You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ihe gọọmentị sị ha ga-emere ndị Ebonyi maka mwakpo dakwasịrị ha

Gọọmentị etiti ekwela nkwa inyere ndị Ebonyi Steetị aka na mwakpo e mere ha n'izuụka a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndị ọrụ Shoprite emeela ngagharịiwe ma gbaa abụbuọrụ

    Ndị ọrụ Shoprite dị n’Ibadan na mpaghara ndị ọzọ na Naijiria emeela ngagharịiwe nke mere ka e mechie ụlọahịa ahụ taa bụ Fraide.

    Ụfọdụ akwụkwọ ha ji egosi iwe ha na-ekwu “ Anyị abụghị ndị agụụ, kwụọ anyị oke ruru anyị ka anyị gawara”; Anyị abụghị ndị ohu” wdg.

    Ndị ọrụ ahụ kwuru na iwe ha bụ na ndị nwe ụlọọrụ ahụ jụrụ imejuputa ọchịchọ obi ha (dịka ha lesịrị onye ọzọ ụlọọrụ ahụ) nke bụ ka a kwụọ ha ụgwọ ha niile, ka ha gawara onwe ha.

    Onyeisi otu ndị ọrụ ọdụahịa ngalaba nke Shoprite dị n’a Ring Road ,Ibadan bụ Williams Peter gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Nation na “ Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọọrụ adịghị njikere ige anyị ntị, ihe ọ pụtara bụ na Shoprite agaghị emepe n’Epreelụ a”.

  2. Ihe mere o ji ara gị ahụ iji ekwentị gị azụta MTN 'card'

    Ndị nwere akara ekwentị MTN na-ata ikikere eze maka enweghi ike iji ekwentị ha azụta oge mkparịtaụka n'ekwentị bụ 'card'.

    Nsogbu azụtalighi 'card' n'ekwentị a malitere n'abalị ụbọchị Tọsde

    Onweghi onye maara kpọmkwem ihe mere mana akụkọ sị na ụlọakụ ndị Naịjirịa gbochiri ụlọrụ MTN nzụrịta ahịa ịntanetị a kpọrọ Unstructured Supplementary Service Data (USSD) maka nsogbu uru dị n'ego ha na-enwete.

    Cheta n'afọ 2019 ngalaba na-ahụ maka nzụrịta ahịa ịntanetị bụ Association of Licensed Telecommunications of Nigeria (ALTON) yiri egwu na ha ga-amachi nzụrịta ahịa ahụ.

    Ụlọọrụ a sị na ọ bụ ụlọakụ ga na-akwụ ụgwọ maka iji USSD azụ ahịa n'ekwentị mana onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele sị na nke a ga-eme ka azụmaahịa ụlọakụ dị oke ọnụ ahịa.

    Ndị ụlọọrụ nzirita ozi n'ekwentị na ndị ụlọakụ nọ n'esemokwu a kamgbe afọ 2019 ruo n'ọnwa Maachị afọ 2021 mgbe ngalaba gọọmentị etiti bụ NCC sị na ego a ga-eji na-eme azụmaahịa USSD bụ N6.98.

    Ihe ụlọọrụ MTN kwuru

    Ụlọọrụ MTN ezipubeghi ozi banyere ihe kpatara ndị nwere akara ekwentị agaghị azụnwu 'card' n'ekwentị ha.

    Mana ha zigaara ndị mmadụ ozi sị na nzụrịta ahịa n'ekwentị adịghị ire nwa mgbe nta.

  3. E duola Mohamed Bazoum ‘iyi ọrụ dịka Onyeisiala mba Nijie

    E duola Mohamed Bazoum n’iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Nijie n’isiobodo Niamey ụbọchị Fraide.

    Mmemme a na-abịa dịka mbọ ndịagha gbara iweghara ọchịchị n’ike abalị abụọ gara aga kpụrụ afọ n’ala.

    Nke a bụ mbụ a na-enwe nnyefe ọchịchị site n’aka onyeisiala e ji ntuliaka were họpụta ga n’aka onye ọzọ ntulika tụpụtara na mba ahụ kemhgbe ha jiri nweta nwereonwe afọ 60 gara aga.

  4. Nkeji Coronavirus

    Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa.

  5. BBC Nkeji

    Gere akụkọ mere n'ụwa n'ime otu nkeji.

  6. A gbatịkwuola oge e nyere maka njikọ akara ekwentị na akara njirimaara

    Gọọmentị etiti agbatịkwuola oge e nyere ndị mmadụ ijikọta akara ekwentị ha na akara njirimaara ha bụ NIN ruo otu ọnwa ọzọ.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ mgbasaozi n’ekwentị bụ Ikechukwu Adinde na onyeisi ụlọọrụ njirimara bụ Kayode Adegoke tinyere aka n’akwụkwọ.

    A gbatịrị oge ndebanye aha a ruo ụbọchị isii nke ọnwa Mee mgbe otu ọtawaike nke ministe hiwere nwechara mkparịtaụka n’Abuja na Tọsde.

    Onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere aka n’akwụkwọ kwadoro ka a gbatịkwuo oge ndebanye aha a tupu ha e mee ya.

    Site na nchọpụta gọọmentị mere, mmadụ ruru nde iri ise na otu enwetela akara njirimaara NIN.

    Akwụkwọ a kọwara na e nwere ọtụtụ ndị mmadụ na-edebanyela aha ha mana ha ka na-eche ka e nye ha akara njirimaara NIN.

  7. "A tọhpụla onyeisi obodo Oshiagu Amia Ngbo na mmadụ anọ ọzọ a tọọrọ n'Ebonyi"

    A tọhapụla John Ulebe Nnaji bụ onyeisi obodo Oshiagu Amia Ngbo dị n'okpuruọchịchị Ohaukwu nke Ebonyi Steetị na mmadụ anọ ndị ọzọ a tọọrọ n'obodo ha n'ụbọchị Tọzde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Loveth Odah sị na a tọhapụrụ ndị a n'ihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie ụbọchị Fraịde.

    Ọ sị na a tọhapụrụ ndị a site na mgbakọta aka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ime obodo.

    Cheta na akụkọ kwuru na ndị ntọrị yi uwe dịka nke ndịagha wuchiri n'obodo ahụ, malite ịgba egbe ma tọọrọ onyeisi obodo ahụ na mmadụ anọ ndị ọzọ.

    Ndị a ji ọgbatumtum bịa ntọrị ahụ merụkwara ọtụtụ ndị mmadụ ahụ n'oge ahụ.

  8. Iheanacho eturula ugo 'ọkacha agba na Premier League' nke ọnwa Maachị

    Kelechi Iheanacho enwetala nturuugo dịka ọkaibe n'asọmpi bọọlụ na mba England nke ọnwa Maachị afọ 2021.

    Iheanacho nwetara nturuugo a n'ihi ike ọ kpara n'asọmpi bọọlụ atọ nke otu ya bụ Leicester City gbara n'ọnwa ahụ.

    O nyere goolu ise n'ime asọmpi atọ ahụ nke mere ka Leicester City nọrọ n'ọkwa nke atọ na tebulu EPL.

    Iheanacho na-acha ka ọkụ ugbua dịka o nyekwaara Naịjirịa aka n'asọmpi abụọ ha gbara n'ọdị nso a ebe ha meriri Benin Republic nakwa Lesotho.

  9. 'Ụgbọelu ndịagha furu efu nwere ike ọ kpọkasịala'

    Akụkọ si n'aka ndị agha elu Naịjirịa apụta ugbua na-ekwu na ụgbọelu ahụ a na-achọ achọ kamgbe abalị abụọ gara aga nwere ike ọ kpọkasịala.

    Onye kwuru nke a bụ onyeisi ngalaba mgbasa ozi ndị agha elu bụ Edward Gabkwet.

    O kwuru na ha achọpụtabeghị ihe kpatara ụgbọelu ahụ ji kpọkasịa; amabeghịkwa ebe mmadụ abụọ nọ n'ime ụgbọelu ahụ nọ.

    Aha mmadụ abụọ na-anya ụgbọelu ahụ bụ John Abolarinwa na Ebiakpo Chapele ndị ji ọkwa Flight Lieutenant.

    Dịka Gabkwet si kwuo, ha nwere olileanya ịchọta ma kpọlata ndị agha abụọ ahụ n'oge na-adịghị anya.

  10. Onyeisi ndị agha elu Naịjirịa agaala Borno ịchọta ụgbọelu ha furu efu

    Onyeisi ndị agha elu Naịjirịa bụ Oladayo Amao agaala Borno steeti iji mata ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ gbasara ụgbọelu ndịagha furu efu.

    Ụgbọelu ahụ fepuru n’ụbọchị Wenezde ịga buso ndị Boko Haram agha, mana anya ahụbeghị ya ọzọ ruo ugbua.

    Amao gwara ndị agha ya ka obi ghara ịlọ ha mmiri n'ihi ya bụ ọdachi, ma kwekwa nkwa a ga-achọpụtarịrị ihe mere ya bụ ụgbọelu e ji akwa mgbọ.

    O meela abalị abụọ a malitere ịchọ ụgbọelu a achọ, nke pụtara na olileanya maka ịchọta ya ji nwayọ na-ebelata.

    Cheta na otu ụgbọelu ndị agha kpọkasịrị ma gbuo mmadụ asaa nọ n'ime ya n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

  11. Mmadụ 34 anwụọla na mkpọkasị ụgbọoloko na Taiwan

    Opekatampe mmadụ iri atọ na anọ anwụọla n’ihe mberede ụgbọoloko mere na mba Taiwan n’ụbọchị Fraịde a.

    Ihe karịrị mmadụ iri asaa na abụọ merụkwara ahụ n'ihe mberede a, dịka ụlọ ntaakụkọ Reuters si depụta.

    Ndị ọrụ gbatagbata mba Taiwan na-agbasi mbọ ike ugbua inyere ndị mmadụ aka.

    Nke a na-abịa dịka mba Taiwan na-eme emume ọdịnala ha ji akwanyere ndị nke ha nwụrụ anwụ ugwu kwa afọ.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ atọ n'ime ụgbọoloko ahụ, mana a na-agba mbọ ịtọhapụ ha.

  12. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.

    Daalụ maka isonyere anyị taa.

    Ya gaziere gị.

  13. Ka ọ dị echi

    Daalụ maka ịnọnyere anyị taa

  14. Ọgwụ mgbochi si India abịa agaghị abịa mgbe a tụrụ anya ya - ACDC

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa n’Afrịka bụ Center for Disease Control (ACDC) ekwuola na ha agaghị agbazunwu mmadụ ole ha bubu n’obi ịgba ọgwụ mgbochi n’ihi etu ndị India si kwụsị ntụbata ya.

    John Nkengasong bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa n'Afrịka ekwuola na atụmatụ India ịkwụsị mbupu ọgwụ mgbochi Oxford-AstraZeneca nwereike ịbụ ọdachi nye mba ndị Afrịka.

    O kwuru na ọgwụ mgbochi a si India dị ezigbo mkpa maka ibuso ọrịa ozuruụwa ọnụ coronavirus a agha na mpaghara a.

    Ndị ACDC kwuru na ihe ruru ọgwụ AstraZeneca nde iri itoolu agaghị abata mgbe a na-atụ anya ya n’ihi etu ọrịa covid-19 si arị elu n’India.

  15. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  16. Ndị dọkịta Naịjiria amalitela abụbụọrụ

    Ndị dọkịta na-arụ n'ụlọọgwụ ndị gọọmentị na Naịjiria a kpọrọ National Association of Resident Doctors (Nard) amalitela ịgba abụbụọrụ n'ihi ụgwọ e ji ha nakwa enwezughi ngwa mkpuchi nchekwa ahụ.

    Ha na-ekwukwa ka a kwụọ ha ụgwọ maka ihe ndapụta nke mkpamkpa coronavirus.

    Ọtụtụ ụlọọgwụ enweghi ihe ndị dị mkpa dịka akwa nakwa ọgwụ.

    Ndị nọ n'ọkwa na-ekwu na abụbụọrụ a ga-abụ ọgbatuhie nye agha a na-ebuso ọrịa ozuruụwaọnụ coronavirus, nke gụnyekwara atụmatụ ikesa ọgwụ mgbochi Oxford-AstraZeneca ruru nde 40, mana ngalaba Nard ekwuola na ke a abụghị eziokwu.

    Ka ngalaba Nard si kwuo, ọrịa Covid-19 egbuola ndị dọkịta 17 kemgbe ya bụ ọrịa selitere isi n'ọnwa Maachị 2020.

    Ha kwuru na a na-akwụbu ha dọla iri na abụọ ($12) kwa ọnwa mbụ maka ihe ndapụta, mana a kwụsịrị ịkwụ ha ya ka naanị ọnwa atọ gachara.

    Mara na ihe karịrị mmadụ 160,000 ebutela ọrịa covid-19 a ebe ọ tarala isi ihe karịrị mmadụ puku abụọ na Naịjiria kemgbe o selitere isi.

  17. Inec ekwuola mgbe ndebanye aha maka ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Anambra steeti ga-amalịte

    Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' ga-amalite ndebanye aha maka ntuliaka Anambra n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa June afọ 2021.

    Onyeisi INEC bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n'ụbọchị Tọzde n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

    O kwuru sị: "Ndebanye aha maka ndị ga-atụ vootu ga-amalite na Naịjirịa niile n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jun 2021, ọ ga-adigide ruo ọkara afọ 2022."

    "Mana anyị ga-aka gbado anya n'Anambara Steeti, ebe anyị ga-ewepụta ọtụtụ ebe ndị mmadụ ga-aga idebanye aha ha n'ihi ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-adị na steeti ahụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2021."

    Mahmood kwukwara na ndebanye aha ga-akwụsị n'Anambra steeti n'ọnwa Ọgọst 2021, iji nye ohere ka INEC kwadoo nke ọma maka ya bụ ntuliaka.

  18. Ụmụ Naijiria nde 150 edenyela akara ekwentị ha, nde 51 enweela akara NIN

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Isa Pantami ekwuola na nde mmadụ iri ise na otu (51 million) enwetala akara njirimara ha a kpọrọ 'National Identity Number' na Bekee.

    Pantami kwukwara na mmadụ nde otu nari na iri ise (150 million) edenyela akara ekwentị ha nke Bekee kpọrọ Sim Reigistration.

    O kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ na-akparịtaụka n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.

    Ọ gara n'ihu dọọ aka na ntị na ọ bụ nnukwu ihe megidere iwu nke nwere ike iduba mmadụ ụlọ mkpọrọ, mmadụ imepe ọbaego n’ụlọakụ maọbụ ịtụ ụtụisi na ejighị akara njirimara NIN.

  19. Ụgbọelụ ndị agha elu Naịjirịa efuola na Borno

    Otu ụgbọelu ndị agha elu Naịjirịa efuola dịka ọ gara njem ibuso ndị Boko Haram agha na mpaghara Ugwu Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru ndị agha elu Naịjirịa sị na ọ bu kemgbe elekere ise nke ehihe Wenesde bu ụbọchị 31 nke ọnwa Maachi ka ihe a mere.

    "Anyị amatabeghị ihe mere maọbụ ebe ụgbọelu a gara, mana anyị ga-agwa ọha ihe mere ma anyi chọpụta."

    Ndi agha elu ekwughi mmadu ole nọ n'ime ụgbọelu ahụ.

    Otu onye bụbu onye agha elu Naịjirịa gwara ụlọ ntaakụkọ Punch sị: "Ọ bụrụ na anụghị mkpatụ ụgbọelu ruo nkeji iri atọ, a ga-asị na o fuola."

    N'ọnwa Febụwarị, otu ụgbọelu ndị agha Naịjirịa dara n'Abuja dịka o si Minna alọghachi.

    Mmadụ asaa nọ n'ime ụgbọelu ahụ nwụrụ na ya bụ ihe mberede.

  20. Onweghị mgbe m ji nara aka azụ iji mee ka Obiano bụrụ gọvanọ - Peter Obi

    Aka chịburu Anambra steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ya nara akaazụ ijeri naịra asaa iji mee ka Willie Obiano bụrụ gọvanọ steeti ahụ.

    Peter Obi kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ndị isi Pati Peoples Democratic Party nke Anambra steeti.

    Cheta na akụkọ na-efegharị na soshal midia na Peter Obi nara aka azụ iji tinye Obiano n'ọkwa gọvanọ.

    Mana Peter Obi kwuru sị: "Kamgbe m hapụrụ oche gọvanọ Anambra steeti, onwebeghị ihe gọọmentị steeti a nyetụrụla m, ọbụnagodu kama mmiri ọṅụṅụ, maọbụ akwụkwọ ozi ekele n'oge ekeresimesi maọbụ n'oge ncheta ọmụmụ m."

    "Mana ihe ndị a anaghị echu m ụra n'ihi na ọbụghị maka ya ka m ji banye na ndọrọndọrọ ọchịchị."

    "Ya mere o ji ewute m na mmadụ na-ekwu na mụ nara ijeri naịra asaa iji tinye gọvanọ n'ọkwa. Kedu etu m ga-esi hapụrụ mmadụ ijeri naịra iri asaa na ise (N75b) bịakwa na-agwa onye ahụ ka ọ kwụọ m ijeri naịra asaa?"

    "Ya bụ okwu erijughị afọ. Ihe m ji banye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ iji hụ na obodo kawanyere mma."