You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalịa a: Onyeisiala South Sudan nwere ike ịchịru afọ 10
Akụkọ kachasị mkpa n'abalị a:
Ipob enyela gọọmentị Naịjirịa iwu ọzọ
Otu Ipob agwala gọomentị Naịjirịa ka ha were ọsọ were ije tọhapụ onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu n'agbụ ekere ya kemgbe ndị agha Naịjiria wakporo ụlọ ya n'Afaraukwụ n'Abia Steeti, n'ọnwa Oktoba 2017.
Ndị uweojii asaa anwụọla taa
Ndị ji egbe gbagburu ndị uweojii asaa na Galadimawa Junction nke dị nsIpo n'ọdụụgbọelu dị n'Abuja.
Onyeisi ndị uweojii n'Abuja bụ Sadiq Bello, kwuputara nke a n'ehihie taa tiri ezịnaụlọ ndị otu ha ọdachie metụtara aka n'obi ma kwee ọha mmadụ nkwa na e zipụla ndị uweojii iji chekwa ndụ na ihe ndị mmadụ nwere n'Abụja.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Etu e si gbagbuo ndị uweojii asaa n'Abuja
"Saraki na Dogara rituo"
Ọgbaghara dapụtara n'ụlọomeiwu ukwu dị n'Abuja taa ka ndị na-eme ngagharị iwe wakporo ebe ahụ na-ekwu ka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na ogbo ya nke ụlọomeiwu nke nta bụ Yakubu Dogara, tinye akwụkwọ arụkwaghịm.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a Budget 2018: Ndị na-eme ngaghariwe chọrọ ka Saraki na Dogara rituo n'ọkwa.
Akụkọ si mba ọzọ
Ndị gọomentị mba Saụt Sudan ekwuola ka e nwee iwu ga-etinyekwu afọ atọ n'afọ ole onyeisiala ha bụ Salva Kiir ga-achị ha.
Ọ bụrụ na okwu a nwee isi, ọ ga-eme ka Kiir nọruo afọ iri n'ọkwa dịka onyeisiala.
N'egwuregwu
Onye ọgba bọọlụ Greece bụ Sokratis Papastathopoulous dị afọ iri atọ esila Borussia Dortmund gafee otu Arsenal.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri nke taa
Na mkparịtaụka ọkpa-ọchị ama ama bụ Victor Osuagwu na BBC nwere, o gwara Ndigbo ka ha gaa wuo ụlọọrụ, ebe mbusa ngwahịa, ụlọ-akwụkwọ nakwa ihe mmepe ndị ọzọ n'ala Igbo n'ihi na 'akụ rụọla bụ ya bụ akụ'.