Coronavirus: Mmadụ 22 enyochara ebughi ọrịa ahụ na Naịjirịa - NCDC
NCDC ekwuola na n'ime mmadụ 23 e mere nyocha na o nweghi onye ọzọ bu ọrịa Coronavirus na Naịjirịa n'abụghị nwoke onye bu ya mbụ.

Ebe foto si, AFP
Nke a na-abịa dịka ha lebara anya n'ahụ mmadụ 22 ọzọ si na steeti ise na Naịjirịa gụnyere Legọs, Ogun, Abuja, Kano nakwa Edo.
Ha kwuputara site n'akara Twitter ha na "o nweghi onye ọhụrụ ọzọ bụ Coronavirus"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, AFP
Mba Ịtali etinyela mmadụ nde iri na isii n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "quarantine" dịka ọ na-ebuso nje coronavirus agha ịhụ na ha chabiri mbawanye ya.
Ndị o metụtara bụ ndị bi na mpaghara Lombadi nakwa mpaghara 14 ọzọ.
Ndị a niile ga-anata akwụkwọ pụrụiche tupu e nye ha ohere ka ha mee nje ọbụla.
Obodo Milan an Venice so n'ebe ya bụ ihe metụtara.
Onyeisiala Ịtali bụ Giuseppe Conte kwukwara na ha amachiela ndị mmadu ịga ụlọakwukwọ, ebe oriri na nkwari nakwa ebe njem nkiri di na mba ahụ dum.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ n'ụbọchị nke atọ nke ọnwa Eprelu ka mmachị ndị a ga-akwụsị.
Mba Ịtali b ya kacha nwee ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus na Yurope.
Ndị ọchịchị kwuru na ndị bu nje a na-abawanye kwa ụbọchị.
Ugbua, ihe ruru mmadụ 5,883 bu ọrịa coronavirus na Ịtali ebe mmadụ 230 anwụọla.
Gịnị mere Gọvanọ Hope Uzodinma?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akụkọ na-efegharị na-akọwa na a wakpoola ụgbọala Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma na steeti ahụ.
Ụlọ ntaakụkọ dị icheiche kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa Ohaji - Egbema wakporo Uzodinma ma na-ati "Onye oshi vootu"
Ebe akụkọ ọzọ na-ekwu na ndị ntorobịa na ndị agha lụrụ ọgụ nke butere mmebi enyo ụgbọala Gọvanọ Uzodinma.
Ka ọ dị ugbua BBC Igbo na-agba mbọ ịchọpụta nke bụ eziokwu n'akụkọ a.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Chelsea ji ọkpụ goolu anọ asataghị otu yọchaa Everton ka akamụ ndụ mgbe ha zutere onwe ha n'asọmpị Premier Lig n'ụbọchị ụka.
Nke a na-abụ ugboro abụọ Lampard onye nchịkọta Chelsea na-emeri ndị nkuzi ya bụ Ancelotti na Mourinho.

Ebe foto si, Getty Images
Coronavirus metụtakwara egwuregwu na mba Ịtali.
Ndị nhazi egwuregwu kagburu asọmpi niile gaara adị n'izuụka gara aga n'ihi ya bụ ọrịa.
Etu ahụ ka ọ dịkwa n'egwuregwu bọọlụ nkata na ndị ọzọ.
Mana ha enyela iwu ugbua ka asọmpi ndị ahụ gaa n'ihu, kama onweghị ndị mmadụ ga-abịa ikiri ya.
Coronavirus n'Afrịka

Ebe foto si, Who.int
Ọkammụta n'ihe gbasara nnyocha nje bụ Oyewale Tomori ekwuola na onye ọbụla sị na ya nwere ọgwụ maka coronavirus n'Africa bụ okpotokpo asị ka ọ na-asị.
Tomori onye bụbu onyeisi mahadum Redeemers dị n'Osun steeti kwuru nke a dịka akụkọ na-agbasa ebe ụfọdị ndị mmadụ na-ekwu na ha nwere ọgwụgwọ maka ọrịa a.
O kwuru na ọ bụrụ na e nwere mba ga-ewepụta ọgwụ coronanavirus, o kwesịrị ịbụ mba Chaịna ebe ya bụ ọrịa nọrọla ọtụtụ oge.
Tomori jụrụ sị, "kedu ka mmadụ ga-esi kwuo na ya nwere ọgwụ maka ọrịa batara Afrịka n'otu izuụka gara aga?"
"Tupu mmadu ekwuo na ọgwụ na-agwọ ihe, ọ ga-egosi anyị onye o ji ọgwụ ahụ gwọọ."
"Ndị kwuru na ha nwere ọgwụ coronavirus, mmadụ ole na-arịa ọrịa a ka ha gwọrọla?"

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:

































