Nkeji coronavirus
Lee akụkọ maka coronavirus mere taa.
Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steetị sị na a ga-agba aha ndị na-enye steetị ya nsogbu n'anwụ.
Chioma Obianinwa
Lee akụkọ maka coronavirus mere taa.
Ndị ntọ atọọla ụmụakwụkwọ Capro Secondary Mission School dị na Gana Ropp N'okpuru ọchịchị Barkin Ladi dị na Plateau Steeti n'ụzọ ụtụtụ Tozde.
Ndị nwe ụlọakwwọ ahụ kwuru na mmadụ atọ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ gbalahụrụ ndị ntọ ahụ bụ ndị ntọ bụ ndị e kwuru gbuwara aja ngwụrụ ụlọakwụkwọ ahụ were bata.
Mana otu nwata akwụkwọ ka nọ n'aka ndị omekome ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ụlọakụ na Ebonyi steeti dịka Access Bank, Zenith Bank na FCMB emechiela ụlọakụ ha, ebe ndị dịka UBA,GTB na ndị ọzọ ka na-arụ ọrụ dịka kekepu na-efegharị na ndị ekperima ga-awakpo ụlọakụ na steeti ahụ.
Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Abakaliki wetara ozi gosiri na ndị mmadụ gara ụlọakụ o metụtara enweghị ike ime ihe ha bịara ime n'ụlọakụ n'ihi mgbachi ahụ.

Mana ọnụ na-ekwuru Zenith Bank bụ Ayoola Kassimu kwuru na " amaghị m maka ya".
N'otu aka ahụ ebe ọnụ na-ekwuru Access Bank Abdul Imoyo kwukwara na ya amaghị maka ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ gaghị agbakwoju anya ma ụlọakụ malite imechi n'ihi ọnọdụ nchekwa obodo na steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ndị isi mpaghara ụlọakụ dịga na steeti ahụ na Osote Gọvanọ steeti bụ Eric Kelechi Igwe abanyela nzụkọ ji mata ụzọ a ga-esi akwa nwaanyị ukwu wara.
Cheta na nsonso, Gọvanọ steeti ahụ bụ Umahi tinyere mmachi ngagharị malite n 'Elekere Asatọ nke abali rue Elekere Isii nke ụtụtụ dịka nsogbu nchekwa kawanyere njọ na steeti ahụ.


Ndị o ji egbe wakporo isiụlọọrụ ndị uweojii bụ Divisional Police Headquarter dị na Nkpo n'Okpuru Ọchịchị n' Abia steeti.
Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ mwakpokama a gbara ọgbatutu ndị uweojii nakwa ihe ụfọdụ ọkụ..
N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ndị uweojii gbochiri na ihe e mebighị dịka ndị mere mwakpo ahụ siri kwado.


Ebe foto si, NASS Facebook
Ọgbọ siri ike n'Ulọomeiwu n'Abuja ụtụtụ taa bụ Tọzde dịka ndị ọrụ nchekwa na-enyocha ndị ọrụ nakwa onye ọbịa ọbụla batara n'ogige ahụ.
Nnyocha ahụ kpalitere kpachi kpachi n'ọnụama ogige Ulọomeiwu
Nke a na-abịa dịka a nụrụ kepukepu na ndị Boko Haram na-akpa nkata ịwakpo ebe ụfọdụ n'Abuja.

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-akọwa na a na-eme ntuliaka na mpaghara West Bengal nke mba India na-agbanyeghị na ọrịa covid-19 na-echere ha aka mgba.
Ndị ọkammụta na-eti mkpụ na ya bụ ọrịa ga-agbasa n'ike dịka mmadụ otu puku na narị asaa ebutela ya bụ ọrịa n'otu ụbọchị na West Bengal.
Ntuliaka a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọta ọnụ dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-achụ nta votu.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Amitabha Bhattasali na-ekwu na ọtụtụ ndị mmadụ butere nzụkọ achụmta votu nke ndị ndọrọndọrọ ọchịchi mere nke gụnyere onyeisiala mba ahụ bụ Nrendra Modi eyighị mkpuchi imi ha maọbụ nye mmadụ ibe ha ọhere nke bụ usoro nchekwa maka ọrịa copvid-19.
Soro anyị taa maka akụkọ dị mkpa ga-amasị gị taa niile
E liela otu n’ime ụmụakwụkwọ Greenfield Univsersity ndị omekome gburu na Kaduna steeti.
A kaara Dorothy Tirnom Yahana ụka ikpeazụ n' ECWA Goodnews dị na Narayi High Cost dị na steeti ahụ taa bụ Wenezde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Gọọmentị etiti etinyela aka n’akwụkwọ maka ịmalite atụmatụ ga-akwalita ụmụ ogbenye, ha kporọ 'National Poverty Reduction with Growth strategy".
Ha kpebiri maka atụmatụ a n’ọgbakọ ndị isiọchịchị nke onyeisiala Mohammadu Buharị nọ n’isi ya n’Abuja taa bụ Wenezde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Bashir Ahmad

Ụlọakụ ndị omekome wakporo n'Ezza nọtụ dị n'Ebonyi steeti na mgbede ụnyahụ bụ Epreelụ 28, 2021 ka gbachiri agbachị.
Onye nta akụkọ BBC chọpụtara na ndị omekome wakporo ụlọakụ UBA dị n'ebe a na-akpọ Onueke nakwa ụlọ onye dibia mgbọrọgwụ dị n'okpuruọchịchị Ezza nọtụ.
Ndị omekome ahụ gbara onye si n'ụlọakụ apụta egbe, mgbe ndị uweojii chụwara ha, ndị omekome ahụ gbagbuo otu n'ime ndị uweojii.
Ndị omekome ahụ mechakwara gaa wakpoo ụlọ onye dịbịa ngbọrọọgwụ,gba ụgbọala ya abụọ ọkụ, zuru ego ruru naira puku narị atọ na puku iri ise ma merụọ ya na onye bi na bee ya ezigbo ahụ.
Kọmịshọna ọrụ nchekwa kwuru na ha na-eche na ọ bụ ndị ama ndị ha bụ ji egbe biara kpa mkpa mkpa ahụ.



Ebe foto si, Getty Images
Ndị oji egbe egbuola ndị ntaakụkọ abụọ si mba spain na otu onye ọzọ sị mba Ireland n'ụbọchị mọnde na mba Burkina Faso.
Ọ bụ n'ogige nchekwa ụmu anụmanụ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Burkina Faso ka e gburu ndị a.
Praịm Mịnịsta mba Spain bụ Pedro Sanchez toro ndị ntaakụkọ a maka mbọ ha gbara ime akụkọ na-agbanyeghị na ndị otu oyi egwu na-akpa mkpamkpa ebe ahụ.
Ọ bụ mgbe ha na-eme ngagharị ịchekwa ogige ụmụ anụmanụ a ka ha zutere ndị gburu ha.
Gọọmentị Burkina Daso kwuru na ndị a tọọrọ otu onye agha mba ha.
Burkina Faso na-aluso ndị otu oyi egwu ọgụ na mba ha.
Floyd Mayweather bụ ọkaibe n'ịku ọkpụ na Logan Paul bụ onye na-eme ihe onyonyo na Youtube ga-ezute onwe ha n'ụbọchị isii nke ọnwa Jun afọ 2021.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a ga-eme ya ugboro abụọ Mayweather na onye na-abụghị onye na-akụ ọkpọ ga-alụ ọgụ.
Mayweather onye gbara afọ iri anọ na anọ kwụsịrị ịkụ ọkpọ n'afọ 2017 dịka ọ lụrụ ọgụ ugboro iri ise ma enweghị onye meriri ya.

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom arịọla onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ nye ha ikike ịzụta egbe ha ga-eji chekwaa onwe ha.
O kwuru nke a mgbe ọ gara ịleta ndị na-eme ngagharịwe maka ogbugbu mmadụ asaa n'ogige gbatagbata dị n'Abagana na steeti ahụ n'ụbọchi Tuzde n'aka ndị echere bụ ndị ọchịehi.
Ndị a na-eme ngagharịiwe ji ozu mmadụ asaa a egburu dochie okporo ụzọ jịkọrọ Markurdi na Lafia.

Ebe foto si, Getty Images
Mba Ịndịa nọ na gbaharịa dịka ndị nwụrụla site n'ọrịa covid-19 na mba ahụ akarịala mmadụ puku narị abụọ n'ụbọchị Tuzde.
Gọọmentị mba ahụ na-ekwu na nke a bụ mbụ ihe karịrị mmadụ puku atọ na-anwụ n'otu ụbọchị n'aka ya bụ ọrịa na mba ahụ.
Ha na-ekwu kwa na mmadụ nde abụọ butere ya bụ ọrịa n'ime otu izuụka.
Ịndia bụ onye nke anọ n'ime mba ọrịa covid-19 kacha awakpo.
Amerịka bụ mbụ, sotewe Brazil na Mexico.
Kama n'ime mba ndị a niile, ọ bụ Ịndịa ka ya bụ ọrịa kacha anyụ anya.

Ebe foto si, Reuters
Covdi-19 nke B. 1.617
Ngalaba World Health Organisation ekwuola na ahụtala ọrịa covid-19 nke a na-akpọ B.1.617 ebu ụzọ hụ na mba Ịndia na mba iri na asaa ndị ọzọ,
WHO kwukwara na ya bụ ọrịa covid-19 ọhụrụ nwere mgbanwe ruru otu puku, na narị abụọ bụ na mba Ịndịa,
Briten, Amerịka na Singapore ka ha o siri pụta.
Soro anyị taa maka akụkọ niile dị mkpa dịka o si akpọtụ

Ebe foto si, Bashir Ahmed
Mba Amerịka ekwuola na ha na-ele anya ihigharị isiụlọọrụ agha ha hiwere maka inyere mba dịga n'Afrịka(US AfricaCommand) aka bute ya na mpaghara Afrịka ebe nsogbu nchekwa na-akpọtụ akpọtụ.
Odeakwụkwọ Ukwu mba ahụ bụ Anthony Bliken kwuru nke a taa n'ọgbakọ ya na Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enwere n'ikuku na Naijiria ebe ha kpara maka mmekọrịta mba abụọ ndị a.
" Nsogbu nchekwa na-arị elu na ọdịdịa anyanụ na etiti Afrịka, Gulf nke Guinea, mpaghara Lake Chad na ọzara Sahel na-anyịdo Afrịka mee ka ọ dị mkpa na anyị butere isi ụlọọrụ AFRICOM dị na Jamini n' Afrịka."
N’otu aka ahụ, Buhari kerele onyeisiala Mba Amerịka bụ Joe Biden maka mbọ ọ gbara ka e wepụpụ mmachi etinyere ndị okpukperechi Islam si mba dị iche iche n’Afrịka gụnyere Naijiria ime njem.
Blinken nọburu mbụ gbaa ama na ya na mba Kenya na Naijiria ga-enwe mkparịtaụka ịkpa maka etu a ga-esi akwalite dị na-eto eto.

Ebe foto si, Ahmed Bashir
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Mgbọ egbe a maghị ebe o si atụgbuola otu nwoke dịka ọ kwọ ụgbọala ya aga okporoụzọ 'Bank Road' dị n'Owere isiobodo Imo steeti n'abalị Monde.
Nke a na-abịa otu abali mgbọ tụgbuchara nwata akwụkwọ mahadum a kpọrọ Divine Nwaneri, na mpaghara ahụ.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha amaghị ndị gbara egbe ahụ nke turu nwoke e kwuru bu ụmụanụmanụ aga.
Oge onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ,kwuru na e bupụla ozu ya nakwa ụgbọala ya, ebe ebe niile dere jụụ.
Cheta na kemgbe ndị ji egbe wakporo ụlọ gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma e gbochiri otu akụkụ okporoụzọ Bank Road nke mere na ndị na aga aga ma ndị na-ala ala n'esizi otu akụkọ ala.