mmadụ dịka ndị ụmụnna ya.
N'okwu yiri ibe ya...

Ebe foto si, AFP
Onye ndu otu Biafra Independence Movement bụ Ralph Uwazuruike ekwuola na ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa bụ nkata ọchịchị Buhari iji gbanwee Naịjiria ka ọ bụrụ mba ndị Alakoba.
O kwuru na otu ihe a mere na Kwara Steeti n'afọ 1811 mgbe egburu onye ndu ndị Yoruba ma were ọchịchị rue ugbu a.
Akụkọ ofesi

Ebe foto si, AFP
Ndị mba Palestine na-akwado ime ngagharị iwe megide mba Isreal maka ogbubu ndị mmadụ dị iri ise na ise ndị agha mba Isreal gburu echi gara aga
Egwu ga-adị na Gaza bụ ebe agaelị ndị nwụrụ anwụ.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, AFP
Mba Austrelia agwala ndị zoro n'obodo ha n'oge egwuregwu Commonwealth ka gosi onwe ha ugbua ma ọ bụ a nwụchie ma tụlata ha n'ike.
Ebe...
NFF bụ Amaju Pinnick ekwuola na otu Super Eagles na ndị DR Congo ga-aga n'ihu ezute n'asọmpi enyi na enyi agbanyeghi akụkọ ọrịa ebola.
Ịhe ọzọ ị kwesiri ị ma
Awaala Melania Trump, nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ahụ maka akpụ dị n'akụrụ ya.

Ebe foto si, AFP
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a:
Ihe onyonyo nke taa:
































