You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka
Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Otu kọmitii ụlọomeiwu nta ekwuola ka a zụtara Tinubu na Shettima ụgbọelu ọhụrụ
Kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo agwala Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ maka Onyeisiala bụ Bola Tinubu na Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima.
Nke a dị n’ozi kọmitii ahụ wepụtara n’oge ha mechara nnyocha gbasara ọnọdụ ụgbọelu onyeisiala na osote ya.
Dịka ha siri dee n’ozi ahụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịzụta ụgbọelu abụọ maka onyeisiala na osote ya iji gbochie ihe ọghọm ọbụla nwere ike ịdapụta n’ihi nsogbu ụgbọelu ha nwere.
N’ime ọnwa Mee, ụlọomeiwu nnọchiteanya nyere kọmitii ahụ iwu ka ha mee nnyocha miri emi gbasara ọnọdụ ụgbọelu dị iche iche onyeisiala ji eme njem iji chọpụta ma ha ka tozuru oke ife n’elu.
Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha
Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti
President Tinubu: "Adaghị m ada kama emere m ‘dobale’ iji kwanyere ọchịchị onye kwuo uche ya ugwu"
Enugu steeti: Lee ihe na-esere ECTDA na EEDC
Otti akwụsịtụla kọmishọna na-ahụ maka ahụike ọrụ n’Abịa steeti
Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela nkwado ka a kwụsitụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dr. Ngozi Okoronkwo ọrụ.
Nke a dị n’ozi kọmịshọna mgbasaozi Abịa steeti bụ Okey Kanu tinyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024.
Dịka Kanu siri kwuo, nkwụsịtụ ọrụ ahụ bụ iji nye ohere ka e mee kọmịshọna ahụ nnyocha n’ihi ebubo ajọ akparamaagwa e boro ya.
Ozi ahụ siri na ya bụ mkpebi dabara n’atụmatụ Gọvanọ Otti ịhụ na ndị ahọpụtara n’ọkwa rụrụ ọrụ ha oge niile maka ọdịmma ụmụafọ Abịa.
Ka o siladị a gwala odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị ahụịke Abịa steeti bụ Dr. Ifeyinwa Kalu na onye ndụmọdụ pụrụiche gọvanọ n’okwu metụtara ahụike bụ Dr. Ngozi Azodo ka ha na-elekọta mịnịstrị ahụ ruo mgbe e mechara nnyocha gbasara ebubo ahụ e boro Dr. Okoronkwo.
Sịnetọ Ned Nwoko ekwuola ka ekepụta Anịọma steeti n’ime South East
Onye omeiwu na-anọchiteanya Delta North n’ụlọomeiwu sịnet bụ Ned Nwoko na-ekwu na ya ewepụtala atụmatụ iwu maka ikepụta Anịọma steeti.
N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024, Sịnetọ Ned Nwoko sịrị na ebumnoobi atụmatụ iwu ahụ bụ idozi ihe e mebiri emebi.
O kwuru na nkepụta Anịọma steeti dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ ga-enye aka dozie ọnụọgụ steeti na-adịghị nhatanha na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
Ọ sịrị na “mpaghara South East nwere naanị steeti ise ebe mpaghara ndị ọzọ nwere steeti isii n’otu n’otu ewezuga mpaghara North West nwere steeti asaa.”
Dịka Ned Nwoko siri kwuo, ikepụta Anịọma steeti bara nnukwu uru iji hụ na ewetere ikpe nkwụmọọtọ nye ndị South East.
Ndị omeiwu 35 akwadoola atụmatụ iwu maka naanị otu oge ọchịchị
Ndị omeiwu nnọchiteanya iri atọ na ise ewepụtala atụmatụ iwu iji belata oge ọchịchị onyeisiala na ndị gọvanọ ka ọ bụrụzie naanị afọ isii.
Iwu ahụ a gụpụtara nke mbụ ya n’ụlọomeiwu nnọchiteanya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024 chọrọ ka e megharịa ụkpụrụ iwu Naịjirịa nke afọ 1999 tinyekwara iwu ntụliakaelu nke afọ 2022 iji nyere ọchịchị Naịjirịa na usoro ntụliakaelu aka.
Ha chọrọ ka amalite ịhazi ntụliakaelu maka ọkwa niile n’otu mkpụrụ ụbọchị, gbasaa okwe ntụliakaelu n’ọbaozi intanet, dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu imeụlọ tupu ahazie ntụliakaelu ma dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu tupu eduo ndị nwetara mmeri n’iyi ọrụ.
Ndị omeiwu ahụ chọkwara ka anabata mpaghara isii e kewara Naịjirịa ma malite ibugharị ọkwa onyeisiala n’ime mpaghara isii ndị ahụ.
N’ime ndị omeiwu iri atọ na ise kwadoro atụmatụ iwu ahụ bụ Ikenga Imo Ugochinyere, Danga Abdullmaleek, Aliyu Mustapha, Francis Waive na ndị ọzọ.
Eduola Narendra Modi n’iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta India
Onyendu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party (BJP) bụ Narendra Modi aṅụọla iyi ọrụ maka oge ọchịchị nke atọ dịka Praịm Mịnịsta India.
A haziri mmemme ahụ n’ebe obibi onyeisiala India dị na Rashtrapati Bhavan.
Otu Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party nke Modi nọ n’isi ya nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri itoli na atọ (293) ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba ya ụkwụ nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri atọ na anọ (234).
N’oge Modi na-ekwu okwu, ọ sịrị na ya “ga-emeta onye niile mma dịka ọ dị n’iwu na-atụghị egwu ihe ọbụla.”
Onyeisiala India bụ Draupadi Murmu dukwara ndị mịnịsta Mordi n’iyi ọrụ na mmemme ahụ.
Were ikike gị kwụsị ikpe ọbụla a na-ekpe Nnamdi Kanu - Ihe ọkaiwu Kanu gwara AGF
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Onyeisiala Mexico ọhụrụ bụ Claudia Sheinbaum
·A mụrụ Sheinbaum n’abalị 24 ọnwa Juun 1962 na mba Mexico
·Nna ya bụ Carlos Sheinbaum bụ onye na-azụ ahịa nakwa onye na-ere ọgwu nke nne na nna ya sitere Lithuania bata Mexico n’ime afọ 1920.
·Nne ya bụ Annie Pardo bụ onye Dọkịta nakwa onye ‘Biologist’ nke nne na nna ya bụ ndị Sephardic Jew si Bulgaria wuchie n’afọ 1940.
·Sheinbaum tolitere n’obodo ndị kpatara ego dị na mpaghara ndịda isi obodo Mexico bụ ebe ọ nọọrọ na-ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị oge niile.
·Sheinbaum gara akwụkwọ n’otu ụlọakwụkwọ na-akwalite nkwụrụnankeonwe ụmụakwụkwọ bụ nke ejighị mara mba Katolik. Ọ bụ n’ụlọakwụkwọ ahụ ka o nọọrọ wulite akparamaagwa nwaanyị na-eme ihe ike.
·Amlo hopụtara Sheinbaum n’ọkwa ma nye ya ọrụ abụọ ndị gụnyere; ịzacha ma kpochaa otu n’ime obodo ndị kachasị nwee ureghure n’ụwa dum tinyekwara ịrụ okporoụzọ Periférico nke abụọ, nke bụ okporoụzọ kachasị buo ibu na mba ahụ. Ọ rụchapụrụ ọrụ abụọ ndị ahụ.
·Mgbe ọchịchị Amlo kụụrụ ọnụ n’afọ 2006, Sheinbaum laghachiri n’ọrụ nkụzi ma soro na ndị nwetara onyinye nkwanyeugwu ‘Noble Peace Price’ maka ime nnyocha gbasara mgbanwe ọnọdụ ihu eluigwe.
·O tinyekwara aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ ọnụ na-ekwuru Amlo n’oge achụmtavootu onyeisiala ya kụrụ afọ n’ala n’afọ 2006 nakwa 2012.
·N’afọ 2015, ọ banyere na ndọrọndọrọ ọchịchị n’uju dịka ọ zọrọ ọkwa ‘Mayor’ Tlalpan dị na Mexico ma nwetakwa mmeri.
·Dịka ọ gasịrị afọ atọ, Amlo nwetara mmerị dịka Onyeisiala mexico ebe Sheinbaum nwetara mmeri dịka onye ‘Mayor’ Mexico City.
·N’afọ 2024, Sheinbaum nwetara mmeri dịka Onyeisiala Mexico na-agbanyeghị ọtụtụ nsogbu ndị o zutere.
Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 3 n’Anambra steeti
Ihe mberede okporoụzọ emeela n’Idemili Obosi nke Anambra steeti ma gbuo mmadụ atọ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) n’Anambra steeti bụ Margaret Onabe kọwara nke a dịka eziokwu n’oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ya n’ekwentị.
Onabe sịrị na nke a mere n’ụbọchị ụka Sọnde 2 Juun 2024 mgbe o jiri ihe dịka nkeji ise gaa elekere itoli nke ụtụtụ.
Dịka o siri kwuo, ihe mberede ahụ gụnyere otu ọgbaatumtum, ụgbọala keke atọ na-acha odoodo, ụgbọala Toyota Hiace abụọ, otu ụgbọala Mack trailer ọcha na otu ụgbọala Toyota Camry.
Mmadụ iri na ise bụ ndị zutere ihe mberede ahụ dịka atọ n’ime ha nwụrụ, ise enweta ihe mmerụahụ ebe asaa ndị ọzọ bụ ndị anapụtara na-enweghị ihe mmerụahụ ọbụla.
Ndị hụrụ ka njinji ahụ siri jie kwuru na ndị na-anakọ ụtụ chọrọ ịnara ndị ọkwọụgbọala keke ego tupu nnukwu ụgbọala ‘trailer’ ahụ na-enweghị ike ijikọlata onwe ya esuo ụgbọala niile ahụ.
Ka osiladị, ndị na-agafe n’okporoụzọ n’oge ihe mberede ahụ mere kpọgara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ tupu ndị ọrụ FRSC awụchie, ka Onabe kwuru.
Abụ njirimara ochie ga-enyere aka jikota obodo Naịjirịa – Sịnatọ Victor Umeh
Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa
"Ọchịchị onyekwuouche ya ka dị ndụ n'Afrịka" - Goodluck Jonathan
Burkina Faso ewerela afọ ise gbatịa oge ọchịchị ndịagha
Ọchịchị ndịagha Burkina Faso amaala ọkwa na ha ga-eji afọ ise gbatịa oge ọchịchị ha.
E kwupụtara nke a n’ụbọchị Satọde n’oge e nwechara nzukọ mkpọtụrụ mba ahụ n’isi obodo ya bụ Ouagadougou.
Ụlọ mgbasaozi Burkina Faso mere ka anyị mata nke a.
Onyeagha na-achị mba ahụ bụ Kaptịn Ibrahim Traoré ga-enwekwa ohere isoro zọọ ọkwa onyeisiala a ga-ahazi na ngwụcha afọ ise ahụ.
Dịka o siri kwuo, nkwekọrịta ọhụrụ nke Kaptịn Traoré bịanyere aka na ya kwuru na oge nnyefe ọchịchị ahụ bụ ọnwa iri isii ga-amalite n’abalị abụọ nke ọnwa Julaị, afọ a.
N’oge o weghaara ọchịchị ihe dịka afọ abụọ gara aga, Kaptịn Traoré kwere nkwa iweghachi ọchịchị ndị nkịtị n’abalị mbụ nke ọnwa Julaị, afọ a.
Mana ka ọ dị ugbua, Burkina Faso esonyerela ndị agbataobi ya bụ Mali n’ịgbatikwu oge ọchịchị ndịagha.
Burkina Faso nọ n’okpuru ọchịchị ndịagha kemgbe ọnwa Jenụwarị 2022 bụ mgbe Lt Col Paul-Henri Damiba napụrụ onyeisiala mba ahụ bụ Roch Kaboré ọchịchị n’ike.
Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati
Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.
Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.
Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.
Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka okwu ụgha.
Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe ike ime nke ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.
Red Cross Orphanage: Gọọmentị Enugwu enyela ụmụaka ndị a ọnọdụ ọhụru ka akụkọ BBC pụtachara
Nwataakwụkwọ onyenkuzi ya pịanyere n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma anwụọla