Nnamdi Kanu: Ọ gbaala gọomentị mba Kenya akwụkwọ n'ụlọikpe dị na be ha

Ebe foto si, AFP
Akụkọ na-erụ anyị ntị ugbua bụ na Nnamdi Kanu agbaala mba Kenya akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị na Nairobi, isiobodo Kenya.
Ọ na-arịọ ụlọikpe ahụ ka ọ lebe anya n'usoro e si nwụchịe ya ma kpọlata ya Naịjirịa dịka ọ na-ebo ha ebụbọ ịji ụzọ nzụzọ kpọlata ya.
Gọomentị mba Kenya agọbuola na aka ha adịghị na ikpọlata Kanu Naịjirịa.
Ọ bụ ọkammụta George Wajackoya bụ ọkaiwu ukwu ji ya bụ okwu ahụ.
Ihe asatọ ọ chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa site n'ụlọikpe - Aloy Ejimakor

Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu pụrụiche nke onye ndu otu chọrọ mwereonwe Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu akpụpụla gọọmentị etiti n'ụlọikpe dị n'Umuahia, Abia Steetị.
Ejimakor bụ onye gaara n'ụlọikpe na Tuuzde 7 Sepụtemba 2021 nata ikike n'aka ụlọikpe ugwu dị n'Abia ịgba gọọmentị akwụkwọ maka imetọ ikike dịịrị Nnamdi Kanu.
Ọ sị na mgbe a ga-eleba anya n'ikpe ahụ bụ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Seputemba afọ 2021.
Kedụ mkpesa Ejimakor mere n'ụlọikpe a?
Ọkaiwu Ejimakor depụtara ihe itoolu gbara ọkpụrụkpụ ọ chọrọ ka gọọmentị etiti mee n'ihi Kanu nke gụnyere;
- Ọ sị ka ụlọikpe kpebie na etu ndịagha Naịjirịa si wakpoo ụlọ Kanu dị n'Afaraukwu Umuahia n'ụbọchị 10 nke ọnwa Sepụtemba afọ 2017 megidere iwu ikike dịịrị onye na Naịjirịa nakwa mba Afrịka.
- Ka ụlọikpe kwuo na nnwuchi a nwuchiri Kanu na Kenya na-esoghi usoro iwu adịghị mma ma megide ikike dịịrị ya dịka o si dịkwa n'iwu mbaụwa.
- Ka ụlọikpe kwuo na ahụhụ nakwa mkpọchi a kpọchiri Kanu na mba Kenya na-ekweghi ya zara ọnụ ya megidere iwu nakwa ikike dịịrị Kanu dịka o si dị n'iwu.
- Na ụgbọ nwa mkpị a gbaara Kanu site na mba Kenya bata Naịjirịa, mkpọchi nakwa atụmatụ ikpe ya ikpe megidere iwu ikike dịịrị onye na Naịjirịa.
- Ka ụlọikpe mee ka gọọmentị etiti kwụsị ikpe ha na-ekpe Kanu nke akara ya bụ FHC/ABJ/CR/383/2015, maka na etu e si tụlata ya na Naịjirịa site na Kenya megidere iwu ikike dịịrị onye.
- Ka ụlọikpe nye gọọmentị etiti iwu ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu ma mee ka o nwere onwe ya dịka ọ dịbu n'ụbọchị 19 nke ọnwa Juun 2021. Ka ha kpọghachịkwa ya na mba Briten bụ ebe o bi, cherezie mgbe ha ga-eme mkpesa n'usoro iwu ka a kpọlata ya na Naịjirịa.
- Ka ụlọikpe nye gọọmentị iwu ka ha rịọ Kanu mgbaghara maka imetọ ikike dịịrị ya ma bipụta akwụkwọ arịrịọ ahụ n'ihu akwụkwọ ntaakụkọ atọ a ma ama na Naịjirịa.
- Ka ụlọikpe nye gọọmentị etiti iwu ka ha kwụọ Kanu ego dị ijeri naịra ise (₦5 billion) iji tie ya aka n'obi maka mmekpa ahụ ha nyere ya nke metụtara ụbụrụ, akọnauche nakwa ahụ ya.

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Ebe foto si, Aloy Ejimakor




























