Naịjirịa na Cameroon ga-ezute onwe ha n'asọmpi enyi na enyi n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Jun, nakwa ụbọchị Tuzde, abalị asatọ nke ọnwa Jun afọ 2021.
Nke a ga-eme ya nke ugboro 23 na 24 mba abụọ a na-ezute onwe ha n'asọmpi bọọlụ.
Kamgbe afọ 2000, Cameroon emeribeghị Naịjirịa n'asọmpi bọọlụ, mana ọtụtụ na-ekwu na nzute nke a ga-akpụ ọkụ n'ọnụ.
Etu ị ga-esi lee asọmpi a
Ya bụ asọmpi ga-adị n'obodo Vienna nke bụ isi obodo mba Austria.
Ọ bụ n'elekere asatọ n'ọkara nke abalị Fraịde ka ya bụ asọmpi ga-ebiri ọkụ.
Ụlọọrụ mgbasaozi egwuregwu bụ Super Sports kwuru na ha ga-egosi asọmpi a n'akara 204.
Ugboro ole Naịjirịa na Cameroon zuterela onwe ha
Oge ọbụla Naịjirịa na Cameroon zutere onwe ha n'asọmpi bọọlụ, ọ na-adị ka ebe enyi abụọ gbara mgba.
Mba abụọ a so na mba ndị kacha agba bọọlụ na mpaghara Afrịka niile.
Lee ugboro ole mba abụọ a zuterela:
-
26 Apr 1960 Nigeria 0-0 Cameroon, Asọmpi enyi na enyi
-
08 Dec 1962Nigeria 3-1 Cameroon Nkrumah Cup
-
15 Apr 1963 Cameroon 1-3 Nigeria Asọmpi enyi na enyi
-
31 Aug 1967 Nigeria 1-1 Cameroon Asọmpi enyi na enyi
-
07 Dec 1968 Nigeria 1-1 Cameroon Ntozu oke makaIko mba ụwa
-
22 Dec 1968 Cameroon 2-3 Nigeria Ntozu oke makaIko mba ụwa
-
22 Jan 1975 Nigeria 1-0 Cameroon Asọmpi enyi na enyi
-
17 Jul 1978 Nigeria 0-0 Cameroon Asọmpi mpaghara Afrịka
-
02 Feb 1980 Nigeria 0-0 Cameroon Asọmpi enyi na enyi
-
18 Mar 1984 Cameroon 3-1 Nigeria Iko mba Afrịka
-
17 Mar 1988 Nigeria 1-1 Cameroon Iko mba Afrịka
-
27 Mar 1988 Cameroon 1-0 Nigeria Iko mba Afrịka
-
10 Jun 1989 Nigeria 2-0 Cameroon Ntozu oke makaIko mba ụwa
-
27 Aug 1989 Cameroon 1-0 Nigeria Ntozu oke makaIko mba ụwa
-
25 Jan 1992 Nigeria 2-1 Cameroon Iko mba Afrịka
-
07 Aug 1997 Nigeria 1-0 Cameroon G Cup
-
13 Feb 2000 Nigeria 2-2 Cameroon Iko mba Afrịka
-
01 Jun 2003 Nigeria 3-0 Cameroon G Cup
-
08 Feb 2004 Cameroon 1-2 Nigeria Iko mba Afrịka
-
11 Oct 2015 Nigeria 3-0 Cameroon Asọmpi enyi na enyi
-
01 Sep 2017 Nigeria 4-0 Cameroon Ntozu oke makaIko mba ụwa
-
04 Sep 2017 Cameroon 1-1 Nigeria Ntozu oke makaIko mba ụwa
-
06 Jul 2019 Nigeria 3-2 Cameroon Iko mba Afrịka