Ihe i kwesịrị ịma maka ọkammụta Francis Otunta bụbu onyeisi MOUAU
Onye bụbu onyeisi ụlọakwụkwọ Mahadum Michael Okpara di n’Umudike bụ Ogbonnaya Francis Otunta anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ.
Akụkọ ruru anyi ntị site n’ọnụ otu onye ezenụlọ kwuru na Otunta na onye ọkwọ ụgbọala ya so n’ihe mbere a mere n’abalị 29 Maachị, afọ 2021.
Ọtụnta ka nyefere ọkwa ọchịchị mahadum ahụ n'aka onye ga-anọchi ya n'izuụka mba nke ọnwa Maachị a.
Ihe I kwesịrị maka ọkammụta Otunta
- A mụrụ Ọtụnta n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Eprelụ afọ 1958 n'Amangwu Nkoghoro di n'okpuruọchịchị Afikpo,Ebonyi Steetị.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum etiti di n'Ịlọrịn n'afọ 1991 nakwa Mahadum Benin n'afọ 1978 ma gụchaa n'afọ 1982.
- O ji nzere ọkaibe bụ 'first class' pụta na ngalaba ihe ọmụmụ mgbakọ na nwepụ bụ 'mathematica na Bekee.
- Ọtụnta bụbu onyeisi ụlọakụkwọ Akanu Ibiam Politknik di n'Uwana bido n'afọ 2006 ruo 2014.
- Nwamadi a bụ ọkammụta na 'Mathematics' were ọkwa ọchịchị dika onyeisi ụlọakwụkwọ Mahadum Michael Okpara dị n'Umudike, Abia Steetị n'ọnwa Maachị afọ 2016.
- Otunta lụrụ nwaanyị ma mụọ ụmụ isii.