Lee ihe mere Naịjirịa ji banye n'akwụkwọ ojii Amerịka n'ihi okpukperechi

Ụlọụka na ụlọalakụba

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mba Amerịka nọ n'ụbọchị Mọnde 7 Disemba, 2020, tinye aha Naịjirịa n'akwụkwọ ojii ha dịka ndị nwere nsogbu banyere nwereonwe n'okpukperechi.

Odeakwụkwọ mba ahụ bụ Mike Pompeo kwuru nke a sị na "ọ bụ mba nwere nsogbu" banyere nwereonwe nke okpukperechi.

Nke nwereike ibutere Naịjirịa ọtụtụ mmachi n'ọdịnihu ma ọ bụrụ na ọnọdụ a agbanweghi dị mma.

Mba iri ọzọ ka a gụnyekwara n'ụgbọ a.

Pompeo ebe o depụtara aha mba ọzọ so n'akwụkwọ ojii US maka okpukperechi
Nkọwa foto, Pompeo ebe o depụtara aha mba ọzọ so n'akwụkwọ ojii US maka okpukperechi

Olee mba ndị ọzọ dị n'akwụkwọ

  • Saụdi Arebịa
  • Pakistan
  • Naịjirịa
  • Chaịna
  • Burma
  • Eritrea
  • Iran
  • DPRK
  • Tajikistan
  • Turkmenistan

Gịnị mere ha ji tinye aha Naịjirịa?

Pompeo kọwara na ihe mere ha jiri denye aha bụ na ha dara iwu mbaụwa n'ihe banyere nnwereonwe n'okpukperechi nke afọ 1998 e jiri 'International Religious Freedom Act of 1998' mara.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'ihi mpụ na ogbugbu niile ha mere nke gbadoro ụkwụ na mmegide ikikere ndị mmadụ ife chi sọrọ ha.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana o doro ewu na ọkụkọ anya na Naịjirịa nwere okpukperechi abụọ gbapụtara dịka ụka Kraịst na Alakụba.

Kedụ ihe gọọmentị Naịjirịa kwuru?

Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị Naịjirịa kwuru na gọrọ sị na ọ bụ asị ọcha na ha na-akpa agwa na-emegige nnwereonwe okpukperechi ndị mba ha.

Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed sị na ọ bụ nghọtaghe dịka n'etiti mba abụọ maka etu ha si ahụta ihe na-ebute ọgbaghara na Naịjirịa.

Ọ sị na Naịjirịa na-echekwa ikike onye ọbụla nwere n'okpukperechi dịka iwu ha si kwuo.

Minista kọwara na ogbugbu dị na Naịjirịa metụtara onye ọbụla na-agbanyeghi okpukperechi onye ahụ so na ya.

Ihe ndịisi okpukperechi na Naịjirịa kwuru

Onyeisi ndị okpukperechi Alakụba n'Imo Steetị bụ Suleiman Yusuf Njoku sị na nnwereonwe nke okpukperechi dị na Naịjirịa, na ihe Amerịka kwuru bụ asị ọcha.

Ọ sị na mba Amerịka itinye aha Naịjirịa n'akwụkwọ ojii gosiri na ọ bụ mmegbu ha dị mbụ na-emegbu ndị Naịjirịa.

Njoku si na Amerịka chọrọ ibute ọgbaghara na Naịjirịa dịka ha mere na Libya, Liberia, Sierra Leone na ndị ọzọ.

Ọ gwara ndị Naịjirịa ka ha lepu anya n'ozi ahụ ma gaa n'ihu n'ikperechi ọbụla masịrị ha dịka iwu Naịjirịa si kwuo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: