You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị uweojii egbuola ndị ekperima karịrị 50 na Taraba Steeti

Nke a bụ nchịkọta akụkọ niile dị mkpa site na mbido ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Aka akparala nwoke metọrọ ma tụwa nwata ime mkpuke n'Anambra Steeti

    Ndị uweojii Anambra Steeti anwụchiela otu nwoke maka imetọ ma tụnye nwata dị afọ iri na anọ ime n’ụlọụka dị n’Anambra Steeti

    N’ozi si n’aka Chidinma Ikeanyionwu bụ onye enyemaka mgbasaozi kọmishọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị n’Anambra Steeti bụ Ify Obinabo kwuru na nwamadị a aha ya bụ James Rich dị afọ 31 bụ nwafọ Cross River Steeti ma na-arụ ọrụ n’ụlọụka St. Michaels Aglikan dị n’Awka.

    Akụkọ kwuru na ọ na-arabata nwata ahụ n’ime ụlọmposi, dinaa ya tupu a malite ụka n’ụbọchị ahụ.

    Nwoke a ji ọnụ ya kwuo na ọ bụ eziokwu na ọ na-edina nwata ahụ n’isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde, na o mere nke a ugboro atọ ma nye nwata ahụ N200 ka o were zụọ achịcha bekee ‘biscuit’.

    Nwoke a alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ abụọ dịka ọ na-atụ anya nke atọ, o bi n’ime ụlọụka ahụ bụ ebe ọ na-anọ eme arụ a.

    Ọ rịọrọ mgbaghara ma sị na ọ bụ ya mbụ ime ụdịrị ihe a, sị na ọ bụ ọnwụnwa dubara ya n’ime ya.

  2. Kwupụtanụ akụnaụba unu ritere n’aka ọchịchị Buhari – Peter Obi

    Peter Obi aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 agwala gọọmentị etiti ka ha kwupụta akụnaụba Naịjirịa nke ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu ritere n’aka Onyeisiala Muhammadu Buhari.

    N’ozi ndị o wepụtara na Twitter bụzi X ugbua, Obi bụbụ gọvanọ Anambra Steeti kwuru na ndị Naịjirịa kwesịrị ịma nakwa na gọọmentị kwesịrị ịkwụwa aka ha ọtọ.

    Onye ndụmọdụ n’okwu nchekwa bụ Nuhu Ribadu nọọrọ n’ụbọchị Mọnde tiri mkpu na ọchịchị Tinubu ritere akpaego na onweghi ego dị na ya n’aka ọchịchị Buhari.

    N’otu aka ahụ, Tinubu mgbe ọ gara na Mecca, Saudi Arabia kwuru na o ritere ụgwọ nakwa akụnaụba n’aka ọchịchị Buhari.

    Obi kwuru na gọọmentị Tinubu kwesịrị ikwupụta ihe ha ritere n’aka nke mere na ego adịghịzi n’akaego Naịjirịa.

    “Otu ihe e jiri maara gọọmentị dị mma bụ ịkwụwa aka ọtọ. Nke a bụ na ha kwesịrị ikwupụta akụnaụba ha ritere. E kwesịrị ikwupụta ihe e ritere ka ọha maara ebe a nọ nakwa ebe a na-aga.”

    Obi kwuru na ọchịchị APC gara aga kwukwara otu ihe ahụ n’afọ 2015 megide gọọmentị nyefere ha ọchịchị.

    “Ha weere ụgwọ dị N12.6Trillion anyị ji n’afọ 2015 ma mee ka ọ bụrụ ụgwọ N87Trillion n’afọ 2023 mgbe ha pụrụ n’ọchịchị na-ewuliteghi ọnọdụ agụmaakwụkwọ, ahụike, ụbịam nakwa nchekwa.”

  3. Julie Mehretu: Lee Omenka eserese ya ritere $10.7m

    Omenka mba Itiopia a ma dịka Julie Mehretu etiwaala slate dịka onye mbụ n'Afrịka eserese ya ritere $10.7m.

    Eserese ahụ akpọrọ "Walkers with the Dawn and Morning" bụ eserese pụrụiche nke o ji ngwa esise a kpọrọ ink na acrylic were see.

    O nwetara aha eserese ahụ na mbe nke ọma mbem akpọrọ Langston Hughes dere.

    E rere eserese ahụ n'ahịa nka na ngwa ochie ndị ọzọ bụ Sotheby's n'ego ruru $9.5m mana mgbe etinyechara ụtụisi na ihe ndị ozọ, o ruzie $10.7m.

    Mehretu bụ onye tiwaburu slate ahụ mgbe e rere eserese ọzọ ya $9.3m n'ọnwa Ọktoba.

  4. Etu e si chụ ndị ọrụ ọkụ latrik ọsọ n'Enugwu

    Ụlọọrụ ọkụ latrik n'Enugwu EEDC ekwuola etu ndị otu NLC na TUC si chụpụ ndị ọrụ ha ọsọ n'Enugwu ma gbachie ụlọorụ ha iji hụ na ha sonyere n'abụbụ ọrụ ha na-eme.

    Onyeisi mgbasaozi ha bụ Emeka Ezeh n'ozi o weputara kwuru na nke a bụ ihe butere enweghi ọkụ n'Enugwu nakwa steeti ndị ọzọ nọ ha nso na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

    Ụlọọrụ ha ndị o metụtara n'ime Enugwu gụnyere New Haven, Abakaliki, Ugwuaji, Oji River, Agu Awka, Nibo, Ohiya nakwa Awada.

    Ha sị na ọ bụ naanị ụlọọrụ ha dị na Nsukka si n'ụlọọrụ ukwu dị n'Otukpo enweta ọkụ ka nwere ọkụ n'Enugwu steeti niile.

    Steeti ndị ọzọ ọ metụtara gụnyere: Enugwu, Ebonyi, Anambra nakwa mpaghara Umahia n'Abia steeti.

    Ezeh kwuru ka ndị mmadụ cheta na ndị ahịa ha bi n'Imo steeti enwebeghi ọkụ kemgbe ụbọchị mbụ ọnwa Nọvemba maka mgbachi ụlọorụ ha dị n'Egbu na steeti ahụ site n'esemokwu n'etiti ndị NLC na gọọmentị Imo steeti.

    Ọ rịọrọ ndị mmadụ mgbaghara maka nke a ma kwuo na o nwere olileanya na nsogbu a ga-ebi n'oge adịghị anya.

  5. Ụlọikpe mkpegharị ekpebiela na Sanwo-Olu meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ

    Ụlọikpe mkpegharị dị na Legọs ekwuola na ọ bụ Babajide Sanwo-Olu meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Legọs steeti nakwa Obafemi Hamzat dịka onye osote ya.

    Cheta na ngalaba Inec na-elekọta ntuliaka kpọpụtara aha ha dịka ndị meriburu ntuliaka ahụ n'ọnwa Maachị.

    Mana otu Labour Party nakwa otu People's democratic party ekwenyeghi na ya bụ mpụtara nke mere ha ji gawa ụlọikpe.

    Mana ụlọikpe ahụ pụrụiche nke ntuliaka kwuru na ọ bụ Sanwo-Olu na onye otu ya meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ ahụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Septemba.

    N'ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba ka Jandor gbara akwụkwọ ọzọ n'ụlọikpe mkpegharị igbagha mkpebi ụlọikpe ntuliaka.

    Ụlọikpe ahụ n'ụbọchị Wenzde tụpụrụ akwụkwọ ahụ agbara na-ekwu na o rijughi afọ.

    Na mkpebi nke ọkaịkpe atọ bụ Yargata Nimpa, Samuel Bola na Paul Bassey kwekọrịtara na ya, ha kwuru na Sanwo-Olu na osote ya bụ Hamzat bụ ndị meriri.

    O dobeghi anya ma ndị otu abụọ a a ga-aga ụlọikpe kachasị ịgbagha mkpebi a.

  6. Ndị ihe mberede okporoụzọ mere n'Ogbor Hill Aba metụtara

  7. Otiegwu ọzọ a ma ama bụ Oladips anwụọla

    Otiegwu a ma ama na Naịjirịa bụ Oladipupo Olabode Oladimeji e ji Oladips maara anwụọla.

    Nwamadị a nwụrụ n’ihe dịka elekere iri (10:00pm) nke abalị Tuzde dịka ozi si n’aka ndị nlekọta ya si kwuo.

    Ozi ahụ kwuru na “kamgbe afọ abụọ ka nwamadị a na-azọ ndụ ya,” dịka ha kwupụtara nwute n’ọnwụ ya.

    Nwamadị a tiri efere egwu ọhụrụ nke kwesịrị ịpụta na ngwụcha afọ a tupu ọ nwụọ.

    Ọnwụ Oladips na-abịa n’ime ọnwa abụọ ogbo ya bụ Mohbad nwụchara nke mere Oladips jiri tie egwu “die young”.

    A mabeghi kpọkwem ihe gburu nwamadị a mana o wepụtara ihe onyonyo na soshal midia tupu ezinaụlọ ya ekwupụta maka ọnwụ ya.

    N’ihe onyonyo ahụ ọ gwara enyi ya a kpọrọ Rasheed ka ha kwụsị ịhapụ naanị ya n’ụlọ ma na-arịọ ya ka ọ biko lọta n’ụlọ.

    Na nke ọzọ, ọ gwara Rasheed ka ọ kpọrọ ya gaa n’ụlọọgwụ.

    Akụkọ ndụ Oladips

    Oladips kwuru na ọ ga-etipụta efere egwu ya tupu afọ a agwụ.

    N’ajụjụọnụ a gbara ya, Oladips kwuru na ọ na-eche ka akụkọ banyere ọnwụ Mohbad wuchaa tupu o wepụta egwu ahụ.

    O kwekwara nkwa na ọ ga-ahazi emume itiegwu n’ọnwa Disemba a.

    Nwamadị a dị afọ 28 amụọla nwa nwaanyị - ọ na-akpọ ya Paris.

    Oladips na ụfọdụ ndị otiegwu a ma ama dịka Zlatan, Mayorkun na Olamide etikọọla egwu mbụ.

    Ọ nọbu n’otu egwu Reminisce mana o si ebe ahụ pụọ mgbe o kwuru na ha ekweghi akwalite egwu ya na Mayorkun tiri maọbụ mee ihe onyonyo egwu ahụ.

    Ụfọdụ ndị ogbo ya na-eti egwu na-akwanyere ya ukwu ikpeazụ na soshal midia.

  8. CBN agbatiala oge iji Naira ochie azụ ahịa

    Ụlọakụ Etiti nke Nigeria bụ CBN na ịchafụ ekwuola na ha agbatiala ohere iiji N200,N500 na N1,000 azụ ahịa.

    ọnụ na-ekwuru ụlọakụ ahụ bụ Isa AbdulMumin , onye mara ọkwa ụbọchị Tuzde n’ozi o wepụtara kwuru naụlọakụ ahụ na-agba mbọ ịhụ na e wepụrụ ntuziaka nke ụlọikpe nyeburu maka ego ahụ.

    Ozi ahụ sịrị. ‘Iji gbaso etu e zi eme ya n amba ụwa na iji gbalaụ ihe meburu mbụ,akwụwkọ ego nile si n’aka ụlọakụ Central Bank of Nigeria, dịka Akukụ 20(5) nke iwu Naijiria hiwere nke afọ 2007, ga aga n’ihu bụrụ ego e ji azụ ahịa gafee abalị 31 nke ọnwa Disemba e tinyeburu dịka mmalite mmachi ha.”

    Cheta na Ụlọikpe nyere ntuziaka ka ohere iji ego ndị ahụ zụọ ahịa dịrue ngwụcha afọ 2023.

  9. Ndewoo, ndị ọma!

    Igbo , ndị ọma, ndewoonụ!

    Bịa soro anyị maka akụkọ ndị dị mkpa taa.

  10. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi otu onye n'Aba

    Ihe mberede okporoụzọ metụtara ọtụtụ ụgbọala nke mere n' akwammiri 'Waterside Bridge' nke Ogbor Hill n'ebe Okporoụzọ Awara awara si Aba gawa Ikot Ekpene ataala isi otu onye, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'Aba,Abia steeti n'ụtụtụ Tuzde.

    Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na ụgbọala gụnyere ụgbọala Truck enweghị akara, ụgbọala 'coaster bus' nke ụlọọrụ 'Anambra State Government Transport Company' nke bu akara Akwa Ibom UYY 74 XA, ụgbọala Sienna SVU, ụgbọ kekee na ụgbọala SUV ndị ọzọ sukọtara ọnụ n'ọdachi ahụ.

    Mmadụ abụọ so napụta isi ha n'ihe mberede ahụ bụ Sunday Ikechukwu na Miracle Okechukwu, kwuru na ọ bụ nwatịị ihe zọra ha.

    Ka ọ dị ugbua , ebugala ndị merụrụ ahụ ụlọgwụ ebe ndị enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Uche Ukeje, na Chukwuenye Nwaogu Alajemba kutere ndị ụlọọrụ mmenyụọkụ m=ncị ọrụ nchekwa nakwa na ndị na-ekpụpụ ụgbọala ka ha pụpụ ụgbọala ndị ọdachi ahụ metụtara n'ụzọ.

  11. Igbo, mmamma nụ o

    Igbo mmamma nụ o!

    Nke onye chiri, ya zere!

  12. Ndị NLC na TUC ga-amalite abụbọọrụ n'isi ụtụtụ Tuzdee, Agbanyeghi mmachi ụloikpe machiri ha ime nke ahụ

    Otu ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress 'NLC' na ụmụnne ha bụ Trade Union Congress 'TUC' ekpebiela na ha ga-amalite abụbọọrụ n'isi ụtụtụ abalị 14 ọnwa Nọvemba n'elekere 12.

    N'akwụkwọ ozi otu ahụ bipụtara nke ndị odeakwụkwọ otu abụọ ahụ binyere aka, ha gwara ndị otu ha na Naịjirịa niile ka ha malite ya bụ abụbọọrụ.

    Nke a bụ agbanyeghi mmachị ụlọikpe national Industrial Court machiri ha ịbanye ya bụ abụbọọrụ.

    Na mkparịtụaka BBC Igbo na odeakwụkwọ NLC bụ Emmanuel Ugbuaja nwere, o kwuru na ihe ha chọrọ bụ ka a kwụsị ndị wakporo ma tie onyeisiala ha bụ Joe Ajaero ihe.

    Ugboaja tara ikikere eze na i nweghi ihe onyeisiala kwuru maka mwakpo ahụ a kporo onyeisia NLC n'Imo Steeti.

    N'okwu ya; "onyeisi otu ndị ọrụ kachasị na mpaghara Afrịka niile ka e tiri ihe n'Imo steeti, onyeisiala agbachi nkịtị, a naghị eme nke ahụ.

    Cheta na abụbọọrụ ahụ malitere n'Imo steeti ebe a gbanyụrụ ọkụ steeti ahụ mana Ugboaja gwara BBC Igbo na ha ga-abanye abụbọọru ahụ na Naịjirịa niile ma ọ bụrụ na i nweghi ihe onyeisiala kwuru maka ihe e tiri onyeisi ha.

    Chetakwuo na onyeisi otu ndị ọrụ ahụ bụ Joe Ajaero gara Imo steeti idu ndị ọrụ ime ngagharịiwe maka ụgwọ e ji ha ige ndị bu egbe yi uwe ndụ uweojii nwụchiri ya ma kụọ duga duga.

  13. A chụọla 'Home Secretary' nke mba Briten , Suella Braverman n'ọrụ

    Praim Minista mba Briten bụ Rishi Sunak achụọla Suella Braverman bụ Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ.

    Nke a na-abịa dịka Braverman katọrọ ndị uweojii mba ahụ, boo ha ebubo imere ndị na-eme ngharịiwe ya ji akwado ndị Palestine dịka Izrel na-ebu agha megide Hamas na Gaza ugbua.

    E boro Braverman ebubo ịmụnye ọhụ site n'ihe o dere n'akwụkwọ akụkọ dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-akwado ime ngagharịiwe ịkwado ndị Palestine.

    E ji James Cleverly tichie Braverman.

    Cheta na Braverman, onye India a mụrụ na Briten arụbuola ọrụ dịka mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n’ụlọ malite n'abalị isii nke ọnwa Septemba 2022 rue abalị 19 nke ọnwa Oktoba 2022 n'okpuru ọchịchị Praim Minista Theresa May tupu ọ gbaa arụkwaghịm n'ihi okwu metụtara Brexit.

  14. A maala pastọ nwe ụlọụka ebe ndị otu ya ji agụụ kwụgbu onwe ha ikpe

    Ụlọikpe a maala ụkọchụkwụ nwe ụlọụka ihe ruru mmadụ 400 ji agụụ kwụgbu onwe ha n'ihi olileanya ịga eluigwe mana ọ bụghị maka ebubo idufu ndị otu ya.

    Ụlọikpe dị na Malindi ,na mba Kenya mara Paul Mackenzie ikpe maka inwe ụlọ mmepụta ihe onyonyo (film studio) o ji ezioziọma ma ekesa ihe onyonyo na- anataghị ikike.

    Mana ọkaikpe kpere ya bụ ikpe amaghị ya ikpe n'ebubo na na ọ na-akpalite ka ụmụaka ghara ịga akwụkwọ.

    E nwere ike ịtụ Mackenzie mkpọrọ afọ ise maọbụ adaa ya nha na ọnwa na-abịa bụ oge a ga-enye mkpebi okwu ya.

    E kpebeghị Mackenzie ikpe maka narị kwuru narị ndị na-eso ya bụ ndị nwụrụ, na-agbanyeghị na e jichiri ya kemgbe ọnwa Eprelu.

    A hụrụ ozu ọtụtụ ndị mmadụ e liri n'ini emighị emi dị n'ọhịa kpọtụrụ akpọtụ na mba kenya na mbido afọ.

    E boro ebubo na Mckenzie na-edufu site idunye ha bụwa ọnụ iji rite alaeze eluigwe.

  15. Ndeewonu, Igbo ndị ọma!

    Ụnụ abọọla chi, Igbo ndị nwe m na ndị m nwe?

    Ndewoonụ, Igbo ndị ọma.

    Sonye anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa taa.

  16. Pope achụọla otu Bishọpụ n’ọrụ

    Onyeisi ụka Katọlịk bụ Pope Francis achuola otu Bishọpụ a n’ọrụ maka ikwugide nhazia=gharị ụfọdụ Popu na-eme.

    Bishọpụ Joseph Strickland na-elekọta Diocese of Tyler anya katọrọ Pope maka atụmatụ Pope wepụtara nke na-akwado ihe ndị ejighị mara ụlọụka Katọlịk dịka ọlụlụ nwoke na nwoke inke Bkee akpọrọ ‘’same sex marriage’', iwepụ afọime, nke ndi oyibo kpọrọ ‘’Abortion’’ nakwa mmadu ịgbanwe onwe ya nke a kpọrọ ‘’transgender’’ .

    N’ọnwa Julaị, Joseph kwuru na a na-agbanwe usoro nile e jiri mara ụlọụka Katọlịk, na Chukwu keputara alum di na nwunye ka ọ bụru ihe dị n’etiti otu nwoke na otu nwanyi na-abughị nwoke na nwoke ibe ya maọbụ nwanyi na nwanyi ibe ya.

    Tụpụ a chuo ya, e nyere ya ohere iji aka ya pụọ,mana ọ juru aju.

    Bishọpụ Joseph kwuru, ‘’E nweghị m ike ịhapu ọrụ ụka, maka na ihe ọ pụtara bụ ịhapụ ụmuaturụ Chukwu hanyere m na-aka.’’

    Ihu na ụka Katọlik na-aga n’usoro mbaụwa, Pope mara ọkwa ubochị Tọzde na a ga-ebido mebe ndi gbanwere onwe ha(transgender) mmirichukwu n’ulọụka ma ọburu na ọ gaghị ebute nsogbu maọbu mgbagwoju anya.

    Pope kwuru na ọ chụchụ ọ chụrụ Bishọpụ Joseph si na mpụtara nnyocha e mere n’ulọụka ebe ọ na-elekọta bụ ‘’Diocese of Tyler’’ nke gosiri na ọ naghị elekọta akụnaụba ụlọụka ahu nke oma, na e nwere ihe ndi na-adịghị ka o siri kwesi.

    Pope kwuru na ụlọụka ‘’Diocese of Tyler’’ ga-ano n’okpuruochịchị Bishọpụ Joe Vesquez nke Austin nwa obere oge.

  17. Ụlọikpe ndịagha amaala ndịagha abụọ ikpe maka ịgba ọsọ n’ihu ndị oyinduegwu

    Ụlọikpe ndịagha na mba Yuganda amaala ndịagha abụọ ikpe maka igosienweghị ume n’ihu ndị oyindu egwu.

    Kọnel Deo Akiki na Majo John Oluka gbara ọsọ, gbafuo oge ndị agha jihad Al-Shabab wakporo Bulo Marer, na Ndịda isi obodo mba ahụ bụ Mogadishu.

    Ụlọikpe chụrụ ha n’ọrụ amị.

    O pekata mpe e gbụrụ ndịagha Yuganda mmadụ 50 na mwakpo ahụ dịka ndị isi agha si kwuo.

    Mba Yuganda so na ndị wetara ndịagha 'Africa Union' ji akwado Gọọmentị Somali n’agha ha megide otu agha Jihad, Al-Shabab bụ ndị bụ alaka otu al-Qaeda.

    Ụlọikpe Ndịagaha ahụ nụrụ na ndịagha ahụ nụrụ kepukepu na mwakpo ahụ ga-eme mana o nweghị ihe ha mere iji gbochie ya.

  18. Iceland etinyela ọnọdụ gbatagbata dịka alaọmajiji machara

    Mba Iceland etinyela ọnọdụ gbatagbata n’ihi egwu na ọkụ si imeala Bekee kpọrọ ‘Volcano’ ga-amalite dịka ala ọmajiji mere ugborogbioro n amba ahụ.

    Ụlọọrụ gbagbata mba ahụ bụ gwara ndị bi n’Ọdanda Anyanwụ mba ahụ n’obod a kpọrọ Grindavik ha kee nnkwụcha.

    A gbachiela ụzọ ezi aba,apụ n’obodo ahụ iji nye aka hụ na e nweghị kpachikpachi ụzọ..

  19. Ụlọikpe mkpegharị dị na Legọs enyela Peter Mbah mmeri

    Ụlọikpe mkpeharị dị na Legọs ekwuola n’ezie na ọ bụ Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n’ọnwa Maachị 2023.

    Ụlọikpe a kachapụrụ mkpesa Chijioke Edeoga ji aha Labour Party zọọ ọkwa mere megide mmeri Mbah ma sị na mkpesa ahụ achịtaghị aja ma gaa n’ihu sị na ikpe ahụ ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka kwụụ ọtọ.

    Ndị ọkaikpe atọ nọ n’ikpe ahụ nke ọkaikpe Tijani Yusuf Hassan nọ n’isi ya kwuru na Edeoga egosighi ihe akaebe na Mbah ji asambodo iji otu afọ fee ala nna nke adịgboroja.

    Ikpe a na-abịa n’ime ụbọchị ole na ole ka ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nọrọ na Mọnde sị ka ụlọọrụ NYSC kwụọ gọvanọ Mbah nde naịra ise (N5m) maka ịsị na o ji asambodo adịgboroja.

  20. Anyị amụtala ihe, ntuliaka Imo Bayelsa na Kogi ga-adị iche - Inec

    Onyeisi ngalaba na-elekọta ntuliaka bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ha amụtala ihe na ntuliaka ndị gara aga.

    O kwukwara na ọ ga-agba mbọ ịhụ na ntuliaka nke Imo Kogi na Bayelsa ga-akwụ ọtọ.

    O kwuru nke a na nzụkọ ndị ọ dị mkpa n'Abuja ebe ọ nọ kwuo na ndị ọrụ nchekwa enyela ya okwu ha na ha dị njikere idebe nchekwa n'ebe niile a ga-eme ntuliaka.

    O kwukwara ihe ndị ọzọ dị ka ịrịọ ndị niile binyere aka n'akwụkwọ udo ha biko do do do jigide udo dịka ha si kwu.

    Lee ozi ya n'uju ebe a