Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati

Ebe foto si, Labour Party website
Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.
Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.
Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.

Ebe foto si, Labour Party website
Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka okwu ụgha.
Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe ike ime nke ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.








