Akụkọ kachasị n'abalị a: Agaghị ezupụnwuzi ego Naịjirịa na Swizaland ọzọ
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a
Ego Abacha bupuru

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mba Swizaland ekwuola na ha eweghachịtachaala ego Abacha zufere na mba ha.
Onye na-anọchite anya Swizaland na Naịjirịa bụ Eric Mayoraz kọwakwara na e nwere iwu ọhụrụ ndị mba Swizaland tinyere ga-egbochi ndị mmadụ izubata ego na mba ha.
"Atụghị m ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo"

Ekene Okechukwu bụ otu onye n'ime mmadụ abụọ a kpọrọ aha na ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo bụ onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo, agọọla na o sonyeghị.
N'ajụjụọnụ BBC Igbo gbara ya n'ebe e ji ya eji, Okechukwu bụbụ onye uweojii si na ọ bụ maka ekwentị ya furu efu ka e ji kpọọ ya aha.
N'akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Ndị agha nnupụisi alakụba bekee kpọrọ 'islamist militants' awakpoola isiụlọọrụ ndị agha ọtawaike (task force) nke Afrịka dị na mba Mali taa.
Ndị ntaakụkọ Reuters dere na ndị nnupụisi a bidoro ịgba egbe ma ogbunigwe nke a kpọrọ 'rocket', ma na-achọ iwabata n'ime ụlọọrụ ahụ.
N'egwuregwu,
Marouane Fellaini bụ onye egwu etiti ndị Manchester United ebinyela aka n'akwụkwọ ga-adọtị ọrụ ya n'otu ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Fellaini dị afọ iri atọ ga-anọkwu afọ abụọ na Man Utd tupu o kwuwe okwu ma ọ ga-apụ gaa ebe ọzọ ma ọ gaghị apụ.
Gee nkeji nke abalị a ebe a
Ihe nkiri nke taa
Otu nwoke akwaala arịrị maka etu ezinaụlọ ya si sonye na ndị e gburu na Platu steeti. O kwuru sị "ụmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ."






























