Goodluck Jonathan, gbaghara ụmụ Naijiria maka ikwujọ gị - J.Martin

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/J.Martins
Otiegwu a ma ama bụ Martins Joshua Kalu a ma dịka J.Martins ebekuola aka chịbụrụ Naijiria bụ Goodluck Jonathan ma rịọ ya ka ọ gbaghara ụmụ Naijiria maka mkparị niile e nyere ya n'oge ọ nọ na-ọchị chị ma kpere Naijiria ekpere ngọzị.
O kwupụtara nkwenye ya na n'agbanyeghị na Jonathan abụghị ụkọchukwu na Chukwu ga-aza ya ekpere dịka nna ma weghachi udo na Naijiria.
N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, J.Martins,jụrụ JOnathan sị, "Inwere ike ịgbagha ndị niile lapụtara gị n'ụzọ ghara gị ma si n'ala obi gị gozie Naijiria?"
J.Martin boro ebubo na ihe na-eme ugbua na Naijiria dịka o si metụta nchekwa obodo na nrụrụaka ka njọ ugbua karịa oge Jonathan nọ n'ọchịchị.
"O nweghị akụkụ Naijiria ebe e nweghị mwakpo. Ọ bụghị ndị ekperima, ọ bụrụ ndị ntọ maọbụ ndị Boko Haram maọbụ igbusisi ndị ọrụ nchekwa, ụdị ihe a nubeghị mbụ bụzị ihe na-eme kwa ụbọchị."
Echiche J.Martin na-apụta dịka akụkọ mwakpo ndị uweojii na ogige ha na-arị elu na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ, ebe ntọ na ndị Boko Haram weghara ọnọdụ na mpaghara Ugwu.
J.Martins tụkwara arịrị na nrụrụaka nke a a na-eti mkpu ya oge Jonathan atụrụla ime mụa enyima n'oge ọchịchị ugbua mana boo ebubo na ndị mmadụ na-eme anya ka ha ahụghị ihe na-eme.
O kwukwara na ikike onye ikwu uche ya bụzịkwa ihe e kechiri ekechi.

Ebe foto si, @OfficialJmartins











