Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n'aha otu 'Labour Party' bụ Peter Obi ekwuola na mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere maka Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023 akpụọla n'ala ntụkwasịobi ụmụafọ Naijiria nwere na ngalaba ikpe nke Naijiria.
N'izu ole na ole gara aga, Ụlọikpe Kachasị kwụgidere na mkpebi nke Ụlọikpe puru iche e hiwere maka ntuliaka nyere nke kwuru na ọ bụ Bola Tinubu nke APC meriri na Ntuliaka 2023 dịka Inec si kpọpụta ya.
Mana Ụlọọrụ Onyeisiala gwara Obi ka ọ gaa chọrọ ọrụ ọzọ, kwụsị ịkpalite okwu asị megide ọchịchị Bola Tinubu.
N'ozi ya mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ụbọchị Monde n'Abuja, Obi
sịrị na Ụlọikpe Kachasị gosiri na ha ejighị echiche ọha ụmụ Naijiria kpọrọ ihe.
"Ụlọikpe Kachasị gosiri na ha jighị echiche ọha ndị mmadụ kpọrọ ihe
dịka mkpebi ha megidere ihe akaebe gosiri
wuruwuru e mere na ntuliaka; asị a tụrụ sị na e nwere ọgbatauhie n' igwe e ji achịkọta mpụtara ntuliaka; Inec agbasoghi iwu ha jiri aka ha tinye'; asị, asambodo
adigboroja na ihe ndị ọzọ a gbara n'anwụ na ntuliaka ahụ."
"
Na-eleghị anya n'ihu, mkpebi ahụ kpụrụ n'ala
mkpamkpam ntụkwasịobi ụmụ Naijira nwere
na ngalaba ikpe anyị."
" O gosiri na e ji ike napụ ụmụ Naijiria ikike Iwu Naijiria nyere ha."
Obi gara
n'ihu kwuo na otu 'Labour Party' na ndị 'Obidient agaghị achịsa ọwa, kama ha
ga-aga n'ihu n' ịgbasa oziọma banyere olileanya na ezi ọchịchị n'ahịa, ọdọụgbọala ụlọakwụkwọ nakwa mpaghara dị iche iche na Naaijira.
N'ọsịsa ya,
ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu bụ Bola Onanuga kwuru na kama Obi ga-ezigara Onyeisiala
Tinubu ekel maka imeri na ntuliaka," ọ na-ebogharị ebubo ụgha, na-atụpụ okwu dị
agha".
"Obi
kweslrị izigara Bola Tinubu ekele maka mmeri ya ma kwee ya nkwa ịkwado ya kama ọ
na-ekpolite okwu ihe Ụlọikppe kwesịrị ile anya were kpọpụta ya dịka onye meriri
na ntuliaka."
Onanuga,
onye kwuru na o nweghị ihe Obi mepụtara dịka Gọvanọ Anambara steeti, ma ya fọdu
inwe ihe a ga-eji eme ya Onyeisiala, nyere Obi ndụmọdụ sị ya gaa kwadowe maka
afọ 2027 sị: " Anyị na-ele anya n' oge ahụ na ọ ga-agbado ụkwụ n'ihe ndị dị mkpa, ọ bụghị ịkpalite okwu okpukperechi
na agbụrụ dịka o mere n'achụmnta vootu o mere n'ikpeazụ a."
"Ndụmọdụ anyị na-enye Peter Obi bụ ya gaa chọrọ ọrụ ọzọ, dịka ọtụtụ
ụmụ Naijiria ndị ahụghị ya dịka onye tozuru idu ha, jụrụ ya ajụ."
Cheta na Inec kpọpụtara Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri na Ntuliaka Onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.
Peter Obi nke 'Labour Party' na Atiku Abubakar nke PDP wegara mkpesa n'Ụloikpe Pụrụ Iche maka Ntuliaka iji gbagha mpụtara ntuliaka ahụ dịka Inec si kpọpụta ya.
Ụlọikpe ahụ nyere Tinubu mmeri nke mere ka Obi na Atiku were ikpe ahụ gaa n'Ụlọikpe Kachasị.
Mana Ụlọikpe Kachasị kpụpụrụ mkpesa ha ma kwụgide na mkpebi nke Ụlọikpe puru iche e hiwere maka ntuliaka nyere.