"Ọ bụ ekpere ga-azọpụta Naijirịa n'aka ndị Omekome" - Enoch Adeboye

Ụkọchukwu ukwu nke Redeemed Christian Church of God emeela njem nleta na nke gọvanọ Ekiti steeti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. BBC Nkeji

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  2. Igbo ndị ọma

    Anyị ji obi ọma anabata unu n'ụbọchị taa.

  3. Ka chi fo!

    Daalụ nụ maka isonye anyị taa.

  4. Ọkụ eregbuola ụmụ obere ụmụaka ruru iri abụọ na Niger

    Ụlọakwụkwọ gbara ọkụ

    Ebe foto si, BBC/TCHIMA ILLA ISSOUFOU

    Ihe ruru iriri ụmụaka iri abụọ anwụọla n’otu ụlọakwụkwọ dị na Niamey na Niger dịka ọkụ gbara n’ụlọakwụkwọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ nọchiri ụzọ nke mere na ụmụaka ahụ agbapụghị ọsọ mgbe o bidoro.

    Ihe ọzọ pụtara ihe bụ na ọkụ ahụ malitere n'ehihie ụbọchị Tuusde dịka ụmụakwụkwọ ahụ nọ na-agụ akwụkwọ.

    Ụlọakwụkwọ ahụ dị na mpaghara Pays Bas dị na Niamey nwere ụlo agụmakwụkwọ dị iri atọ nakwa ụlọ akịrịka iri abụọ na asatọ n'ime ebe ahụ.

    Otu nwoke, nwa ya nwụrụ kporo oku ka gọọmentị mba ahụ rụọ ụlọ zuru oke maka ụmụaka "na-echeghi ka Chineke bịa mere anyị ihe niile".

    Rue ugbua, amabeghi ihe kpatara ọkụ ahụ.

    Ụlọakwụkwọ ahụ ebe ụmụaka 20 nwụrụ
  5. Ebe ọrịa Coronavirus kwụ akwụ n'Afrịka taa

  6. Ndị omeiwu Naịjirịa anabatala Halilu Ahmad Shaba dịka onyeisi NASRDA

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ndị ụlọomeiwu Naịjirịa ekwuola anabatala nhọpụta Halilu Ahmad Shaba dịka onyeisi ngalaba NASRDA.

    NASRDA pụtara 'National Space Research and Development Agency' na Bekee bụ ngalaba ehibere maka nyọcha na nhazi okwu gbasara oghere igwe.

    Ha mere nke a dịka atụlechara mpụtara kọmịti teknụzụ nke ụlọmeiwu wepụtara gbasara Shaba dịka ha nọ na nzụkọ n'Abuja.

  7. 'Anyị hụrụ ozu mmadụ asatọ na-ere ure mana anyị amaghị ihe gburu ha' - NSCDC

    Ndị ọrụ NSDC

    Ebe foto si, NSCDC TWITTER PAGE

    Ụlọọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) ekwuola na ha hụrụ ozu mmadụ asatọ na-ere ure n'otu ebe dị na Calabar n'ụbọchị Tuesday.

    Onụ na-ekwuru ụlọrụ ahụ bụ Solomon Eremi gwara ndị ntakụkọ na nnukwu isi si n'ebe atụsara ozu ndị ahụ bụ ihe mere ka ndị obodo tiwe mkpu ma kpokuo ha maka enyemaka.

    O kwuru na ụlọọrụ ha zipuru ndị ọrụ ha bu ngwa agha gagharịa ebe ahụ atụsara ozu mana o nweghị ihe ọzọ ha hụrụ.

    O kwuru na ruo ugbua o nweghị ha nwereike ịrụtụ aka na ọ bụ ya gburu ndị ahụ maọbụ mere ndị ahụ kama nnyocha ka na-aga n'ihu.

  8. Ihe mere EFCC ji nwuchie Rochas Okorocha ụnyahụ

    Rochas Okorocha

    Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision ekwetela na ha nwụchịrị aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha.

    Onyeisi mgbasa ozi ụlọọrụ ahụ bụ Wilson Uwujaren gwara BBC na ha nwụchịrị Okorocha n'Abuja.

    Uwujaren ekweghị ekwu ihe ọzọ tinyere okwu nwụchi onye na-anọchite anya Imo West Senatorial District.

    Nwuchi Okorocha na-abịa dịka izu ụka ole na ole gachara ndị uweojii nọ n'Imo steeti nwụchiri ya maka ebubo na ọ mepegharịrị otu 'estate' gọmenti steeti ahụ nyere iwu ka agbachie.

    Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo depụtakwara n'akwukwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ na aka chiburu Imo steeti nọ n'aka ndị ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision ugbua.

    Onwuemeodo depụtara na ọ bụghị taa ka ụlọọrụ kpọrọ Okorocha oku izara ọnụ etu o si chia Imo steeti.

    O depụtekwara na o nweghị ihe dị njọ maọbụrụ na udiri ụlọọrụ kpọọ mmadụ oku.

    Onwuemeodo kwuru na n'ikpeazu ka ha ga-ama ma EFCC a ga-akacha ikpe Okorocha.

    "Okorocha na-enye EFCC ugwu ruru ha site n'iza ha oku makana ụlọrụ ahụ abụghị ebe a na-egbu mmadụ."

  9. Onye uweojii nwaanyị gbara onyeisi oji egbe na Minnesota agbaala arụkwaghịm

    Ndị na-eme ngaghariwe

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ndị uweojii n’obodo ebe a gbara onye isi oji egbe nakwa onye uweojii gbara nwa amadi ahụ egbe agbala akwụkwọ arụkwaghịm.

    Tim Gannon na Kim Potter gbara arụkwaghịm abali abụọ ọnwụ Daunte Wright butechara ngaghariwe ruo abali abuọ ugbua.

    Mana agbanyeghị na ha gbara arụkwaghịm, ngaghariwe na mmebisi ihe akwụsịbeghị maka ogbugbu ahụ mere n'ubọchị sọnde.

    Kim Potter bụ onye uweojii nwaanyị gbagburu Wright kwuru na ọ bụ 'Teaser' ya ka ọ chọrọ ịgbapụ ga mehie gbapụ egbe.

    Anwụchiela ihe karịrị mmadụ iri isii dịka onye uweojii ngagharị na Minnesota bụ Matt Langer si kwu.

  10. Igbo mma mmanụ

    Wụsa ọwa n'ebe a ka ịmata akụkọ akpụ n'ọnụ n'ala Igbo ugbua nakwa mba ụwa niile.

    Ndewonu.

  11. Pastọ Adeboye ezutela Gọvanọ El-Rufai nke Kaduna Steetị

    Pastọ Adeboye na Gọvanọ El-Rufai

    Ebe foto si, Kaduna State Government

    Onyeisi ụlọụka ‘Redeemed Christian Church of God (RCCG)' bụ Pastọ Enoch Adeboye ezutele gọvanọ Kaduna Steetị bụ Nasir El-Rufai na Kaduna.

    Nzukọ a na-abịa n'ụbọchị ole na ole a tọhapụchara mmadụ asatọ bụ ndị ụka RCCG a tọọrọ na Kaduna n'ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị.

    Ha mere nzukọ a n'ụlọ gọọmentị Steetị ahụ dị na Kaduna e ji Sir Kashim Ibrahim dị na Kaduna

    Adeboye sị na ọ gaara ịhụ ndị ụlọụka a tọhapụrụ na Kaduna mgbe gọvanọ El-Rufai sị ya bịa kpere steetị ahụ ekpere pụrụiche.

    Cheta na a tọọrọ ndị ụlọụka Trinity nke RCCG n'okporoụzọ si Kachia na-aga Kafanchan nke steetị ahụ dịka ha na-aga emume ụka.

    Mana n'ụbọchị 8 nke ọnwa Eprelụ ka pastọ Adeboye wepụtara ozi na twitter na-ekwu na a tọhapụla ndị a.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  12. Lee bọketị atịtị na-esere ndị Keke okwu n'Umahia

    Iko atịtị na-enye nsogbu n'Umahia

    Ndị ọgbatumtum Keke na-eme ngagharịiwe ugbua n’Umuahia maka iko atịtị nke amanyere iwu na ha ga na-ebugharịzi n'ime ụgbọ ha.

    Dịka ọ dị ugbua, obodo ahụ n’ọzị n’ahịrị ụgbọala dị egwu maka na ndị Keke na-emebisi iko atịtị ọbụla ahụ ha hụrụ.

    Ihe bụ iwe ha bụ ụdịrị ego ezighi ezi a na-anapụ ha maka bọketị atịtị ahụ.

    Otu onye gwara BBC Igbo okwu kwuru sị "bọketị a bụ ihe a na-ere naira narị abụọ na iri ise mana ha na-eresi anyị a otu puku naira".

    O kwukwara na onye ọbụla ejidere ejighi bọketị ahụ ga-erite ntaramahụhụ site n'ịda nha ma mechaa zụọ ya bụ ihe.

    Mgbe onye ntaakụkọ BBC gara n'ụlọorụ ndị Tricycle Owners Association of Nigeria, onyeisioche nakwa onye odeeakwụkwọ ya gara njem nakwa na ha ga-alaghachite n'ụbọchị Wenzde.

  13. Atọghapụla Fada Onyeocha anwụchiri n'akụkụ Okigwe

    Ọtụtu ndị ụkọchukwu nke Fada Onyeocha esoghi na ha
    Nkọwa foto, Ọtụtu ndị ụkọchukwu nke Fada Onyeocha esoghi na ha

    Fada Marcel Onyeocha nke ndị ntọ tọọrọ n’abalị ole na ole gara aga enwerela onwe ya n’aka ndị ntọ ya.

    Amabeghị ma o nwere ego ọbụla akwụrụ iji gbapụta ụkọchukwu ahụ atọọrọ n’okporoụzọ Enugwu – Okigwe na mgbede ụbọchị Satọde.

    Ọkwọụgbọala ya bụ onye hụrụ ihe mere kọwara na o bụ ndị echeere na ha bụ ndị Fulani pụtara n'ọhịa wakpo yanwa ma tọrọ Fada ahụ.

  14. Ọ bụ mmehie ka-eji gbagbu Daunte Wright

    Ebe a gbara mmadụ egbe

    Ebe foto si, Brooklyn Center Police Department

    Onyeisi ndị uweojii n’obodo Minnesota bụ Tim Gannon ekwuola na onye otu ya gbagburu onye ojii bụ Daunte Wright bụ site na mmehie n’ihi na ọ bụ egbe latrik bụ Taser ka ọ chọbụrụ ịgbapụ.

    Cheta na ndị ojii bi ebe ahụ malitere ngagharịwe ọzọ maka ogbugbu Wright.

    Dịka ọ dị ugbua, anwụchiela mmadụ iri anọ n'ọgbaghara dapụtara na ya bụ ngagharịiwe nke na-abanye ụbọchị abụọ ya ugbua.

  15. Ahmed Musa nwereike ịgbara Kano Pillars bọọlụ

    aHMED mUSA

    Ebe foto si, Getty Images

    N’egwuregwu, ọgba bọọlụ Naịjirịa a ma ama bụ Ahmed Musa nwereike ịsonyere otu Kano Pillars obere oge.

    Gọọmentị steetị ahụ na-atụ anya na nke a ga-enye aka kwalịte ọnọdụ bọọlụ nke otu ndị obodo Naịjirịa.

    Otu dị icheiche na mba gụnyere Ingland, Rọshịa nakwa Tọkị.

    Musa gwara BBC na ọ ga-eso Kano Pillars gbaa ọtụtụ asọmpị mgbe ya na Gọvanọ steeti ahụ nwechara nzụkọ.

  16. Ndị dọkịta Naịjirịa ga0agba abụbụọrụ ọzọ maọbụrụ na...

    Ndị ọrụ ahụike

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu ndị dọkịnta agwaala gọọmentị etiti na ha ga-eme ngagharịiwe ọzọ maọbụrụ na ha azaghị oku ihe ndị dọkịnta ahụ chọrọ.

    Onyeisi ha bụ Uyilawa Okhuaihesuyi kwuru na o nwere nkwenye na gọọmentị ga-eme ihe niile ha nara ha.

    O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels Tv nwere.

    Mana ha kwusikwara ike na ha ga-aga abụbụọrụ ebighiebi maọbụrụ na gọọmentị etiti gbajọọ nkwenye ha abụọ nweburu mbụ n'ime izuụka anọ.

    Ọkpụrụkpụ ihe bụ iwe ha gụnyere ịkwụ ụgwọ e ji ha, ịkwụlite ụgwọ ọnwa ha nakwa mwelite ụgwọ mmerụ ahụ ruru ha nke a kpọrọ 'Hazard allowance' na Bekee.

  17. Unu apụtala ụtụtụ?

    Ndewo nu!

    Sonye nụ anyị taa maka akụkọ ndị dị mkpa n'ogbe gị nakwa na mba ụwa.