Oby Ezekwesili ekpeela Omojuwa n'aka ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images
Oby Ezekwesili ekwuola na o kpesala Omojuwa bụ onye nwe ụlọorụ Alpha Reach n'aka ndị uweojii.
Dịka o si kọwaa n'akara Twitter ya, o kwuru na ụlọọrụ ahụ azaghị ajụjụ ọ jụrụ ha maka etu ha si mee ya onyeisi n'ụlọorụ ahụ n'ajụghị ha.
Cheta na Japhet Omojuwa banyere na nsogbu mgbe ọ pụtara ihe na ya na ndị na-eme mkpọtụ ozi akpọrọ influencers' na Bekee na-achọ ka atọghapụ otu nwoke bụ Alex Saab nke ejichiri na Cape Verde maka ebubo mpụ.
Ihe ọzọ pụtara bụ na Ezekwesili soro bụrụ otu ndị onyeisi ụlọorụ ahụ nke ọ gọrọ kpam kpam ma kwuo na ọ maghị mgbe nke a jiri mee.
Nke a mere ka o jiri ndị ọkaikpe ya zigara Omojuwa ozi sị ya weta ihe akaebe igosi na ọ kwenyere ịsonye n'ụlọorụ ahụ.
Japhet zaghachikwara Oby n'onwe ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2