Lawan, Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, azochiela Imo steeti

Onyeisi ụlọomiwu ukwu Naịjirịa gara Imo steeti maka emume otu afọ Hope Uzodinma.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu agbaala ọgwụ mgbochi Coronavirus

    Inspector General of Police, Mohammed Adamu

    Ebe foto si, Haruna Mohammed

    Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa gbaa gburugburu bụ Mohammed Adamu agbaala ọgwụ mgbochi coronavirus ụnyaahụ.

  2. NCDC huru nje coronavirus n'ahụ mmadụ 346 ụnyaahụ bụ Wenezde

    NCDC

    Ebe foto si, NCDC

    Ụlọọrụ NCDC hụrụ nje coronavirus n'ahụ mmadụ dị narị atọ, iri anọ na isii (346) ụnyaahụ bụ Wenezde.

    N'ime ha, Ebonyi steeti nwetere iri na anọ (14) ebe Delta steeti nwetere otu onye naani.

    Nke a nwetere ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje na Naịjirịa otu narị puku iri ise na itoolu, narị abụọ na iri ise na abụọ (159,252).

    N'ime ha mmadụ otu narị puku iri atọ na itoolu, na iri ise na itoolu (139,056) agbakeela laa be ha, ebe mmadụ otu puku, narị itoolu na iri asatọ na asatọ (1988) nwurụ n'ime ya.

  3. Igbo bụ Igbo, unu alaasa chi e! Ndụ nwoke, ndụ nwaanyị. Taa bụ Nkwọ. Nkwọ biko kwọtara anyị ihe ọma

  4. Ka chi fo nu!

    Umu Igbo daalụ nụ maka isonye anyị taa.

    Anyị na-atụ anya ịhụ unu echi. Ka ọ dị!

  5. Wetanu akaebe ịgosi na gọọmentị Anambra weere ala unu - Don Adinuba.

      • Onye dere ya, Adline Okere
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo editor, Lagos
    Nwaanyị na-agba egwu

    Ebe foto si, Facebook/NNARAMBIA WOMEN

    Gọọmentị Anambra steeti esila n’ọnụ Kọmishọna mgbasaozi bụ Don Adinuba kwuo na ha akwụọla ndị eweere ala ha were rụọ ọdọụgbọelu ọhụrụ achọrọ ịrụ na steeti ahụ.

    O kwuru na ndị ahụ egosighi ihe akaebe na gọọmentị weere oke ka nke enyere ha.

    O kwukwara na dịka ọ dị ugbua gọọmentị steeti ahụ na-ele anya ịma ma o nwere ala ndị a ga ahapụrụ ndị ahụ na-ewe iwe.

    Mana a na-ele anya ma ọdọụgbọelu ahụ a ga-ebukari etu a tụrụ anya tupu e mee nke a.

    Nke a na-abịa dịka ụmụ nwaanyị gbara ọtọ mee ngagharịiwe n’Aguleri bụ obodo ebe achọrọ ịhibe ọdọụgbọelu ahụ.

  6. Etu ndị ụlọọmeiwu si kwanyere Yuguda Kila ugwu n'ọnwụ

    Ụlọ omeiwu Naịjirịa yighariri nnọkọ ha taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachi iji kwanyere onye otu ha bụ Hassan Kila ugwu n'ọnwụ.

    Kila nwụrụ n'abalị ise gara aga mana ọ na-anọchi anya Gwaram dị na Jigawa steeti n'ụlọọmeiwu.

    Ha ga-amalitekwa ọrụ ha echi bụ ụbọchị iri nke ọnwa Maachị a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Ọbụghị eziokwu na ọ bụ be Igwe n'Anambra ka ahụrụ ọgwụ ntụ

    Cocain ọgwụ ntụ

    Ebe foto si, Press Association

    Akụkọ na-efegharị n'Ikuku taa bụ na ndị ụlọọrụ NDLEA hụrụ ọgwụ ntụ Bekee a kpọrọ "cociane" and ogbo ya "heroine" n'ụlọ otu Eze ọdịnala n'Anambra steeti.

    Akụkọ ahụ sị na e nwetere "cocaine dị "gram" 58.6 nakwa heorine dị gram 13.9 n'ụlọ ha bụ Eze obodo ha akpọghị aha ya.

    Otu onyeisi na ụlọọrụ NDLEA kwuru na ọ bụ eziokwu na ahụrụ ọgwụ ntụ ndị ahụ, mana na-aka ya bụ Eze adịghị na ya.

    O kwuru na ọ bụ ndị nche obodo jidere ndị nwe ya bụ ọgwụ ntụ buru ya buga na be ya bụ Eze n'Obosi bụzị onye kpọrọ ha ka ha bịa buru ya.

    O kwuru na ndị nche ahụ kana achọ onye nwe ya bụ ọgwụ ntụ ka ọ dị ugbua.

  8. Ụlọọrụ NCDC ahụla nje coronavirus n'ahụ mmadụ 371 na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Mọnde

    NCDC na ọnụ ọgụ coronavirus

    Ebe foto si, NCDC

    Ụlọọrụ NCDC huru nje coronavirus n'ahụ mmadụ dị narị atọ, iri asaa n'otu (371 na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Mọnde.

    N'ime ya Enugwu steeti chịtara mmadụ iri isii na ise (65), dịka steeti Legọs ji otu narị na abụọ (102).

    Nke a mere ndị niile butere ya bụ nje na Naịjirịa ka ọ bụrụ otu narị puku iri ise na asatọ, na narị itoolu na isii (158,906).

    N'ime ndị a, mmadụ otu narị puku iri atọ na asatọ, na narị ise na abụọ (138,902) agbakeela laa be ha ebe mmadụ otu puku, narị itoolu na iri asatọ na abụọ (1982) nwuru na ya bụ ọrịa ọjọọ ahụ.

  9. Onyeisi ndị ọrụ ọtawaike nke Covid-19, Boss Mustapha, na ndị isi ọrụ ndị ọzọ alatala ọgwụ mgbochi coronavirus

    Boss Mustapha na ndị ọrụ ya gbara ọgwụ mgbochi

    Ebe foto si, NCDC

    Onyeisi ndị ọrụ ọtawaike coronavirus na Naịjirịa bụ Boss Mustapha na ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ agbaala ọgwụ mgbochi nke AstraZeneca nke mbụ ya ụbọchị Mọnde n'Abụja.

    Nke a mere n'ihu ndị ntaakụkọ mgbe ọ tụpenyere ha azụ dịka ha ha na-eme gwa mgbe gwa mgbe.

    Ya bụ isi ahuru kwawa okpu nke ya bụ ọrụ ọtawaike bụrụkwa odeakwụkwọ ukwu nke gọọmentị etiti bu ụzọ nata ya bụ ọgwụ mgbochi.

    Onye ọzọ sochiri ya n'azụ ịnata ya bụ ọgwụ mgbochi bụ Osagie Ehanire bụ Minista ahụike nke Naịjirịa.

    Ndị ọzọ bụ Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed, Minista gbasara mba ofesi bụ Geoffrey Onyeama nakwa Chikwe Ihekweazu bụ onyeisi ụlọọrụ ndị Nigeria Centre for Disease Control (NCDC), na ndị ọzọ.

    Mustapha nọ ebe ahụ chetere Minista njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika ka ọ gbaa mbo ihu na ọ badoro iwu niile gbasara usoro ịgba ya bụ ọgwụ mgbochi maka ndị na-eme njem dịka mba ndị ọzọ si emeso ndị Naịjirịa na be ya.

    O kwukwara na ha akpabiela ụka gbasara otu ụgbọelụ KLM na nke Emirate ga-esi na-ahụ na onye ọbụla chọrọ iso ha mee njem site Naịjirịa gbara ogwụ mgbochi ahụ.

    Onyeisi ndị National Primary Health Care Development Agency, Faisal Shuaib, bụ onye so gbara ya bụ ọgwụ kọwakwara na ya bụ ọgwụ mgbochi a na-agba ndị mmadụ bụ ofu ụdị ya na nke onyeisiala Muhammadu Buhari gbara.

  10. Unu asaala chi e! Ndụ nwoke, ndụ nwaanyi taa bụ Afọ. Afọ biko fọtara anyị ihe ọma

  11. Kwụsịnụ ịtọrọ ụmụaka na-agụ akwụkwọ! - Aisha Buhari

    Nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Aisha Buhari eziputela ozi gbasara ụbọchị taa bụ nke ewepụrụ iche iji kwanyere ụmụ nwaanyị niile ugwu dị elu.

    Buhari kwuru na ọ ga-adị mma iji ohere nke taa nyere were kelee ụmụ nwaanyị maka enyemaka na mbọ ha na-agba n'ịlụso ọrịa covid-19 ọgụ.

    Okwuru na ọrịa ahụ kachasị metụta ụmụ nwaanyị n'ihi na o mebiere ha ihe ndị gụnyere ọrụ, udo, nakwa mwakpo nke dakwasịrị ha n'aka ezianụlọ ha bụ "domestic violence" na Bekee.

    O bunyekwara ụmụ nwaanyị nọ na mba ụwa niile ụkpa ekele na-asị ha "jisike!"

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Ogbunigwe mberede agbaala n'ogige ndị agha na Equatorial Guinea

    Equatorial Guinea

    Ebe foto si, @O_Brochenin

    Ihe ruru mmadụ iri na ise tufuru ndụ ha ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ogbunigwe gbara n’ogige ndị agha na mba Equatorial Guinea n’ụbọchị Sọnde.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Teodoro Obiang Nguema kọwara na ọ bụ ogbunigwe ‘dynamite’ gbara n’amaghị ama n’ebe edebere ya.

    O kwukwara na ihe kpatara ya bụ ogbunigwe bụ oge ụfọdụ ndị ọrụ ugbo n'okirikiri ogige ndị agha ahụ tinyere ahịhịa ọkụ n'ubi ha.

  13. Anyị ga-ebuli emume ito ọgbọ Obosi - Gọọmentị etiti

    Ito ọgbọ Obosi

    Mịnịstrị mgbasaozi na omenala na Naịjirịa ekwela nkwa na gọọmentị ga-ebuli mmemme ito ọgbọ Obosi ka ọ bụrụzie emume gọọmentị etiti.

    Oriaku Ifeoma Anyanwutaku, onye ji ọkwa Permanent Secratari na mịnịstrị ahụ, kwere nkwa a na mmemme ito ọgbọ nke afọ 2021 e mere n’ụbọchị Satọde, ma kwuo na ha ga aba mbọ ka otu UNESCO sorokwa kwadoo ya bụ emume.

    Ifeoma Anyanwutaku kwuru na emume ito ọgbọ bụ nnukwu emume bara uru bụ nke gọọmentị agaghị ekwe ka ọ laa.

    Emume ito ọgbọ bụ emume a na-eme otu ugboro n'ime afọ atọ, maka ndị okenye rurula afọ iri asatọ maọbụ karịa.

    Ihe e ji eme emume a bụ iji kwanyere ha ugwu ma soro ha ṅụrịa n'ogologo ndụ Chukwu nyere ha.

  14. Onweghị ihe ọgwụmgbochi Buhari gbara mere ya n'ahụ - Garba Shehu

    Buhari

    Ebe foto si, Ụlọọrụ Onyeisiala

    Ụlọọrụ Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ọgwụmgbochi coronavirus nke Onyeisiala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo gbara n’ụbọchị Satọde enweghị ihe ọbụla o mere ha n’ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu kwuru nke a n’ụbọchị Sọnde ma gwa ndị niile na-atụ egwu ịgba ya bụ ọgwụmgbochi ka ha ghara ịtụ uche.

    Garba Shehu kwuru na nke a bụ ozi siri ike iji gbaa ndị mmadụ ume ka ha gbaa ya bụ ọgwụ iji chekwaa ndụ ha.