Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya
Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Otti akwụsịtụla kọmishọna na-ahụ maka ahụike ọrụ n’Abịa steeti

Ebe foto si, Alex Otti/Instagram
Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela nkwado ka a kwụsitụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dr. Ngozi Okoronkwo ọrụ.
Nke a dị n’ozi kọmịshọna mgbasaozi Abịa steeti bụ Okey Kanu tinyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024.
Dịka Kanu siri kwuo, nkwụsịtụ ọrụ ahụ bụ iji nye ohere ka e mee kọmịshọna ahụ nnyocha n’ihi ebubo ajọ akparamaagwa e boro ya.
Ozi ahụ siri na ya bụ mkpebi dabara n’atụmatụ Gọvanọ Otti ịhụ na ndị ahọpụtara n’ọkwa rụrụ ọrụ ha oge niile maka ọdịmma ụmụafọ Abịa.
Ka o siladị a gwala odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị ahụịke Abịa steeti bụ Dr. Ifeyinwa Kalu na onye ndụmọdụ pụrụiche gọvanọ n’okwu metụtara ahụike bụ Dr. Ngozi Azodo ka ha na-elekọta mịnịstrị ahụ ruo mgbe e mechara nnyocha gbasara ebubo ahụ e boro Dr. Okoronkwo.
Ndị ojiegbe agbagbuola ndị uweojii abụọ n’Imo steeti

Ebe foto si, Henry Okoye/X
Ndị ojiegbe amatabeghị ndị ha bụ egbuola ndị uweojii abụọ na otu mmadụ nkịtị n’Akabọ dị n’okpuruọchịchị Ikeduru n’Imo steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’otu ozi o wepụtara n’aha kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma.
Dịka o siri kwuo, njinji ahụ jiri n’ụtụtụ Tuzde 11 Juun 2024 n’oge ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB na ESN wakporo ebe ndị uweojii na-enyocha ndị mmadụ ma malite ịgba egbe aghara aghara.
Ọ sịrị na ndị uweojii gbara nnukwu mbọ iguzogide ndị ekperima ahụ mana mmadụ abụọ n’ime ha tụfuru ndụ ha tinyekwara otu onye nkịtị na-agafe agafe.
O kwuru na kọmịshọna ndị uweojii Imo steeti edurula ndị uweojii gaa n’ogbe ahụ iji were anya ya hụ ka ebe ahụ dị ma nye iwu ka ha gbaa mbọ chọpụta ndị aka ha dị na mwakpo ahụ.
Sịnetọ Ned Nwoko ekwuola ka ekepụta Anịọma steeti n’ime South East

Ebe foto si, PRINCE NED NWOKO/X
Nkọwa foto, Sịnetọ Ned Nwoko ekwuola ka ekepụta Anịọma steeti n’ime South East Onye omeiwu na-anọchiteanya Delta North n’ụlọomeiwu sịnet bụ Ned Nwoko na-ekwu na ya ewepụtala atụmatụ iwu maka ikepụta Anịọma steeti.
N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024, Sịnetọ Ned Nwoko sịrị na ebumnoobi atụmatụ iwu ahụ bụ idozi ihe e mebiri emebi.
O kwuru na nkepụta Anịọma steeti dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ ga-enye aka dozie ọnụọgụ steeti na-adịghị nhatanha na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
Ọ sịrị na “mpaghara South East nwere naanị steeti ise ebe mpaghara ndị ọzọ nwere steeti isii n’otu n’otu ewezuga mpaghara North West nwere steeti asaa.”
Dịka Ned Nwoko siri kwuo, ikepụta Anịọma steeti bara nnukwu uru iji hụ na ewetere ikpe nkwụmọọtọ nye ndị South East.
Ndị omeiwu 35 akwadoola atụmatụ iwu maka naanị otu oge ọchịchị

Ebe foto si, HOUSE OF REPRESENTATIVES NIGERIA/FACEBOOK
Ndị omeiwu nnọchiteanya iri atọ na ise ewepụtala atụmatụ iwu iji belata oge ọchịchị onyeisiala na ndị gọvanọ ka ọ bụrụzie naanị afọ isii.
Iwu ahụ a gụpụtara nke mbụ ya n’ụlọomeiwu nnọchiteanya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024 chọrọ ka e megharịa ụkpụrụ iwu Naịjirịa nke afọ 1999 tinyekwara iwu ntụliakaelu nke afọ 2022 iji nyere ọchịchị Naịjirịa na usoro ntụliakaelu aka.
Ha chọrọ ka amalite ịhazi ntụliakaelu maka ọkwa niile n’otu mkpụrụ ụbọchị, gbasaa okwe ntụliakaelu n’ọbaozi intanet, dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu imeụlọ tupu ahazie ntụliakaelu ma dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu tupu eduo ndị nwetara mmeri n’iyi ọrụ.
Ndị omeiwu ahụ chọkwara ka anabata mpaghara isii e kewara Naịjirịa ma malite ibugharị ọkwa onyeisiala n’ime mpaghara isii ndị ahụ.
N’ime ndị omeiwu iri atọ na ise kwadoro atụmatụ iwu ahụ bụ Ikenga Imo Ugochinyere, Danga Abdullmaleek, Aliyu Mustapha, Francis Waive na ndị ọzọ.
Etu nwaanyị si gbuo enyi ya nwoke maka ike ego ha nwetara na nwayo
Eduola Narendra Modi n’iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta India

Ebe foto si, Reuters
Onyendu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party (BJP) bụ Narendra Modi aṅụọla iyi ọrụ maka oge ọchịchị nke atọ dịka Praịm Mịnịsta India.
A haziri mmemme ahụ n’ebe obibi onyeisiala India dị na Rashtrapati Bhavan.
Otu Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party nke Modi nọ n’isi ya nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri itoli na atọ (293) ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba ya ụkwụ nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri atọ na anọ (234).
N’oge Modi na-ekwu okwu, ọ sịrị na ya “ga-emeta onye niile mma dịka ọ dị n’iwu na-atụghị egwu ihe ọbụla.”
Onyeisiala India bụ Draupadi Murmu dukwara ndị mịnịsta Mordi n’iyi ọrụ na mmemme ahụ.
Etu otu nwada nọọsụ si nwụọ n’ụlọ enyi ya nwoke n’Imo steeti.

Otu onye nọọsụ aha ya bụ Ginikachukwu Judith Okoro anwụọla n’ụlọ enyi ya nwoke n’Owerri Imo steeti.
Ozi anyị nwetara na-ekwu na Gịnịkachukwu gbara afọ 23 bụụrụ onye nọọsụ n’ụlọọgwụ Edoziem Clinic dị n’Awaka okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti tupu ọnwụ ya.
N’oge BBC Igbo garuru n’ezinaụlọ Gịnịkachukwu dị n’okporoụzọ Road Safety, Amawire Egbu n’okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti, nne ya bụ Caroline Iheji kwuru na ọyị nwa ya nwaanyị bụ Charles Chidiebere Ndukwu jiiri ọsọ bịa n’ụlọ ya mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 2 nke ime abalị gwa ya na nwa ya nwaanyị dara ma nwụọ.
Dịka o siri kwuo, oge ọ garuru n’ụlọọgwụ e bugara nwa ya, ọ chọpụtara ihe mmerụahụ dị iche iche n’ihu ya nakwa n’azụ isi ya.
O kwuru na mgbe a jụrụ ya etu nwa ya siri nweta ihe mmerụahụ ndị ahụ, Charles kwuru na ọ bụ n’ihi ihe o tiri ya mgbe ọ na-agba mbọ ịkpọlite ya.
Caroline Iheji kọwara na Charles Chidiebere Ndukwu, nwaafọ Nkwerre dị n’Imo steeti bụ onye ndị uweojii ji eji ugbua dịka ọ na-akpọ oku ikpe nkwụmọọtọ maka nwa ya nwaanyị nwụrụ anwụ.
Ka o siladị, n’oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye, ọ zaghị oku ekwenti ya.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Onyeisiala Mexico ọhụrụ bụ Claudia Sheinbaum

Ebe foto si, Getty Images
·A mụrụ Sheinbaum n’abalị 24 ọnwa Juun 1962 na mba Mexico
·Nna ya bụ Carlos Sheinbaum bụ onye na-azụ ahịa nakwa onye na-ere ọgwu nke nne na nna ya sitere Lithuania bata Mexico n’ime afọ 1920.
·Nne ya bụ Annie Pardo bụ onye Dọkịta nakwa onye ‘Biologist’ nke nne na nna ya bụ ndị Sephardic Jew si Bulgaria wuchie n’afọ 1940.
·Sheinbaum tolitere n’obodo ndị kpatara ego dị na mpaghara ndịda isi obodo Mexico bụ ebe ọ nọọrọ na-ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị oge niile.
·Sheinbaum gara akwụkwọ n’otu ụlọakwụkwọ na-akwalite nkwụrụnankeonwe ụmụakwụkwọ bụ nke ejighị mara mba Katolik. Ọ bụ n’ụlọakwụkwọ ahụ ka o nọọrọ wulite akparamaagwa nwaanyị na-eme ihe ike.
·Amlo hopụtara Sheinbaum n’ọkwa ma nye ya ọrụ abụọ ndị gụnyere; ịzacha ma kpochaa otu n’ime obodo ndị kachasị nwee ureghure n’ụwa dum tinyekwara ịrụ okporoụzọ Periférico nke abụọ, nke bụ okporoụzọ kachasị buo ibu na mba ahụ. Ọ rụchapụrụ ọrụ abụọ ndị ahụ.
·Mgbe ọchịchị Amlo kụụrụ ọnụ n’afọ 2006, Sheinbaum laghachiri n’ọrụ nkụzi ma soro na ndị nwetara onyinye nkwanyeugwu ‘Noble Peace Price’ maka ime nnyocha gbasara mgbanwe ọnọdụ ihu eluigwe.
·O tinyekwara aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ ọnụ na-ekwuru Amlo n’oge achụmtavootu onyeisiala ya kụrụ afọ n’ala n’afọ 2006 nakwa 2012.
·N’afọ 2015, ọ banyere na ndọrọndọrọ ọchịchị n’uju dịka ọ zọrọ ọkwa ‘Mayor’ Tlalpan dị na Mexico ma nwetakwa mmeri.
·Dịka ọ gasịrị afọ atọ, Amlo nwetara mmerị dịka Onyeisiala mexico ebe Sheinbaum nwetara mmeri dịka onye ‘Mayor’ Mexico City.
·N’afọ 2024, Sheinbaum nwetara mmeri dịka Onyeisiala Mexico na-agbanyeghị ọtụtụ nsogbu ndị o zutere.
Abụ njirimara ochie ga-enyere aka jikota obodo Naịjirịa – Sịnatọ Victor Umeh
Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa
E butuola onye uweojii n’ọkwa maka ịnapụ ndị mmadụ egọ n’Imo steeti

Ebe foto si, AFP
Kọmịshọna ndị uweojii n’Imo steeti bụ Aboki Danjuma ebutuola Inspector Isong Osudueh n’ọkwa maka ịnapụ ndị mmadụ ego n’ike.
Isong Osudueh bụ onye na-arụbu ọrụ na ngalaba na-ebu agha megide iyi ndụ egwu bụ Counter Terrorism Unit (CTU).
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru nke a n’otu ozi o zipụrụ n’ụbọchị Tuzde 28 Mee 2024.
E buturu Osudueh n’ọkwa n’oge ihe onyonyoo gosiri ebe ọ na-anapụ ndị ọkwọụgbọala ego n’okporoụzọ sitere Owerri gawa Ọnịcha.
Dịka Okoye siri kwuo, Danjuma katọrọ omume onye uweojii ahụ ma kwuo na ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti agaghị anabata ụdị omume ọjọọ ọbụla n’ebe ndị uweojii nọ.
Burkina Faso ewerela afọ ise gbatịa oge ọchịchị ndịagha

Ebe foto si, Reuters
Ọchịchị ndịagha Burkina Faso amaala ọkwa na ha ga-eji afọ ise gbatịa oge ọchịchị ha.
E kwupụtara nke a n’ụbọchị Satọde n’oge e nwechara nzukọ mkpọtụrụ mba ahụ n’isi obodo ya bụ Ouagadougou.
Ụlọ mgbasaozi Burkina Faso mere ka anyị mata nke a.
Onyeagha na-achị mba ahụ bụ Kaptịn Ibrahim Traoré ga-enwekwa ohere isoro zọọ ọkwa onyeisiala a ga-ahazi na ngwụcha afọ ise ahụ.
Dịka o siri kwuo, nkwekọrịta ọhụrụ nke Kaptịn Traoré bịanyere aka na ya kwuru na oge nnyefe ọchịchị ahụ bụ ọnwa iri isii ga-amalite n’abalị abụọ nke ọnwa Julaị, afọ a.
N’oge o weghaara ọchịchị ihe dịka afọ abụọ gara aga, Kaptịn Traoré kwere nkwa iweghachi ọchịchị ndị nkịtị n’abalị mbụ nke ọnwa Julaị, afọ a.
Mana ka ọ dị ugbua, Burkina Faso esonyerela ndị agbataobi ya bụ Mali n’ịgbatikwu oge ọchịchị ndịagha.
Burkina Faso nọ n’okpuru ọchịchị ndịagha kemgbe ọnwa Jenụwarị 2022 bụ mgbe Lt Col Paul-Henri Damiba napụrụ onyeisiala mba ahụ bụ Roch Kaboré ọchịchị n’ike.
Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati

Ebe foto si, Labour Party website
Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.
Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.
Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.

Ebe foto si, Labour Party website
Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka okwu ụgha.
Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe ike ime nke ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.
Red Cross Orphanage: Gọọmentị Enugwu enyela ụmụaka ndị a ọnọdụ ọhụru ka akụkọ BBC pụtachara
Hope Uzodimma agaala leta ndị nwere ihe mberede n’Imo steeti

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma agaala leta ndị zutere ihe mberede n’okporoụzọ IMSU Junction n’ụbọchị Satọde gara aga.
Ọ bụ n’ụbọchị Mọnde 20 Mee 2024 ka Uzodimma gara leta ndị ahụ nwere ihe mberede okporoụzọ n’ebe ha na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ Federal University Teaching Hospital Owerri (FUTHO).
N’oge ọ na-ekwu okwu, onye nọchitere anya Gọvanọ Uzodimma na njem ahụ bụ osote ya, Chinyere Ekomaru, kwuru na gọvanọ enyela iwu ka e mee nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachị ahụ.
Ọ makwara ọkwa na gọọmenti Imo ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ mmadụ niile nwetara ihe mmerụahụ n’ihe mberede ahụ.

N’oge ya na ndị ahụ nwere ihe mberede na-akparịtaụka, Ekomaru kpuhere na gọọmenti ga-agbakọorọ ụlọọgwụ ahụ aka iji hụ na ha nwetara onwe ha na-egbughị oge.
Cheta na Gọvanọ Uzodimma ezipụrụla ezinaụlọ ndị tufuru ndị nke ha n’oge ihe mberede ahụ ozi nkasiobi ma kwee nkwa na gọọmenti ya ga-eme ezi nnyocha banyere njinji ahụ.
Mmadụ isii tụfuru ndụ ha ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetara ihe mmerụahụ n’ụbọchị Satọde n’ihe mberede mere n’okporoụzọ IMSU Junction nke dị n’isi obodo Imo steeti bụ Owerri.
Mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrika otu ezinaụlọ nọ n'ọchịchị kemgbe afọ 60
Ndịagha egbuola ọchịagha IPOB/ESN n’Imo steeti

Ebe foto si, Nigerian Army/X
Ndịagha Naịjirịa nọ n’ọrụ a kpọrọ ‘Udo Ka’ ekposaala ndị omekoome na mpaghara Udda, Ihitteukwa na Orsumoghu dị n’okpuruọchịchị Orsu nke Imo steeti.
Isi ụlọorụ ndịagha Naịjirịa kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 7 Mee 2024 n’ozi ha wepụtaara ọhanaeze n’akara ọbaozi X ha.
Ozi ahụ kwuru na ndị omekoome tụrụ ndịagha ogbuniigwe iji chụghachi ha azụ mana ndịagha guzosiri ike ma gbuo anọ n’ime ha ebe ndị nke ọzọ buuru apa mgbọ gbafuo.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, e gburu otu n’ime ndị ọchịagha IPOB/ESN na-elekọta mpaghara Ihitteukwa bụ Tochukwu e ji ‘Ojoto’ mara, na-agbanyeghị ọtụmọkpọ niile o tinyere n’ahụ.

Ebe foto si, Nigerian Army/X
Ndịagha sịrị na ngwongwo ebupụtara n’ogbe ndị omekoome ahụ gụnyere otu egbe AK-47 nwere eriri mgbọ abụọ, egbe pump action abụọ, igwe redio atọ, otu igwe kọmputa laptop, otu ekwentị, igodo ụgbọala, otu ihe dịka ọgwụike Marijuana, akwụkwọ ego Biafra, mgbọ ogbuniigwe ise, ngwa ndị e ji emepụta mgbọ ogbuniigwe, ọtụmọọkpọ dị iche iche na ihe ndị ọzọ.
Ọchịagha na-ahụ maka Udo Ka bụ Maj. Gen. Hassan Dada gwara ọhanaeze na ndị otu ya na-agbasi mbọ ike iji hụ na ekpochapụrụ ndị omekoome ma weghachi udo na mpaghara ahụ.

Ebe foto si, Nigerian Army/X
Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala
South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?
