Wilfred Machage: Etu onye nnọchite anya mba Kenya si gharịpụ ma nwụọ

Ebe foto si, Twitter/State House Kenya
Wilfred Machage, onye na-anọchite anya mba kenya na Naịjirịa alaala mmụọ dịka ọ gbara afọ iri isii na ise (65).
Ngalaba na-ahụ maka Naịjirịa na mba ndị ọzọ kwupụtara ọnwụ Wilfred Machage n'ụbọchị Satọde, Febrụwarị 19, 2022.
N'akwụkwọ ozi nke ngalaba ahụ wepụtara, ha kwuru sị: "Ambasadọ Machage gharịpụrụ n'ụlọ ya dị n'Abụja."
"Oge e butere ya n'ụlọọgwụ n'elekere iri na abụọ n'ọkara ka ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọla."
"Nwunye ya nọnyeere ya oge ihe a mere."
Gọọmentị Mba Kenya kọwara Machage dịka onye dị uchu n'ọrụ ya nakwa onyendu zuru oke.
Macharia Kamau, bụ ode akwụkwọ Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta mba Kenya na mba ndị ọzọ, kasiri ezinụlọ Machage obi maka ọnwụ ya.
Ambasadọ Machage malitere ọrụ ya na Naịjirịa n'ọnwa Jenụwarị afọ 2018.
Ọ rụburu ọrụ dịka onye omeiwu na-anọchi anya mpaghara 'Kuria Constituency' na mba Kenya n'afọ 2002.
Na 2013, Machage meriri ntuliaka dịka Sịnetọ na-anọchi anya mpaghara Migori, bụ ọkwa o ji ruo afọ 2017.
Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị, Machage rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ dịka Dọkịta.
N'ọdị nso a, oge akụkọ pụtara maka nnwuchi Nnamdi Kanu, bụ onyeisi ndị otu na-achọ nnwereonwe ndị Igbo na Naịjiịrịa a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) na mba Kenya, ọ bụ Machage pụtara kwuo hoohaa na aka mba Kenya adịghị na nnwụchi Kanu.
N'oge ahụ, o kwuru sị: "Onye nwere ihe akaebe iji gosi na aka gọọmentị Kenya dị na nnwụchi Kanu, ya wepụta ya ka ọha hụ."






























