You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ihe gọọmentị sị ha ga-emere ndị Ebonyi maka mwakpo dakwasịrị ha

Gọọmentị etiti ekwela nkwa inyere ndị Ebonyi Steetị aka na mwakpo e mere ha n'izuụka a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ihe i kwesịrị ịma maka ọkammụta Francis Otunta bụbu onyeisi MOUAU

    Onye bụbu onyeisi ụlọakwụkwọ Mahadum Michael Okpara di n’Umudike bụ Ogbonnaya Francis Otunta anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ.

    Akụkọ ruru anyi ntị site n’ọnụ otu onye ezenụlọ kwuru na Otunta na onye ọkwọ ụgbọala ya so n’ihe mbere a mere n’abalị 29 Maachị, afọ 2021.

    Ọtụnta ka nyefere ọkwa ọchịchị mahadum ahụ n'aka onye ga-anọchi ya n'izuụka mba nke ọnwa Maachị a.

    Ihe I kwesịrị maka ọkammụta Otunta

    • A mụrụ Ọtụnta n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Eprelụ afọ 1958 n'Amangwu Nkoghoro di n'okpuruọchịchị Afikpo,Ebonyi Steetị.
    • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum etiti di n'Ịlọrịn n'afọ 1991 nakwa Mahadum Benin n'afọ 1978 ma gụchaa n'afọ 1982.
    • O ji nzere ọkaibe bụ 'first class' pụta na ngalaba ihe ọmụmụ mgbakọ na nwepụ bụ 'mathematica na Bekee.
    • Ọtụnta bụbu onyeisi ụlọakụkwọ Akanu Ibiam Politknik di n'Uwana bido n'afọ 2006 ruo 2014.
    • Nwamadi a bụ ọkammụta na 'Mathematics' were ọkwa ọchịchị dika onyeisi ụlọakwụkwọ Mahadum Michael Okpara dị n'Umudike, Abia Steetị n'ọnwa Maachị afọ 2016.
    • Otunta lụrụ nwaanyị ma mụọ ụmụ isii.
  2. Gọvanọ Umahi sị ka a nwụchie onyeisioche na onye omeiwu n'Ebonyi Steetị

    Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi Steetị enyeela iwu ka a nwụchie onyeisiochere okpuruọchịchị Ohaukwu bụ Clement Odah na onye omeiwu na-anọchite anya ha n’ụlọomeiwu steetị bụ Chinedu Awoh maka ọgbaghara dị n’etiti Ezza na Effium.

    Umahi nyere iwu a n’Abakaliki n’ọgbakọ nchekwa ya na ndịisi obodo abụọ nwere.

    A rụọla Odah na Awo aka ọtụtụ oge dịka ndị na-akwadi ọgbaghara na-eme n’etiti obodo ndị a bụ nke tarala isi ọtụtụ mmadụ ma laa ngwongwo n’iyi.

    A nwuchiburu ha abụọ n’ọnwa tinyere ndị ọzọ mana e mechara tọhapụ ha.

    Ha na ndị ndu obodo abụọ tinyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta sị ka e gbuzila ndị mmadụ n’obodo ha.

    Gọvanọ Umahi kwụsịrị ndị ndu ọzọ na-abịaghị ọgbakọ ọrụ akwụghị ụgwọ ruo oge amaghị.

    Ọ sịkwara ka a nwụchie ọnụ na-ekwuru ndị obodo Effium bụ James Agina na nke Ezza bụ Titus Nworie.

  3. BBC Nkeji

    Gere akụkọ ihe mere n'ụwa n'otu nkeji.

  4. "Anyị anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo gburu Chiamaka n'Enugwu"

    Kọmishọna ndị uweojii n’Enugwu Steetị bụ Mohammed Aliyu enyeela iwu ka e nyochaa ma chọpụta onye gburu nwata nwaanyị ahụ ozu ya tọgbọrọ n’akwammiri dị n’okporoụzọ, IndependenceLayout nke Enugwu.

    Aha nwata a bụ Orji Chiamaka Precious Gold bụ onye dị afọ iri abụọ

    Site n’ozi ndị uweojii nwetere n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde ka ha gara buru ozu nwata a buga n’ụlọozu na-eche mgbe a ga-eme ya nyocha.

    N’ihi nke a kọmishọna adọọla ndị ntoroọbịa n’Enugwu aka na ntị ka maara ụdị mmadụ ha ga-akpaso enyi ka ha ghara ịbụ ndị a ga-eji kọọ akụkọ ọjọọ.

    Ọ rịọrọ ka ọhaneze ndị bi n’Enugwu nyere ndị uweojii aka n’ịchọpụta ndị kpara arụ.

    Mana ọ sị ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n’ọnwụ nwata nwaanyị ahụ.

  5. BBC Nkeji

    Gere akụkọ ihe mere n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa n'ụwa n'ime otu nkeji.

  6. Onyeisiala Buhari ga-apali njem ahụike n'ụbọchị Tuusde

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Naịjirịa gawa mba Briten n'ụbọchị Tuusde maka ilebara ọnọdụ ahụike ya anya.

    Onye ndụmọdụ ya pụrụiche na mgbasaozi bụ Femi Adesina kwupụtara nke a n'abalị Mọnde ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị.

    Tupu ọ palie njem gawa Briten, Onyeisiala Buhari na ndịisi ọrụ nchekwa ga-enwe obere mkparịtaụka n'ụtụtụ.

    A na-atụ anya na ọ ga-alọta n'ime izuụka abụọ nke ọnwa Eprelụ, afọ 2021.

    Onyeisiala Buhati emeela ọtụtụ njem ahụike site n'afọ 2015 ruo afọ 2019.

    N'ime njem ndị a, o nwere nke ọ nọọrọ ihe karịrị ọnwa atọ n'obodo Lọndọn na-enyefeghi osote bụ Yemi Osinbajo ọkwa n'oge ahụ.

  7. Ụmụ Igbo ndị ọma e ji eje mba ndewo nụ

    Ọkpa ekele ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị ọhụrụ a.

    Biko buru oche gị bịa gwunye n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị hiri odo.

  8. Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela ndị otu nzuzo gburu otu onye ma gbaa ụlọ iri ọkụ

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Ikeokwu Godson Orlando ekwuola etu ha siri nwuchie ụfọdụ ndị ha na-enyo na aka ha dị n'ime mpụ dị iche iche gụnyere izu ohi, ịgba ụlọ ọkụ nakwa ịnọ n'otu nzuzo.

    Ikeokwu kwuru na ndị a na-enyo maka otu nzuzo gburu otu onye a ma dịka Uche Ogboko (Agadagbi) ma gbaa ihe ruru ụlọ iri ọkụ na mpaghara Ugwuta n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị.

    Ndị ha nwụchiri gụnyere otu nwaanyị na ụmụnwoke itoolu, nke atọ n'ime ha mechara nwụọ.

    Ọ kọwakwara etu e si chọta egbe ise nakwa mgbọegbe 14 n'aka ha.

    Ka o si kwuo, ndị a a nwụchiri maka mkpamkpa a, kwuputere na ọ bụ eziokwu na ha mere ihe ndị a e boro ha, mana kwuo na ha mere ya mgbe ha na-abọ ọbọ maka ọnwụ Agadagbi.

  9. Sudan ekponyerela South Africa aja na garị n'AFCON 2022

    Mba Sudan ji ọkpụ goolu abụọ asataghị ihe tinyere South Africa aja na garị n’asọmpi Iko mba Afrịka a ga-agba n’Cameroon n’afọ 2022.

    Onye nkuzi otu egwuregwu South Africa bụ Molefi Ntseki kwuru na ya bụ ihe gbawara ndị obodo ha obi dịka Bafana Bafana chọrọ naanị otu pọịntị iji tozuo maka ya bụ asọmpi mana o rughi ha aka.

  10. Etu e si duo Ọkaikpe Ukwu ọhụrụ Ebonyi steeti n'iyi n'ọrụ

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi eduola Jọstis Elvis Anegu Ngene n'iyi ọrụ dịka Ọkaikpe Ukwu nke steeti ahụ.

    Nke a mere Jọstis Ngene ọkaikpe ukwu nke ise nke steeti ahụ na-enwe.

    Jọstis Ngene nọchiri Jọstis Anselem Anyigor Nwigwe bụ onye lara ezumiike nka dịka ọ rụchara ọru ahụ otu afọ.

    Jọstis Ngene bụ onye obodo Uburu dị n'okpuruọchịchị Ọhaọzara dị n'Ebonyi steeti.

    N'ozi nnabata ya, Jọstis Ngene kelere Gọvanọ Umahi maka iwe ya n'ọrụ a, ma kwe nkwa na ọ gaghị awụ ya n'ala n'ịrụ ọrụ nke a kpọrọ ya ka ọ rụọ.

    Ndị bịara ya bụ idu iyi ọrụ gụnyere ndị na-arụ ọrụ na ngalaba ịka iwu nakwa ndị isi a hụrụ kwaba okpu na gọọmentị nọ n'ọchịchị.

  11. Nkeji Coronavirus

  12. A tụlitela ụgbọmmiri gbochiri ụzọ Suez Canal kemgbe otu izu

    A tụlitela nnukwu ụgbọmmiri gbochiri Suez Canal kemgbe otu izu, dịka ndị mba Ijipt si kwuo.

    Ụgbọmmiri Ever Given ahụ ha mita 400 n'ogologo (1300ft), tọrọ na mmiri ahụ tupu ndị ọrụ gbatagbata abịa tọpụta ya taa.

    Odobeghi anya mgbe ụgbọmmiri ndị ọzọ ga-amalitekwa ime njem n'elu mmiri ahụ.

    Suez bụ mmiri jikọrọ Eshia na Yurop nakwa Midụl Ist, bụ otu n'ime ụzọ esi eme njem azụmahịa kacha ekwo ekwo, nke mere ka ụlọọrụ dị iche iche malite ịchọ ụzọ ọzọ ụgbọmmiri ha ga-esi tụgharịa na njem, nke mere ka ọtụtụ ụgbọmmiri ruru nde kwụrụ n'ahịrị na-eche ma isi ọ ga-apụta.

    Peter Berdowski, bụ onyeisi ụlọorụ Boskalis bụ ụlọọrụ mba Denmark na-ahụ maka gbatagbata, kwuru na e Ever Given a malitekwara ise n'elu mmiri ọzọ ebe elekere atọ nke ehihie n'ụbọchị mọnde a, nke ọ sị "mere ka njem gawakwa sịrịrị werere n'elu Suez Canal ọzọ".

    E bugara ụgbọmmiri ahụ n'ebe a ga-enwe ike inyocha ya.

  13. Sịnetọ Okorocha na Eze Ilomuanya adụrụ onwe ha aka n'ọnụ?

    Onye bụbu aka na-achị Steeti Imo bụ Rochas Okorocha na onye Eze Obinukwu bụ Eze Cletus Ilomuanya nọrọ n'ụtụtụ ụnyaahụ were egbe ọnụ saa onwe ha ahụ n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owere.

    Akụkọ kwuru na Eze Ilomumanya sị na ihe na-eme Okorocha si ya n'aka, ebe Okorocha gwara ya na onweghi obi mwute ịwepụ ya dịka onyeisi ndị Eze ọdịnala n'oge ọ bụ gọvanọ.

    Okorocha kwuru na e nyekwuo ya ohere ọzọ ịbụ aka na-achị steeti ahụ, na ọ ga-eme ya ma mekwasị ọzọ.

    Okorocha na onye Eze a nọkọrọ ọnụ n'oche n'ime ụgbọelu ahụ mgbe ha bidoro na-abara onwe ha mba.

    Ndị nọ n'ụgbọelu ahụ mechara bịa gbosaa Okorocha na Ilomuanya ma nye ha oche na-adịghị nso onwe ha.

    Cheta na mgbe Okorocha na-achị dịka gọvanọ Imo Steeti na o wepụrụ Eze Ilomuanya n'ọkwa onyeisi ndị Eze ọdịnala nke steetị ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemedo gwara BBC Igbo na ọ nọghị n'ụgbọelu mgbe ihe ahụ mere kama na ọ nụrụ ya n'akụkọ.

    Ọ gara n'ihu katọọ agwa Eze Ilomuanya kpara ma sị na onye ọbụla maara Rochas dịka onye udo na ịhụnanya.

    Ọ gara n'ihu kwuo na anaghi abụ anụ nwụrụ anwụ n'ezi. O kwuru na Okorocha ịnọkwuru ya na akụkụ gosiri na o nweghi ihe ọjọọ okorocha buuru ya n'obi.

  14. BBC Nkeji

    Gere akụkọ ihe mere n'ụwa n'ime otu nkeji.

  15. "O nweghi mgbe Buhari kwere nkwa ime ka otu dọla bụrụ otu naịra"

    Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na onweghi mgbe ọchịchị kwere ndị Naịjirịa nkwa ime ka otu naịra bụrụ otu dọla.

    Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ pụrụiche na mgbasaozi nye Onyeisiala Buhari sị na ihe a ndị mmadụ na-ebo ya na o kwuru bụ asị ọcha.

    Adesina kwuru sị "Ọ dịghị ire, ọ bụ adịgboroja, ọ bụ asị, ọ dịghị ire" mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV na Sọnde.

    O kwuru na minista mgbasaozi bụ Lai Muhammadu agọnarịla ebubo ahụ ọtụtụ oge ma sị ka onye nwere ihe onyonyo ebe Buhari kwuru ya, pụta bịa gosi ụwa.

    Adesina gara n'ihu katọọ ndị na-ekwu okwu ọjọọ megide Onyeisiala ma sị ha kwụsị nke a n'ihi na ọ gaghị enyere Naịjirịa aka n'ito eto.

    Ọ sị na e nwere ọtụtụ ihe ọma ọchịchị ha merela na Naịjirịa mana ndị Naịjirịa anaghị achọ ịkọ akụkọ banyere ha.

  16. Igbo ndị ndewo nụ

    Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'izuụka ọhụrụ.

    Anyị na-asị ka izu a maara mmadụ niile mma.

    E chefukwala ị na-esonyere anyị na BBC Igbo oge niile.