You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị taa: Zuckerberg arịọla mgbaghara
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ncheta Ikpeazụ Achuzia
E mere abalị ncheta ikpeazụ nke dike Biafra bụ kọnel Joseph 'Hannibal' Achuzia n'Enugwu ụnyaahụ.
A na-akwadokwa ime ọzọ n'Owere nakwa Asaba, taa na echi, tupu elie ya n'ụbọchị Satọde.
Cheta na Achuzia nwụrụ ụbọchị 26 nke ọnwa Febụwarị 2018, ka ọ dị afọ 90.
Mpụ dị na Legọs
Kọmishọna ndị uweojii Lagos steeti bụ Edgal Imohimi, kwuru na site n'afọ 2014 ruo ugbua, Legọs enwetala ọtụtụ okwu gbasara ndị omekome.
O kwuru na e nwere mwakpo ndị ojiegbeezu otu puku, narị atọ na iri na ise, (1315) nke ndị otu nzuzo narị atọ na iri ise na itoolu (359), nakwa ntọ narị atọ na iri itoolu na abụọ (392) na Legọs n'ime afọ anọ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
Nyocha Facebook
Onye nwe Facebook bụ Mark Zuckerberg, arịọla mgbaghara maka ịhapụ ka ndị ụlọọrụ Cambridge Analytica na ụfọdị ndị ọrụ na mba Rọshịa were Facebook mee ihe masịrị ha.
O kwuru nkea ka ndị sineeti Amerịka gbara ya ajụjụ ọnụ maka ihe gbasara ihe ndekọ (data) ndị mmadụ.
N'egwuregwu
Ndị otu AS Roma nyụrụ Barcelona anya ka ha ji mkpokọta ọkpụ anọ asatara otu (4-1) gbapụ ha na Champions League.
Ebe Liverpool ji mkpokọta ọkpụ ise asatara otu (5-1) gbapụ Manchester City n'otu asọmpi ahụ.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Ụmụ Naịjirịa ekwupụala uche ha gbasara nkwupụta onyeisiala Buhari na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2019.