You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka

Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Nwataakwụkwọ onyenkuzi ya pịanyere n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma anwụọla

  2. 'Ịma ikpe ọnwụ agaghị akwụsị mbụbata ọgwụike na Naịjirịa'

  3. Mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrika otu ezinaụlọ nọ n'ọchịchị kemgbe afọ 60

  4. Cybersecurity Levy: Ihe i kwesịrị ịma banyere ụtụ ọhụrụ a

  5. Lee etu ị ga-esi mara onye bara otu nzuzo

    Ndị uweojiiAnambra steeti na otu ha hiwereịjị gbasaaọzị megịde ịbanye otu nzuzo a kpọrọ POCACOV depụtara ihe dị icheiche ị nwere ike ịjị mara oge nwatakịrị banyere n’otu nzuzo.

    ·Ilee anya ka nwatakịrị si akpa agwa: ọ bụrụ na nwatakịrị bụ onye na-ekwuokwu ọfụma bịdọ na-emechi ọnụ, kwụsị ikwu okwumaọbụ onye na-akpa aghara bido na-anọ nwayọọ nke a bụ otu njirimara ma bụ ihe na-arụtụ aka na nsogbụ dị.

    ·Nwata na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo: ọ bụrụ na nwatakịrị bido na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo, maọbụ na-akpa nkata gbasara otu dị icheiche, nke a na-arụ aka na nsọgbụ dị.

    ·Ka nwatakịrị sị eme na ọ hụ ngwaagha: ọ bụrụ na nwatakịrị na-atụ nnukwu ụjụ ma ọ bụ nwee nnukwu mmasị iweta ngwaagha nke ya, nke a bụ ịhe nrụtụaka.

    ·Ka nwata si eme ndị mejọrọ ya: ọ bụrụ na nwata bịdo na-an̄ụ iyi na ya ga-emegwara ndị mejọrọ ya, mara na nke a nwereike iduba ya n’otu nzuzo.

    ·Mmaya na ọgwụike: nwata nọkata malịta n’ike bịdọ na-anụ ọgwụike na oke mmanya mara na ọ bụ otu ihe na-egosiputa agwa ndị otu nzuzo.

    ·Ịgbapụ n’ụlọ: Ọ bụrụ na nwata bịdọ na-agbapụ n’ụlọ ma nọọ ebe nne na nna ya amaghị abalị ole ma ole, mara na nke a sọ n’ihe njirimara ndị otu nzuzo.

    ·Akwa ọ na-ahụ n’anya: lee anya mara na oge o bịdọrọ na-ahụ otu akwa n’anya sịte n’akwa ọ na enyị, ịhe ngbanaaka na ịhe ndị ọzọ, mara na nke a sọ.

    ·Ka ya na ndị enyi ya sị ekwe n’aka: ndị otu nzuzu niile nwere etu ha sị ekwe n’aka. Tinye anya mara oge nwa gị bịdọrọ na-ekwe n’aka n’ụzọ na-edoghị gị anya.

    ·Ihe ọ na achọ na ịntanet: Ọ bụrụ na nwatakịrị bịdọ na-achọ etu esi emerụ mmadụ ahụ na ịntanet nakwa soshal midịa mara na nsọgbụ dị.

    Ihe ọnụ na ekwuru ndi Uweoji n’Anambra steeti kwuru

    Ọnụ na ekwuru ndị uweoji bụ Tochukwu Ikenga bụ onye zịpụrụ ụsọrọ e jị amara ndị nọ otu nzuzo dịka POCACOV sịrị deputa kwuru na ọ dị mma ka ezinaụlọ gbadọ anya ma hara ilepu anya ka ụmụ ha sị akpa agwa, ọkachasị ihe mgbanwe na ndụ ụmụ ha.

    Tochukwu kwụpụtara ihe mere ndị mmadụ jị abanye otu nzuzo dịka oke ịchụ ego, ndị enyi na eduhie enyi ha ụzọ na ịhe ndị ọzọ.

    N’ọkwụ ya “ụmụaka ike ụwa gwụgọrọ na ndị ịwe na-ewe maka na ezinaụlọ ha eletaghị ha anya ma meere ha ihe ha chọrọ nwereike ịba otu nzuzo ka ha were ya bọọọbọ ma mekpaa ndị obodo ahụ”.

    Ọ gara n’ịhụ kwụọ na ka nne na nna mmadụ sị akpa agwa nwereike ịme ka nwatakịrị banye n’otu nzuzo na ọ bụrụ na onwere onye nọ n’ụdụrị ajọ otu ahụ n’ezinaụlọ ya.

  6. Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala

  7. South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?

  8. Hope Uzodimma: Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Gọvanọ ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna?

  9. "Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger

  10. Etu e si lie Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) bụbu Gọvanọ Anambra Steeti

  11. Lee ndị Gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu surugede ugbua

  12. Nnamdi Kanu ekwughị na ọ gaghị apụta maka ikpe ya maọbụrụ na e meghị ihe ọ chọrọ- Ejimakor

  13. 'Emere m mmehie, ọ bụghị DJ Switch ka anyị nwụchiri ọ bụ DJ Commissioner', Benjamin Hundeyin arịọla DJ Switch na BBC mgbaghara

  14. Ihe mere n'ikpe EFCC na Cubana Chief Priest taa

  15. Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na Kano agbaala Ganduje akwukwọ ọhụrụ n'ụlọikpe

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Kano Steeti ekwuola na ya agbaala akwụkwọ ọhụrụ megide aka chiburu Steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje n’ihi nrụrụakaego na ọchịchị ọjọọ.

    Onyeisioche ụlọọrụ ahụ bụ Muhuyi Magaji kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 16 Eprel 2024 n’ihe omume ụlọọrụ mgbasaozi Channels.

    Dịka o siri kwuo “Ihe a na-eme ugbua ka bụ mmalite ya. Dịka m na-ekwu okwu ugbua, anyị na-enyocha ebubo metụtara ego ọchịchị ime obodo dị ijeri Naịra 51.3 bụ nke ewepụrụ n’akpaego gọọmenti ma kwụbanye n’akpaego mmadụ nkịtị.”

    Magaji boro gọọmenti Ganduje ebubo ịwepụ otu ijeri Naịra n’akpaego gọọmenti Kano Steeti dịka ọ fọdụrụ naanị otu ọnwa ka ọ pụọ n’ọkwa ọchịchị na Mee 2023 mana ego ahụ bụ nke ezigara n’aka ndị mgbanwerịta ego ‘Bureau de Change’ na-abụghị maka ọrụ okporoụzọ eji mawapụta ya.

    Ọ gara n’ihu sị “anyị nwere okwu banyere ijeri Naịra 4 e sitere n’akpaego Kano Steeti zigaa n’ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ubi. Okwu ndị a niile nọcha n’ihu ụlọikpe.”

    Magaji kwuru na ọ bụ eziokwu na Ganduje họpụtara ya dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ, na ya agaghị ala azụ iwepụ okwu ọbụla metụtara ime nrụrụaka nke gọọmentị ahụ pụrụ apụ n’ụlọikpe.

  16. Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye pati 'APC' na ‘Ward’ ya

    Akwụsịtụla onyeisioche ‘All Progressives Congress’ (APC) bụ Abdullahi Ganduje ị bụ onye pati ahụ na wọọdụ ya dị n’okpuruọchịchị Dawakin Tofa na Kano Steeti.

    Ndị isi ọchịchị wọọdụ Ganduje nke onyeisioche ya bụ Haruna Gwanjo kpuhere nke a n’oge ọ na-agwa ndị ọrụ mgbasaozi okwu na Kano n’ụbọchị Mọnde 15 Eprel 2024.

    Gwanjo sịrị na Ganduje, onye bụụrụ aka na-achị Kano Steeti kwesịrị ịgọpụ onwe ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya banyere akwụkwọ ego Dọla.

    Cheta na ụlọikpe ukwu dị na Kano nọọrọ n’abalị 9 Eprel 2024 tinye abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.

  17. Ndịagha Naịjirịa ekwuola okwu maka mwakpo e mere n'ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti

  18. Down-Below: Ihe anyi hụrụ n’ime ogbe ndi omekome n' Umuahia

  19. Ụlọikpe etinyela ụbọchị a ga-ekpe Ganduje ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze

    Ụlọikpe ukwu dị na Kano etinyela abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe aka chiburu Kano Steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.

    Mmadụ ndị ahụ a kpọrọ aha ga-awụcha n’ụlọikpe n’ihi ebubo mpụ asatọ, ndị gụnyere ịnara ngarị, izukọrọ ego nakwa imefu ego na akụnaụba gọọmenti aghara aghara.

    N’akwụkwọ ahụ a gbara n’ụlọikpe, mmadụ ndị ga-azara ọnụ ha n’ebubo ahụ gụnyere Abdullahi Umar Ganduje, Hafsat Umar, Abubakar Bawuro, Umar Abdullahi Umar, Jibrilla Muhammad, Lamash Properties Ltd, Safari Textiles Ltd na Lesage General Enterprises.

    Gọọmenti Kano Steeti sịrị na ya enwetala ndị akaebe iri na ise ga-agba ama megide mmadụ asatọ ahụ a na-enyo enyo n’ihu ụlọikpe.

    Etinyela abali 17 nke ọnwa Eprel dịka ụbọchị a ga-anụrụ ikpe ahụ n’ihu ọkaikpe Usman Na’aba nke ụlọikpe ukwu Kano Steeti.

    Onye ọkaikpe ukwu Kano Steeti ma bụrụkwa kọmịshọna ikpe ziri ezi bụ Haruna Isah Dederi akọwaala na ọ bụ eziokwu na Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ga-awụcha n’ụlọikpe n’ụbọchị ahụ a kpọrọ aha.

  20. Jacob Zuma enwetala mmeri n’ụlọikpe isoro zọọ ọkwa na ntụliakaelu South Africa

    Onyeisiala Saụt Afrịka pụrụ apụ bụ Jacob Zuma enwetala ikike isonye na ntụliakaelu a ga-ahazi na mba ahụ n’ime ọnwa Mee.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntụliakaelu tụgharịrị mmachi amachiri ya isoro zọọ ọkwa n'oge ntụliakaelu.

    N’ime ọnwa gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Saụt Afrịka machiri Zuma isonye na ntụliakaelu maka ịgbanahụ amamiikpe ụlọikpe.

    Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK).

    Dịka onye amabu ama na pati ji ọkwa ọchịchị ugbua na Saụt Afrịka bụ ‘African National Congress’ (ANC), Zuma bụ onye aha ya na-eko achịcha ma bụrụkwa onyeisiala malite n’afọ 2009 ruo 2018 bụ mgbe ọ rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ihi ebubo mpụ na nrụrụakaego.

    A tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri na ise n’afọ 2021 n’ihi na ọ jụrụ ịgba akaebe n’oge a na-enyocha ya maka mpụ na nrụrụakaego, mana ka osiladị ọ gara mkpọrọ naanị ọnwa atọ n’ihi ọnọdụ ahụike ya.