Akụkọ kachasị n'ụtụtụ: 'Ndigbo saanụ anya mmịrị na 2019'
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ndị "NGO" akpọọla ndị Igbo ka jikere maka 2019
Ndị otu nọọrọ onwe ha a kpọrọ NGO na bekee arịọla Ndịgbo ka ha doo anya n'ala chọwa ihe dabara mmiri na ntuliaka nke 2019.
Jude Ohanele bụ otu n'ime ha kwuru nke a na ọgbakọ Situation Room nwere n'ụbọchị Tuusde rịọrọ ka onye Igbo ọbụla ruru ogo kawa ahụ gbata akwụkwọ ntuliaka.
Sinetị Naịjirịa sị sị chụọ ndị

Ebe foto si, Nigerian Senate/twitter
Ụlọomeiwụ ukwu bụ Sịnet akpọọla Onyeisiala Buhari oku ka ọ chụọ ndị isi ọrụ nchekwa Naijiria niile n'ọrụ.
Ha kpọrọ oku a maka oke ogbugbu mmadụ ka na-aga n'ihu n' obodo dị icheiche na Naịjirịa..
Barbara Bush alakwurula ndị nna ya ochie

Ebe foto si, Getty Images
Barbara Bush, nwunye onye bụbu onyeisiala Amerịka nakwa onye na-alụ ọgụ ikwado agụmagụ anwụọla n'afọ iri itoolu na abụọ (92).
Bush bụ nwaanyị si n'ezinaụlọ ndọrọndọrọ ọchịchị na-adị mma nke wepụtara onyeisiala Amerịka abụọ - di ya bụ George H. Bush na nwa ya nwoke bụkwa George .W. Bush.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa:
N'egwuruegwu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Bournmouth na Manchester United ga-akwarịta mpi taa n'elekere isii nke mgbede.
Man U emeribuola Bournemouth ugboro abuo n'ime isii ha sọburu mpi. Ebe ka ha nọ n'okpokoro ligi?
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa:
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
































