You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Etu ndị omekome si wakpoo ụlọ onye enyemaka Buhari

Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola etu ndị omekome si wakpoo ụlọ onye enyemaka Buhari a na-akpọ ọkammụta Ibrahim Gambari.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa and Chimamaka Ihenacho

  1. UEFA Champions League: "Biko sị bunyezia anyị iko Champions League" - Ndị nkwado Chelsea

    Dịka otu Chelsea meriri Real Madrid iji tozuo ịgba asọmpị nke ikpeazụ UEFA Champions league.

    Ọtụtụ ndị na-akwado otu Manchester City na Chelsea nọ n'aṅụrị dịka ọ bụ otu abụọ a ga-asọ asọmpị ikpeazụ UEFA Champions League.

    N'Golo Kante

    N'Golo Kante egosila ihe o ji bụru dịke maka mbọ ọgbara iji hụ na otu Chelsea sụpịara Real Madrid ka agbịshị.

    Ndị nkwado Chelsea nọ na-aṅụrị maka nwa amadị a.

    Kante ritere nturuugo dịka onye kacha gbaa mbọ na ya bụ asọmpị nke a na-akpọ 'Man Of the Match" na bekee.

    Nke a na-eme ya ụgboro abụọ ọ na-erite ya n'usoro.

    Lee ka ndị mmadụ sị aṅụrị

  2. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  3. A tọhapụla ụmụakwụkwọ mahadum ọrụ ugbo 29 fọrọ afọ

    Ụmụakwụkwọ 29 nke mahadum ọrụ ugbo dị na Kaduna fọrọ afọ na ndị a tọọrọ e nwerela onwe ha taa.

    Abdullahi Usman bụ onyeisi kọmitii ndị nne na nna mere ka a mata nke a sị na a tọhapụrụ ha n'ụbọchị Tusde.

    Ọ sị na a tọhapụrụ ndị a mgbe o ji nkeji ole na ole gafee elekere anọ nke mgbede na gburugburu obodo Kidanda dị n'okpuruọchịchị Giwa nke Kaduna Steetị.

    Mana Usman ekweghi ekwu ego ole a kwụrụ ndị ekperima a tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ndị a.

    Ndị ọrụ nchekwa nakwa nke gọọmentị ekwubeghi okwu ọbụla banyere nke a.

  4. Nkeji Coronavirus

  5. Olisa Odukwe: Ndị uweojii Ịngland achọtala ozu otu nwoke

    Ndị uweojii na-achọ nwata akwụkwọ Olisa Odukwe a na-eche na o furu efu ahụtala ozu otu nwoke na mmịri nọ na Bristol.

    Olisa Odukwe gbara afọ iri abụọ na-efu efu.

    Mgbe ikpeazụ ahụrụ ya bụ n'ụtụtụ Satụde dịka o si ụlọ ya apụ.

    Ndị na-egwu mmiri nke Avon na ndị uweojii Somerset bụ ndị gụpụtara ozu otu nwoke na-ekwu na ha echeghị na e nwere ihe nrurụaka na ya .

    A na-eche ka ezinụlọ Odukwe bia mara ma ozu agụpụtara na mmiri ma ọ bụ nke Olisa Odukwe.

  6. Baba Ijesha latest news: Gọọmentị Legọs steeti akwadola ịkpọpụ Olarenwaju James ụlọikpe

    Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ha akwadola ịkpe Prima Facie megide Olarenwaju James eji Baba Ijesha mara.

    Ọ bụ usoro agba ikpe ise dịka iwu ndị omekome nke legọs steeti siri dị ka eji akpopụ ya ụlọikpe.

    Nke a na-eme dịka ndị uweojii nwuchiri Olarenwaju maka ebubo mwakpo n'ụbọchị iri atọ nke afọ 2021.

    Ọ bụ ọkaikpe kachasị na Legọs steeti bụ Moyosore Onigbanjo binyere aka na ya bụ akwụkwọ eji akpọpụ ya ụlọikpe.

    Lee usoro ikpe ise eji akpọpụ ya ụlọikpe -

    • Section 135 - ịkpasọ nwatakịrị agwa ọjọọ nke oge nga ya ruru afọ asaa.
    • Section 137, ịwakpo nwatakịri ogbede nke oge nga ya bu nga mkpụru ọka
    • Section 261, Iji mwakpo ịdịna n'ike nke oge nga ya bu nga mkpụru ọka.
    • Section 262, ị chọ iji ịdịna n'ike wakpoo mmadụ nke oge nga ya bụ afọ iri na anọ.
    • Section 263, mwakpo ịdịna n'ike nke oge nga ya bụ afọ atọ.
  7. Owoo owoo! Nwaanyị mba Mali amụọla ụmụ itolu otu mgbe

    Nwaanyị Mali bụ Halima Cisse onye gbara afọ iri abụọ na ise amụọla ụmụ itolu n'otu mgbe n'ụbọchị Tuzde.

    Ọ mụru ụmụnwaanyị ise na ụmụ nwoke anọ n'ụloọgwụ dị na mba Morocco.

    A wara ya bụ nwwanyị afọ nke bụ Caesarean n'okwu bekee were wepụta ya bụ ụmụ ọhụrụ.

    A na-atụanya na ọ bụ ụmụ asaa ka ọ ga-amụ, kama igwe na-enyocha ahụ ahụghị abụọ ndị nke ọzọ.

    Mịnịsta ahụike mba Mali bụ Fanta Siby kwuru na ahụ dị ya bụ nwaanyị na ụmụ ya mma.

  8. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  9. Ndụmọdụ Pius Anyim nyere Onyeisiala Buhari maka ọnọdụ Naịjirịa

    Onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu bụ Pius Anyim enyela Onyeisiala Buhari Muhammadu ndụmọdụ ihe ọ ga-eme iji kwụsị mkpa mkpa na-eme na Naịjirịa ugbua.

    Ọ sị ka onyeisiala Buhari hiwe kọmitii ga-eleba anya ma chọpụta ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji ewe iwe na Naịjirịa.

    Ọ sị na nke a dị n'akwụkwọ Willink wepụtara n'oge Naịjirịa nwere onwe ha n'aka gọọmentị Briten n'afọ 1960.

    Pius sị na nke a ga-eme ka ọnọdụ okpomokụ a dị na Naịjirịa kwụsị ma nye ohere ịgbanwe echiche.

    Ọ sị na ọ ga-eme ka obi ruo ndị mmadụ ala n'ebe Naịjirịa iji kwụpụta obi ha n'uju nakwa ihe ndị ọzọ.

  10. 'Etu nsogbu Covid-19 n'India si metụta anyị bụ ndị Igbo bi ebe ahụ'

    Ọrịa coronavirus na-akpa mkpamkpa na mba India ugbua.

    Otu nwa afọ bi mba ahụ kọwarala BBC Igbo etu ihe si kwụrụ ugbua n'obodo ahụ.

  11. Nne na nna ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Kaduna emeela ngagharịiwe

    Ndị nne na nna na ụmụakwụkwọ 'Federal College of Forestry Mechanisation' dị n' Afaka na Kaduna steeti emeela ngagharịiwe n'Abuja ụbọchị Tuzde iji bekuo gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka zọpụta ụmụ ha n'aka ndị ntọ ji ka ha.

    A tọọrọ ụmụakwụkwọ ruru 39 n'abalị iri na otu nke ọnwa Maachị afọ 2021 mana e mechara ise n'ime ha nwere onwe ha.

    Gọọmentị Kaduna kwuru na ha agaghị akwụ ego ọbụla iji gbapụta ndị a nwụchiri.

    N'aka nke ọzọ, ndị ntọ ahụ nyere ha rue... iji weta ego ahụ maọbụ ha egbuo ha.

    Otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọbụrụ mana a tọhapụrụ ya bụ Obadiah Habakuk kwuru na anya ya hụrụ ntị ya tupu a tọhapụ ya.,

    O kwuru na ọ bụ n'ime abalị ebe Elekere iri na abụọ ka ha dere edere bịa tọọrọ ha. Ma na-ezugharị ha n'ime ọhịa.

    Otu nwaanyị so na ndị a tọrọ nwa ya kwuru na " Anaghị m arahụzi ụra. Ha gwara m weta nde naira 25 Na mbụ. Abụ m nwaanyị ajadu. Ọ bụrụ na m nwere ụdị ego ahụ, nwa m ga-anọ alabekee na-agụ akwụkwọ."

    O kwuru na ha mechara kpọ ya sị ya weta nde naira 15.

  12. Ndị agha Naịjirịa ekweela nkwa irubeisi na gọọmenti onyekwuo uche ya

    Ndị agha Naịjirịa ekweela nkwa na ha ga-erubere gọọmenti ọchịchị onyekwuouche ya isi ya na onyeisiala Naịjirịa mgbe ọbụla.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Onyema Nwachukwu kwuru nke a na nzaghachi ebubo otu onye boro na ndị agha chọrọ ka ndị nkiti nyefee ha ọchịchị maka ịhazigharị Naịjirịa

  13. Gọọmentị etiti emepela ụlọọrụ ọhụrụ ọzọ akpọrọ National Centre for the Control of Small Arms and Light Weapons (NCCSALW)

    Ụlọọrụ onyeisiala etinyela aka n’akwụkwọ maka ịmalite ụlọọrụ ọzọ gana elebeanya n’ọrụ gbasara ọbere egbe na ụmụakụrụngwa ndị ọzọ eji alụ ọgụ.

    Ọ bụ onyendụmọdụ maka ọrụ nchekwa ka Naịjirịa bụ Zakariya Usman kwuputere nke a n’Abuja ụnyaahụ bụ Monday.

  14. India sị na ọnụọgụ ndị bu nje coronavirus adawala dịka ọ rugoro nde 20 mmadụ bu ya bụ nje

    Ọnụọgụ ndị bu nje coronavirus na India aruola nde iri abụọ agbanyeghị na gọọmenti mba ahụ sị na ọ dawala.

    Ọnụọgụ ndị butere ya bụ nje na mba ahụ na-agbada kemgbe ụbọchị iri atọ nke ọnwa Epreelu mgbe ọnụọgụ ha karịrị narị puku anọ (400,000) kwa ụbọchị. Ụbọchị Tuzde gara aga ka ọ gbadaruru narị puku atọ, iri ise na ise, na narị asatọ iri atọ na abụọ (355,832) ụbọchị Tudze.

    Ndị ọkacha mara na ekwu na ọnụọgụ ndị ahụ ana agụpụta erughị ihe ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje.

    N'isiobodo ha bụ Delhi, ụkọ "Oxygen" ka na anyụ ha ịkpakwụ, enweghịkwa ihe na-egosi na ọ ga-ebi nso nso a.

    Ọnụọgụ si na Delhi pụta na-egosi na mmadụ narị anọ, iri anọ na asatọ (448) anwụọla ụbọchị Mọnde n'aka ya bụ ọrịa.

  15. Mmadụ 15 anwụọla ebe akwa okporoụzọụgbọ gbajiri na Mexico

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na mmadụ iri na ise anwụọla n'ihe mberede mere na okporoụzọ ụgbọ na Mexico.

    Ụgbọoloko ahụ kụjiri si n'elu akwa okporoụzọ ahụ dapụ kụpịa otu ụgbụọala ha dakwasara.

    Ndị ọrụ gbatagbata na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ gbagara ebe ahụ ihe ahụ mere na-anwa oko ha ịzọpụta ndị tọrọ ebe ahụ kemgbe Mọnde.

    Ihe onyonyo pụtara na-egosi otu ya bụ ụgbooloko siri gbajie n'ọdọụgbọoloko dị n'Olivos n'ahịrị iri nke iri na abụọ.

    Onyeisioche okpuruọchịchị Mexico City bụ Claudia Sheinbaum kwuru nke a dị ka ụlọrọntaakụkọ AFP kwuru.

    Ọ sị "Ọ dị mnwute na mmadụ iri na ise etufuola ndụ ha n'ihe mberede a".

    Ndị ọrụ gbatagbata sị na mmadụ iri asaa meruru ahụ na ya bụ ọgbatauhie.

    A na-atụegwu na ndị ọzọ ka nwekwaraike ịnwụ maka na ndị mmadụ ka nwereike ịke ịtọ ebe ahụ.

  16. Nkeji coronavirus

  17. Goomentị na-elebanye na nwuchi ụmụ Naịjirịa na mba Gana

    Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na ụlọọrụ gọọmentị na Gana bna-eleba anya anya n'akụkọ banyere nwuchi ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na mba ahụ.

    Ọ sị na ọtụtụ ndị Naịjirịa si n'ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ gbagara na mba Gana si n'ụlọ na-ezighi ezi na ọ bụ ya kpatara nwuchi ụmụ Naịjirịa na mba ahụ.

    Dabiri-Erewa sị na ụlọọrụ gọọmentị etiti dị na mba Gana etinyela ọnụ n'okwu ahụ.

    Cheta na ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa nọ n'otu ogige bụ ebe a sị na ndị nchekwa Gana nwuchiri ha.

  18. Ndịagha Naịjirịa sị ha nyere ndị Boko Haram ọsọ na Borno Steetị

    Ndịagha Naịjirịa nke ngalaba 'Operation Hadin Kai' nke Borno Steetị sị na ha egbochiela mwakpo ndị Boko Haram chọrọ ime n'obodo Rann dị n'okpuruọchịchị Kala Balge nke steeị ahụ.

    Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Mohammed Yerima wepụtara n'ụbọchị Mọnde 3 Mee, afọ 2021.

    Ha sị na ndị a chọrọ ime mwakpo a n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2021 mana ndịagha gbochiri ha site na nkwarịta egbe ha nwere nke were ihe dịka otu awa.

    Nke a mere Boko Haram ji rie mbọmbọ ọsọ dịka ọtụtụ n'ime ha merụchara ahụ n'ebe dị iche iche.

    Ndị Boko Haram a hapụrụ ngwa ọgụ ha gụnyere egbe, ogbunigwe, igwe nzirita ozi.

    N'aka nke ọzọ, ha wakpokwara obodo ọzọ a kpọrọ Ajiri dịkwa na Borno Steetị gbuo ụfọdụ mmadụ ma gbaa ụlọ itoolu ọkụ.

    Mana ndịagha sị na ha chụrụ ndị a ọsọ ma merụọ ọtụtụ ndị otu ha ahụ, ebe ndịagha mmadụ abụọ nwụrụ n'ihi nke a.

    Onyeisi ndịagha bụ Ibrahim Attahiru etoola ndị otu ya maka isiakwara ha gbara n'ibuso ndị Boko Haram agha nakwa ichekwa ogige ahụ.

  19. Ndị ekperima ekwuola na ha ga-egbu ụmụ akwụkwọ ha tọọrọ na Kaduna

    Ndị ekperima aṅụọla iyi na ha ga-egbu ụmụakwụkwọ ndị ha tọọrọ n’ụlọọakwụkwọ Mahadum Greenfield dị na Kaduna ma ọ bụrụ na gọọmentị Kaduna steeti enyeghị ha ihe ha chọrọ.

    Ndị ekperima a kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ Voice of America kpọrọ onyeisi ha n’ụbọchị Mọnde.

    Onyeisi ndị ekperima ahụ nke kpọrọ onwe ya Sani Idris Jalingo kwuru na ọ bụ n’ụbọchị Tusde ka ha ga-egbucha ụmụakwụkwọ iri na asaa ahụ ha ji, ma ọ bụrụ na gọọmentị enyeghị ha ihe ha na-achọ.

    Jalingo kwuru na ihe ha chọrọ n’aka gọọmentị bụ otu narị nde naịra (N100 million) nakwa ọgbaatumutum ọhụrụ dị iri n’ọnụọgụgụ.

    Cheta na ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ Mahadum Greenfield n’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Eprel ma tọrọ ụmụakwụkwọ dị iri abụọ na abụọ n’ọnụọgụgụ.

    Ha mechara gbuo mmadụ ise n’ime ụmụakwụkwọ ahụ ma tụpụta ozu ha n’ime ọhịa, ugbua, ha ekwuola na ha ga-egbukwa ndị ọzọ.

    Gọọmentị Kaduna ekwuola na ha agaghị akwụ ndị ekperima ụgwọ ọbụla iji tọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ.

    Gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna kwuru na onweghị ihe ga-eme kaya kwụọ ndị ekperima ụgwọ, kama ọ bụ naanị ọnwụ kwesịrị ha.

  20. Paul Pogba a ga-ekwe ịnọtukwu na

    N’asịrị gbakaa ute egwuregwu taa anyị na-anụ na Manchester United amalitela mkparịta ụka maka iji ego dị nde pound anọ kwa izu dọtikwuo nkwekọrịta ya na Paul Pogba ma okwe ị nọtukwu ebe ahụ.