A chọpụtala ndị niile na-enye Imo Steetị nsogbu - Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steetị sị na a ga-agba aha ndị na-enye steetị ya nsogbu n'anwụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Goodluck Jonathan, gbaghara ụmụ Naijiria maka ikwujọ gị - J.Martin

    Goodluck Jonathan na J.Martins

    Ebe foto si, Goodluck Jonathan/J.Martins

    Otiegwu a ma ama bụ Martins Joshua Kalu a ma dịka J.Martins ebekuola aka chịbụrụ Naijiria bụ Goodluck Jonathan ma rịọ ya ka ọ gbaghara ụmụ Naijiria maka mkparị niile e nyere ya n'oge ọ nọ na-ọchị chị ma kpere Naijiria ekpere ngọzị.

    O kwupụtara nkwenye ya na n'agbanyeghị na Jonathan abụghị ụkọchukwu na Chukwu ga-aza ya ekpere dịka nna ma weghachi udo na Naijiria.

    N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, J.Martins,jụrụ JOnathan sị, "Inwere ike ịgbagha ndị niile lapụtara gị n'ụzọ ghara gị ma si n'ala obi gị gozie Naijiria?"

    J.Martin boro ebubo na ihe na-eme ugbua na Naijiria dịka o si metụta nchekwa obodo na nrụrụaka ka njọ ugbua karịa oge Jonathan nọ n'ọchịchị.

    "O nweghị akụkụ Naijiria ebe e nweghị mwakpo. Ọ bụghị ndị ekperima, ọ bụrụ ndị ntọ maọbụ ndị Boko Haram maọbụ igbusisi ndị ọrụ nchekwa, ụdị ihe a nubeghị mbụ bụzị ihe na-eme kwa ụbọchị."

    Echiche J.Martin na-apụta dịka akụkọ mwakpo ndị uweojii na ogige ha na-arị elu na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ, ebe ntọ na ndị Boko Haram weghara ọnọdụ na mpaghara Ugwu.

    J.Martins tụkwara arịrị na nrụrụaka nke a a na-eti mkpu ya oge Jonathan atụrụla ime mụa enyima n'oge ọchịchị ugbua mana boo ebubo na ndị mmadụ na-eme anya ka ha ahụghị ihe na-eme.

    O kwukwara na ikike onye ikwu uche ya bụzịkwa ihe e kechiri ekechi.

    Ozi si n'aka J.Martins

    Ebe foto si, @OfficialJmartins

  2. A wakpoola 'Federal High Court' dị n'Abakaliki Ebonyi steeti

    Federal High Court Abakaliki

    Ndị omekome awakpola ụlọikpe gọọmenti dị n'okporoụzọ Abakaliki- Enugu dị n'Ebonyi steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odah kwuru na mwakpo a mere n'abalị ụnyahụ.

    O kwuru na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ ọdachị.

    Kedụ ka o si mee?

    Odah gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị omekome ahụ mụnyere ọkụ n'ụlọikope ahụ mana ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ gbatara ozugbo menyuo ya bụ ọkụ.

    Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo jụrụ ya maka akụkọ kwuru na e gburu ndị agha abụọ, Ọ da kwuru na ọ bụ ndịagha nwere ike ịsa ya bụ okwu.

    Federal High Court Abakaliki
    Nkọwa foto, Federal High Court Abakaliki
  3. 'Anyị nụrụ nnukwu ụda egbe na-ada na Douglas dị n'Owerri'

    Okporoụzọ Douglas

    Ndị bi n'Imo steeti agwala BBC Igbo etu ha si nụ nnukwu ụda egbe abalị ụnyahụ bụ Epreelụ 26, 2021.

    Ha kwuru na ha bidoro nụwa ụda egbe n'elekere itoolu nke abalị ụnyaahụ mana o mechara dajụọ.

    N'ụtụtụ a, otu onye bi n'ogbe ahụ kwuru na ndị uweojii egbochiela ebe ahụ mana ndị mmadụ ka na-agagharị na-enweghị mgbochi ọbụla.

    Douglas Road
  4. Ndewonu Ụmụ Igbo

    Nonyere anyị taa ka ịmata akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ.

    Daalụ.

  5. Ka chi fo!

    Daalụ nu maka isonye anyi taa.

    Anyị ga-ahụ echi

  6. E gbuola ụmụ akwụkwọ abụọ ọzọ si na Mahadum Green na Kaduna

    Mahadum ahụ

    Ebe foto si, https://gfu.edu.ng/

    Gọọmentị Kaduna steeti ekwuola na ozi ha nwetara bu na ndị omekome tọrọ ụmụakwụkwọ na Mahadum Green dị na Kaduna steeti n'izu gara aga egbuola mmadụ abụọ ọzọ.

    Ha kwukwara na eburula ozu ụmụakwụkwọ ahụ buga na ụlọozu dịka Gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai zigara ezinaụlọ ha ozi itiakanobi.

    Cheta na egburu ụmụakwụkwọ atọ so na ndị atọrọ n'ehihie ụbọchị Fraịde dịka ndị ntọ ahụ na-achọ ka gọọmentị Kaduna steeti nye ha ego.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Gọọmentị Anambara etinyela mmachi ngagharị n'Igbarịam, Ọkụzụ, Aguleri, Umueri, Nteje nakwa Ụmunya

    Onye odeakwụkwọ Anambara steeti bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kwuru na gọọmentị steeti ahụ etinyela mmachị ngagharị n'Igbariam, Aguleri, Umueri, Nteje, Awkuzu nakwa Umunya.

    Ọ sị na mmachị ngagharị ahụ ga-amalite taa bụ Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Epreelụ ga-amalite elekere asaa nke ehihe ma kwụsị elekere ise nke ụtụtụ.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ Anambra Broadcasting Service siri dee, gọọmentị Anambara na-ekwusike ka ndị mmadụ rubere mmachị ngagharị a isi dịka ndị ọrụ nchekwa nwere iwu ịrụsị ọrụ ha ike.

    Nke na-abịa dịka ndị amabeghị ndị ha bu wakpochara mpaghara Igbariam Junction ma gbuo ihe ruru mmadu itoolu dịka ndị uweojii siri kwuo.

  8. Ọgbaghara adaala na Legọs dịka ndị okada na ọgbakọ ọkwọ ụgbọala na-ese okwu

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ụfọdụ ndị otu ndị na-anya ọgbatumtum na ndị na-akwọ ụgbọala nwere ọgbaghara na Legọs steeti.

    Akụkọ a kwuru na ya bụ ọgbaghara na-eme na mpaghara Iyana Iba dị na Legọs.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Henry na Shearer abanyela na ndị agaghị echefu na Premier League

    Thierry Henry na Alan Shearer abụrụla ndị egwu bọọlụ mbụ a na-etinye na Premier League Hall of Fame.

    Mara na Shearer bụ onye kacharala nye goolu na Premier League.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  10. Foto: A gbaghị ụlọomeiwu Imo steeti ọkụ

    Dịka akụkọ na-efegharị na ndị omekome mụnyere ụlọomeiwu nke Imo steeti dị n'Owere, ọkụ n'abalị, BBC Igbo achọpụtala na ọ bụghị eziokwu.

    Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ n'ụtụtụ Mọnde, 26 nke Epreelụ 2021, wee hụ na ụlọ niile dị ebe ahụ ka kwụ chịm, na-enweghi ebe ọkụ gbara.

    Lee ihe ọ hụrụ ebe ahụ:

    Ụlọomeiwu Imo steeti
    Ụlọomeiwu Imo steeti
    Ụlọomeiwu Imo steeti
    Ụlọomeiwu Imo steeti
  11. India na-arịọ enyemaka maka mkpamkpa covid 19 na-akpa ebe ahụ ugbua

    Ndị India na-achọ enyemaka

    Ebe foto si, Reuters

    Ọtụtụ ụlọọgwụ nọ na Delhi nakwa obodo ndị ọzọ dị n’India enweghị akwa ndịna maka ọgwụgwọ ọrịa covid 19.

    Nke a mekwara ka ọtụtụ mmadụ na-agbalị inweta ọgwụgwọ n’ụlọ ha.

    Mana nke ahụ bụkwa ihe takwuru akpụ makana ọnụ ego igwe na-enye aka iku ume nakwa ọgwụ gbalitere elu karịa pasenti otu narị.

    Nwada Anshu Priya na-agbagharị kamgbe makana mmadụ abụọ metụtara ya na-arịa ọrịa covid 19 n’ebe ọ dị njọ mere o ji achọ igwe ahụ ga-enyere ha aka kuo ume ọfụma.

    O nweteghị ike igoteli igwe ahụ ugbua.

    Ndị India na-achọ enyemaka

    Ebe foto si, Getty Images

  12. Ị bọọla chi?

    Nnọọ dịka ị bịara nọnyere anyị taa.

    Ebe a ka ị ga-ahụ akụkọ ndị ga-amasị gị.

    Ndeewo.