You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị uweojii ekwuola ka ha si nwuchie ndị 'Unknown Gunmen' kpara mkpa n'Owerri taa

Ndị uweojii ekwuola ka ha si nwuchie ndị 'Unknown Gunmen' kpara mkpa n'Owerri taa

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụmụnne, unu asaala chi ee?

    Taa bụ Nkwọ, Nkwọ biko kwọtara anyị ihe ọma ooo! Iseee!

  2. Ka chi foo nu

    Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa...Rahụ nụ duu!

  3. Nye anyị nde N110, ma ọbụghị ya anyị egbuo ụmụaka a - Ndị tọrọ ụmụakwụkwọ

    Ndị jị ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ Salihu Tanko Islamiyya School ekwuolaa na ka e nye ha nde otu narị na iri tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ndị ahụ.

    Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Alhaji Abubakar Alhassan, onye kwuru na ha kpọrọ ya si na ha nyere ha rue Tuzde iweta ego ahụ maọbụ egbuo ụmụaka ndị ahụ.

    Ndị omekome a kwuru na ha ji ụmụakwụkwọ otu narị na iri ise na isii.

    Alhassan kwuru na ozi a erutela gọọmentị steeti ahụ kama gọọmentị ekwuola kamgbe na ha agaghị akwụ ego ahụ.

  4. Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ enweela nzụkọ maka ọnọdụ ọwụwa anyanwụ

    Ụlọ ntaakụkọ channels edepụtala na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ enweela nzụkọ iji tulee ihe ha ga-eme maka ọnọdụ nchekwa n'ọwụwa anynwụ.

    Ọ bụ maka mwakpo na ọgbaahara nke bụtere ọnwu ndị mmadụ n'ọwụwa anywnụ mere ha jiri nwee ya bụ nzụko.

    Ulọ ntaakụkọ a sị na ọ bụ na ya bụ nzụkọ ka ha kpebiri na ha ga-eme ihe niile iji hụ na ejidere ndị niile na-awakpo ọwụwa anyanwụ.

    Ha katọkwara ogbugbu Ahmed Gulak ma kwee kwa nkwa na ha ga-erute n'isi mmiri iji mata ndị aka ha dị n'ọnwụ Gulak.

    N'Otu aka ahụ ka ha tiri ndị mmadụ nwụnahịrị kamgbe ihe ndia bidoro n'ọwụwa anywnwụ.

    Ha kelere ndị agba ha bụ ndị Gọvanọ steeti mpaghara ugwu maka nghọta ha ma zịgara ezinụlọ Gụlak ozi iti aka n'obi.

  5. Zamfara gọvanọ achụọla ndị imeobi ya n'ọrụ

    Gọvanọ Zamfara steeti bụ Bello Matawalle ekposala imeobi ya ma chụkwa ndị isi ụlọọrụ gọọmentị dị na steeti ahụ.

    Matawalle , onye gbara ama n'ozi o wepụtara n' akara Twitter ya ụbọchị Tuzde, nyere ha ntụzịaka ka ha nyefe ihe gọọmentị dị ha n'aka odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị ha na egbughị oge.

    O nyekwara ntụzịaka ka onye bụbụ Osote onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Ibrahim Tsafe malite ilekọtawa Ministrị na-ahụ maka nchekwa na ihe na-eme n'ụlọ.

  6. 'A ga m apụta ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2023' - Kingsley Moghalu

    Onye bụbu onyeisioche ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụkwara onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2019 n'ọkọrọtọ Young Progressive Party - YPP, Kingsley Moghalu, ekwuola na ya ga-eso zọọ ya bụ ọkwa onyeisiala ọzọ na 2023.

    Ọ dere nke a n'akara Twitter ya taa bụ Tuzde dịka ọ na-akatọ ọchịchị Naịjirịa ma na-ekwu ihe ọ ga-eme ma ọbụrụ na-ahọpụta ya

  7. Ndewonụ Igbo ndịọma!

    Udo diri unu dịka unu na-esonye anyị n'iwetara unu akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ n'ala Igbo nakwa mba ụwa niile.

  8. Gere akụkọ dị mkpa n'otu nkeji

  9. Ọ bụ ogbunigwe arụrụ arụ gbara n'ahịa Mile 3, Rịvas Steeti - Rivers State Police

    Ọ nụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Rivers Steeti bụ Nnamdi Omoni ekwuola na ọ bụ ogbunigwe a rụrụ arụ gbara n'ahịa Mile 3 nke dị na okpuru ọchịchị Port Harcourt, Rivers state.

    Omoni kọwara na ya bụ ogbunigwe gbara dịka otu nwaanyị aha ya bụ Ifenia Aloke eji "Mama Joy" mara mepere ụlọọrụ ya ebe ọ na-ere azụ.

    Ọ kọwara na ya bụ nwaanyị, nwa ya nwoke na otu nwa agbọghọ ọzọ merụrụ ahụ.

    O kwuru na ha na-anata ọgwugwọ ma sị na enweghị onye nwụrụ na ya bụ mkpamkpa.

    Omoni kwuru na ozugbo-ozugbo ka ha zipụrụ ndị ọrụ nchekwa pụru iche na-ahụ maka ogbunigwe na ya bụ ahịa.

    Ndị a mere nyocha ma si na enweghị ogbunigwe ọzọ nọ ebe ahụ.

    N'otu aka ahụ ka kọmịshọna uweojii na steeti ahụ bụ Eboka Friday enyela iwu ka ebido nyochi iji mere ihe kpatara ya bụ ogbunigwe ma nwuchie ndị kpara ya bụ arụ.

    Eboka gwara ndị Rivers State ka ha hapụ ịọtụ ụjọ ma ha gawa mkpa dịịrị ha.

  10. 'Anyị nụrụ ụda egbe n'ụtụtụ a n'akụkụ ebe anyị bi' - Nwa akwụkwọ Imsu

    Ndị agha Naijirịa apụtala site n'ọnụ na-ekwuchitere ha n'Imo steeti bụ Babatunde Zubairu kwuo na ọbụghị eziokwu na ha nwuchiri ma wakpoo ụmu akwụkwọ Imo State University bụ IMSU n'aha ịchafụ ya.

    Nke a na-eme dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia ụnyaahụ n'akọwa na ndị agha Naịjrịa na-awakpo ụlọ ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum Imo Steeti University dị n'Owerri, ma na-akpụrụ ụmụ akwụkwọ.

    Mana otu nwaagbọghọ ya na BBC nwere mkparịtaụka na-akọwa na ya bụ ihe emeghị na mpaghara ebe o bi.

    Kama ọ sị na ndị enyi ya gosiri ya ihe onyonyo na-egosi mgbe ndị agha na-eti ndị mmadụ ihe aghara aghara.

    Mgbe BBC rịọrọ ka o zitere anyị ya bụ ihe onyonyo, ọ sị na ya ga-arịọ enyi ya ahụ nwe ya ka o zitere anyị ya.

    Anyị ahụbeghị ya ruo mgbe akụkọ a pụtara.

    Ya bụ nwaagbọghọ aha ya bụ Chinonso Okoro sị na ya ahụghị ya bụ ihe n'anya mana na ya nụrụ na ntị. Okoro sịkwa na ha anụla ọtụtụ ụda egbe n'akụkụ be ha kemgbe abali ụnyaahụ n'ogige ebe ụmụakwụkwọ bi. Ọ sị na 'anyị nụrụ ụda egbe ọzọ n'ụtụtụ a nke dasiri ike n'akụkụ be anyị a".

    O kwuru na ndị nlekọta anya ụlọ ha kpọchibidoro ha n'ụlọ kemgbe ụnyaahụ maka egwu ndị nwereike ịwakpo ha.

    BBC enwebeghị ike ịnwete ndị isi ụlọọrụ Imsu na ndị agha Naịjria dịka anyị n'akpọ ha oku n'ekwe ntị.

  11. Agbara onyenchịkọ #RevolutionNow bụ Omoyele Sowore egbe taa n'Abụja ka ọ na-eme ngagharịiwe

    Onyenchịkọta #RevolutionNow bụ Omoyele Sowore na onyeisi ụlọọrụ natakụkọ Sahara Reporters natara ahụụfụ n'aka ndị uweojii taa dịka mgbọ egbe chipụrụ ya ahụ n'Unity Fountain dị n'Abuja .

    Sowere depụtara nke na-akara Twitter ya ebe ọ na egosi apa ya bụ egbe n'ahụ ya.

    Ọ gwara ndị otu ya ma ọ dị ndụ, ma ọ nwụrụ anwụ, ha gaa n'ihu na ya bụ agha ha na-ebuso gọọmmentị.

  12. Chelsea na-achọ ịzụghara Lukaku

    Otu egwuregwu Chelsea adịla njikere ịzụghara Romelu Lukaku site n'aka Inter Milan.

    Lukaku nyere goolu 33 iji nyere Inter Milan aka buo iko Serie A nke afọ 2021, mana Inter Milan ga-ere ya ma ọ bụrụ na Chelsea kwụlite ụgwọ.

    Cheta na Lukaku hapụrụ Chelsea n'afọ 2014 gawa West Brom, mechaa gafee Everton, tupu ọ gafee Manchester United wee sizie ebe ahụ gawa Inter Milan.

    Ọ bụrụ na Chelsea zụta Lukaku n'afọ bọọlụ na-abịa abịa, a na-eche na Tammy Abraham na Olivier Giroud nwereike ịhapụ otu ahụ.

  13. Mba Chaịna akwụsịla iwu mmadụ ịmụ naanị ụmụ abụọ

    Mba Chaịna etinyela iwu ọhụrụ nke kwuru na dị na nwunye nwere ike ịmụzu ụmụ atọ ugbua, dịka ha chọpụtara na ọnụọgụgụ mba ahụ na-aagbadazi agbada.

    Ọ bụ Onyeisiala Xi Jinping nyere nkwado maka nke a n'ọgbakọ ndị isi ọchịchị mba ahụ nwere n'ọdị nso a.

    Chaịna nweburu iwu nke ha malitere n'afọ 1979, nke kwuru na mmadụ agaghị amụkarị otu nwa.

    Mana n'afọ 2016, ha megharịrị iwu ahụ wee kwuo na mmadụ nwere ike ịmụ abụọ.

    N'agbanyeghị nke a, ọnụọgụgụ ndị mba ahụ agbaliteghị etu e chere, nke mere ka ha tinye iwu ọhụrụ a.

  14. ECOWAS achụpụpụla mba Mali

    Otu Ecowas achụpụla mba Mali n'otu ahụ n'ihi nchutu ndị agha mba ahụ chụturu Onyeisiala ha bụ Bah Ndaw nakwa Praịm Mịnịsta ha bụ Moctar Ouane.

    N'ọgbakọ Ecowas e mere na mba Ghana n'ụbọchị Sọnde, ha nyere ndị agha ahụ iwu ka ha họpụta Praịm Mịnịsta onye nkịtị, bụ onye ga na-achịkọta mba ahụ ruo ọnwa iri na asatọ tupu e mee ntuliaka n'ọnwa Febrụwarị afọ ọzọ.

    Ecowas kwuru na ọ dị mkpa ka mba Mali nọrọ n'udo iji hụ na-achụpụrụ ndị oyi ndụ egwu na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.