Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati

    Onyeisioche Labour Pati bụ Julius Abure

    Ebe foto si, Labour Party website

    Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.

    Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.

    Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.

    Akwụkwọ iwu Labour Pati

    Ebe foto si, Labour Party website

    Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka okwu ụgha.

    Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe ike ime nke ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.

  2. Red Cross Orphanage: Gọọmentị Enugwu enyela ụmụaka ndị a ọnọdụ ọhụru ka akụkọ BBC pụtachara

  3. Hope Uzodimma agaala leta ndị nwere ihe mberede n’Imo steeti

    Hope Uzodimma agaala leta ndị nwere ihe mberede n’Imo steeti

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma agaala leta ndị zutere ihe mberede n’okporoụzọ IMSU Junction n’ụbọchị Satọde gara aga.

    Ọ bụ n’ụbọchị Mọnde 20 Mee 2024 ka Uzodimma gara leta ndị ahụ nwere ihe mberede okporoụzọ n’ebe ha na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ Federal University Teaching Hospital Owerri (FUTHO).

    N’oge ọ na-ekwu okwu, onye nọchitere anya Gọvanọ Uzodimma na njem ahụ bụ osote ya, Chinyere Ekomaru, kwuru na gọvanọ enyela iwu ka e mee nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachị ahụ.

    Ọ makwara ọkwa na gọọmenti Imo ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ mmadụ niile nwetara ihe mmerụahụ n’ihe mberede ahụ.

    Hope Uzodimma agaala leta ndị nwere ihe mberede n’Imo steeti

    N’oge ya na ndị ahụ nwere ihe mberede na-akparịtaụka, Ekomaru kpuhere na gọọmenti ga-agbakọorọ ụlọọgwụ ahụ aka iji hụ na ha nwetara onwe ha na-egbughị oge.

    Cheta na Gọvanọ Uzodimma ezipụrụla ezinaụlọ ndị tufuru ndị nke ha n’oge ihe mberede ahụ ozi nkasiobi ma kwee nkwa na gọọmenti ya ga-eme ezi nnyocha banyere njinji ahụ.

    Mmadụ isii tụfuru ndụ ha ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetara ihe mmerụahụ n’ụbọchị Satọde n’ihe mberede mere n’okporoụzọ IMSU Junction nke dị n’isi obodo Imo steeti bụ Owerri.

  4. Mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrika otu ezinaụlọ nọ n'ọchịchị kemgbe afọ 60

  5. Ndịagha egbuola ọchịagha IPOB/ESN n’Imo steeti

    Mgbọ ogbuniigwe anapụtara ndị omekoome n'Imo steeti

    Ebe foto si, Nigerian Army/X

    Ndịagha Naịjirịa nọ n’ọrụ a kpọrọ ‘Udo Ka’ ekposaala ndị omekoome na mpaghara Udda, Ihitteukwa na Orsumoghu dị n’okpuruọchịchị Orsu nke Imo steeti.

    Isi ụlọorụ ndịagha Naịjirịa kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 7 Mee 2024 n’ozi ha wepụtaara ọhanaeze n’akara ọbaozi X ha.

    Ozi ahụ kwuru na ndị omekoome tụrụ ndịagha ogbuniigwe iji chụghachi ha azụ mana ndịagha guzosiri ike ma gbuo anọ n’ime ha ebe ndị nke ọzọ buuru apa mgbọ gbafuo.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, e gburu otu n’ime ndị ọchịagha IPOB/ESN na-elekọta mpaghara Ihitteukwa bụ Tochukwu e ji ‘Ojoto’ mara, na-agbanyeghị ọtụmọkpọ niile o tinyere n’ahụ.

    Ngwongwo dị iche iche anapụtara ndị omekoome n'Imo steeti

    Ebe foto si, Nigerian Army/X

    Ndịagha sịrị na ngwongwo ebupụtara n’ogbe ndị omekoome ahụ gụnyere otu egbe AK-47 nwere eriri mgbọ abụọ, egbe pump action abụọ, igwe redio atọ, otu igwe kọmputa laptop, otu ekwentị, igodo ụgbọala, otu ihe dịka ọgwụike Marijuana, akwụkwọ ego Biafra, mgbọ ogbuniigwe ise, ngwa ndị e ji emepụta mgbọ ogbuniigwe, ọtụmọọkpọ dị iche iche na ihe ndị ọzọ.

    Ọchịagha na-ahụ maka Udo Ka bụ Maj. Gen. Hassan Dada gwara ọhanaeze na ndị otu ya na-agbasi mbọ ike iji hụ na ekpochapụrụ ndị omekoome ma weghachi udo na mpaghara ahụ.

    Ngwa ndị eji emepụta mgbọ ogbuniigwe anapụtara ndị omekoome n'Imo steeti

    Ebe foto si, Nigerian Army/X

  6. Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala

  7. South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?

  8. Hope Uzodimma: Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Gọvanọ ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna?

  9. Ihe ndị uweojii kwuru maka nwoke e gburu, dọwa ozu ya n'ama n'Imo steeti

  10. "Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger

  11. Etu e si lie Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) bụbu Gọvanọ Anambra Steeti

  12. Lee ndị Gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu surugede ugbua

  13. Nnamdi Kanu ekwughị na ọ gaghị apụta maka ikpe ya maọbụrụ na e meghị ihe ọ chọrọ- Ejimakor

  14. Ihe mere n'ikpe EFCC na Cubana Chief Priest taa

  15. Lee etu oliliozu Ogbonnaya Onu si aga n'Ebonyi Steeti

  16. Anwụchiela onye nwe ụlọ oriri maka ịtagbu otu nwaokorobịa n’ahụhụ n’Imo Steeti

    Ibe Obasi gbara afọ iri atọ na asatọ bụ onye a na-ebo ebubo igbu Ebuka Udemba, onye Umuokpa dị n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti.

    Ebe foto si, IMO STATE POLICE

    Nkọwa foto, Ibe Obasi gbara afọ iri atọ na asatọ bụ onye a na-ebo ebubo igbu Ebuka Udemba, onye Umuokpa dị n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti.

    Ndị uweojii anwụchiela onye nwe ụlọ oriri ‘Our Guest House’ dị n’Umulogho n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti bụ Maazị Ibe Obasi n’ihi ebubo igbu nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na ise maka izu ohi ekwentị.

    Ibe Obasi gbara afọ iri atọ na asatọ bụ onye a na-ebo ebubo igbu Ebuka Udemba, onye Umuokpa dị n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti.

    N’oge BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, ọ kọwara na nnyocha ndị uwojii mere gosiri na nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ onye akpọchiri n’imeụlọ igweọkụ ‘generator’ nke ụlọ oriri ‘Our Guest House’ bụ ebe anwụrụ ọkụ nọọrọ kugbuo ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “enyefeela nwaamadị ahụ a na-enyo enyo n’aka ngalaba ndị uweojii na-eme nnyocha banyere mpụ bụ ‘State Criminal Investigation Department (SCID)’ dị n’Owerri maka ime nnyocha miri emi n’okwu ahụ.’

    O kwukwara na nwaadị ahụ enyela ndị uweojii ozi rijuru afọ nke ga-enyere ha aka inwuchi mmadụ ndị ọzọ aka ha dị n’okwu ahụ.

    Okoye sịrị na kọmịshọna ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Aboki Danjuma agwala osote onyeisi ya na-ahụ maka SCID ka o mee nnyocha rijuru afọ iji chọpụta ihe butere ọnwụ nwaokorobịa ahụ ma hụkwa na anwụchiri mmadụ niile aka ha dị n’ọnwụ ya.

    N’ụbọchị Mọnde 8 Eprel 2024 ka anyị nwetara ozi na otu onye nwe ụlọ oriri jiiri anwụrụ ọkụ si n’igweọkụ 'generator' gbuo otu nwaokorobịa n’ihi ebubo izu ohi ekwentị.

  17. Jacob Zuma enwetala mmeri n’ụlọikpe isoro zọọ ọkwa na ntụliakaelu South Africa

    Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru otu pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK)

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru otu pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK)

    Onyeisiala Saụt Afrịka pụrụ apụ bụ Jacob Zuma enwetala ikike isonye na ntụliakaelu a ga-ahazi na mba ahụ n’ime ọnwa Mee.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntụliakaelu tụgharịrị mmachi amachiri ya isoro zọọ ọkwa n'oge ntụliakaelu.

    N’ime ọnwa gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Saụt Afrịka machiri Zuma isonye na ntụliakaelu maka ịgbanahụ amamiikpe ụlọikpe.

    Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK).

    Dịka onye amabu ama na pati ji ọkwa ọchịchị ugbua na Saụt Afrịka bụ ‘African National Congress’ (ANC), Zuma bụ onye aha ya na-eko achịcha ma bụrụkwa onyeisiala malite n’afọ 2009 ruo 2018 bụ mgbe ọ rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ihi ebubo mpụ na nrụrụakaego.

    A tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri na ise n’afọ 2021 n’ihi na ọ jụrụ ịgba akaebe n’oge a na-enyocha ya maka mpụ na nrụrụakaego, mana ka osiladị ọ gara mkpọrọ naanị ọnwa atọ n’ihi ọnọdụ ahụike ya.

  18. Rwanda Genocide: Alọghịchịrị m n'ụlọ kamgbe afọ 30 m gbara ọsọndụ n'ihi ogbugbu agbụrụ

  19. N'ihi nnyocha mpụ: Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Onyeisioche ụlọomeiwu Saụt Afrịka bụ Nosiviwe Mapisa-Nqakula agbaala arụkwaghịm dịka ndị uweojii wụchara n’ụlọ ya n’oge a na-enyocha ya maka ebubo mpụ.

    Mapisa-Nqakula bụ onye a na-ebo ebubo ịnara ngarị maka ịnyepụ ọrụngo n’oge ọ bụụrụ minister nchekwa.

    Ọ gọọla aka na ụkwụ ya n’ebubo ahụ ma kwuo na ihe mere o ji gbaa arụkwaghịm “enweghị ụzọ ọbụla o siri bụrụ ịnabata na aka ya adịghị ọcha.”

    O kwuru na dabere etu nnyocha ahụ siri dị oke mkpa na ya agaghị agakwa n’ihu n’ọrụ ya dịka onyeisioche ụlọomeiwu.

    Nwaanyị ahụ gbara afọ 67, onye sooro buo agha megide ịkpa oke bụụrụ onyeisioche ụlọomeiwu n’afọ 2021 mana tupu mgbe ahụ, ọ bụụrụ minista nchekwa ruo afọ asaa.

    N’izuụka gara aga, ndị ọkaikpe Mapisa-Nqakula gbara akwụkwọ arịrịọ iji chọọ ka ụlọikpe nye iwu ga-akwụsị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi ya dịka ha kwuru na nke ahụ ga-emechu ya ihu.

    N’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, ndị ọkaikpe jụrụ ịnabata arịrịọ ahụ dịka ha sịrị na okwu ahụ abụghị nke bịara na mberede ebe ha na-apụghị atụ anya nnwuchi nke na-emebeghị eme.

    Ozi sitere n’akwụkwọ akụkọ Business Day na-ekwu na a na-ebo Mapisa-Nqakula ebubo ịnapụ otu onye nwere ụlọọrụ ego ruru $120,000 (£96,000) iji nye ya ikike ibuga ngwa ndịagha mba Saụt Afrịka.

  20. E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Senegal