Lawan, Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, azochiela Imo steeti
Onyeisi ụlọomiwu ukwu Naịjirịa gara Imo steeti maka emume otu afọ Hope Uzodinma.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Agbanyụọla ọkụ gbara n'ụlọahịa dị n'ime Unizik, Awka n'isiụtụtụ Fraịde
Ebe foto si, Haruna Mohammed
Ndị ọrụ mmenyụọkụ Anambra steeti agbaala mbọ mmenyọ ọkụ malitere ịgba n'ụlọahịa dị n'ime Mahadum Unizik n'Awka n'abalị taa.
Ndị uweojii steeti ahụ sị na a gbanyụrụ ya bụ ọkụ malitere iwu ebe elekere mbụ nke isiụtụtụ taa ma mebicha ọtụtu ngwaọrụ ndị mmadụ dịka kọmputa, igweọkụ latrịk, njụonyi nakwa ihe ndị ọzọ dịcha ebe ahụ.
Ndị uwojii sị na ha ka na-enyocha ka ha mara ebe ya bụ mmiri sị baa opi ụgbọghịrị.
Ụmụnwaanyị abụọ ana ebo ebubo maka ịchọ igbu ụmụaka atọ na Federal Housing Estate dị n'Onitsha nọ n'aka ndị uweojii ugbua esi rọdụ n'imi.
Dịka a gbara ha n'anwụ ụnyaahụ, ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na ụmụwaanyị a kpochiri ụmụaka atọ a, ụmụnwoke abụọ na otu nwaanyị n'ụlọ dị na 13 Akunwata Mbamalu street dị na Federal Housing Estate, Onitsha.
Ọ kpọpụtara aha ụmụnwaanyị abụọ a dịka Rejoice Raymond (39) na Chidi Felicia Nwafor (80) ndị ụmụnya dị na Okpuruọchịchị Oyi na steeti ahụ.
Haruna tiri mkpu maka ajọ agwa akpasoro ụmụaka ahụ bụ ndị ahụrụ n'ime ọbara ha maka ahụ ha meruchera.
Haruna sị na nchọpụta gosiri na ha zụtara ụmụaka ahụ n'aka nwaanyị ọzọ na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ gọọment na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka aha ya bụ Sabina Izuorah bụ onye ana achọ achọ ugbua.
Izuorah nọ na-ọsọ ndị ya dịka ọ dị ugbua.
Joe Biden: Amerịka ga-enwete nwereonwe ha n'aka Covid-19 na Jụlaị 4
Aha onyonyo, Biden promises vaccine access to all adults by 1 May
Onyeisiala Joe Biden ekwuola na ya nwere nchekwube na Amerịka "ga-enwere onwe" ha n'aka Covid-19 dịka ha na-eme emume nchete nwere onwe mba ha n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jụlaị 2021.
Ọ bụ n'ime mgbasa ozi pụrụiche Bekee kpọrọ "Primetime Address" ka Biden kwere nkwa a.
Ọ sị na nkwa ya a ga-abịa na mmezu ma ya bụrụ na agbara ndị mmadu ọgwụ mgbochi.
Onyeisiala Biden sị na ya ga-enye iwu ka steeti niile na Amerịka mee ka okenye niile tozuo ịnata ọgwụ mgbochi.
Ugbua, ọ bụ ndị nwere ahụ ha na-arịa nakwa ndị gbagotere n'afọ ka a na-ebu ụzọ enye ọgwụ mgbochi a.
Biden gbasara ozi ya dịka o mere otu afọ a kpọrọ Covid-19 ọrịa mkpa mkpa.
Ọkara nde mmadụ anwụọla n'Amerịka site na ya bu ọrịa.
Unu asaala chi?
Anyị na-asị unu nnọ dika njem iwetere unu akụkọ ụwa taa na-amalite.
Mba atọ ọzọ amachiela ọgwụ mgbochi AstraZeneca
Ebe foto si, Reuters/BBC
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na mba Italy esorola nzọmụkwụ mba Norway na Denmark n'ịmachi ọgwụ mgbochi covid-19 si ụlọọrụ AstraZeneca.
Italy mere nke a dịka mmadụ abụọ nwụrụ dịka agbchara ha ọgwụ ahụ.
Ebe mba Denmark nakwa Norway kwụsịrị ịgba ndị be ha ọgwụ mgboch si ụlọọrụ
Astrazeneca dịka ọbara ụfọdụ mmadụ ndị gbara ọgwụ ahụ malitere kpụkọwa,ebe otu
onye nwụrụ.
Amachikwara ọgwụ mgbochi ahụ na mba Iceland dịkwa na Yurop.
Cheta na ọ bụ ọgwụ mgbochi Astrazeneca a ka ebubatara Naịjirịa n'izu
gara aga.
Mana ụlọọrụ National Primary Health Development Agency kwusiri ike na ha nwere okwukwe na nnyocha emere ọgwụ ndị a.
Ha kwuru na ha ka ga na-enye ụmụ Naịjirịa ọgwụ ahụ rụe mgbe achọpụtara ihe ọhụrụ na ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị ojiegbe awakpoola ụlọakụ abụọ dị n'obodo Okuku dị n'Osun steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na e zuru ihe ruru naira puku narị ise n'ebe ahụ.
O dobeghi anya ma o nwere onye nwụrụ na mwakpo ahụ mana anya hụrụ ebe ihe mere kwuru na ụfọdụ mmadụ merụrụ ahụ dịka agbara ha egbe.
Akụkọ ka na-abịa
Oparanozie ga-akpọrọ nwa agbọghọ tinyere vidio nka bọọlụ ya na Twitter ma zi ya ụzọ
Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Desire Oparanozie ekwuola na ndi otu ya ga-akpọrọ nwa ada nwe akara @Abiso_la na Twitter ma zi ya ụzọ eji abụ ọkaibe na egwuregwu bọọlụ.
@Abiso_la tinyere vidio na Jenuwarị na-egosi ya ka ọ na-agba bọọlụ ma kwuo na ya na-ache ka ụwa hụ akara aka ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 1
Ka ọ kwụ ugbua, ọ dịka chi ya asaala ya ekpere ya dịka Oparanozie sị na ya ga-etinye ya na nkwu ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
@Abiso_la kwuru na obi dị ya ezigbote ụtọ maka ihe a mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 3
Hamed Bakayoko abụrụla onye abụọ nwụrụ n'elu ọkwa Praịm Minista Ivory Coast n'ime ọnwa 8
Ebe foto si, Reuters
Prịam Minista Ivory Coast bụ Hamed Bakayoko anwụọla na mba Jamini bu ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.
Ndị ọrụ gọọmentị mba ahụ sị na Maazị Bakayoko na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa kansa oge ọnwụ zutere ya.
Maazị Babayoko ka gbachara aafọ 56 oge ole maole gara tupu ọnwụ ya abịa.
Ọnwụ a mere ka ọ ka mechara ọnwa asatọ onye ọ nọchiri anya ya bụ Amadou Gon Coulibaly.
Onyeisiala Alassane Outtara kọwara Maazị Bakayoko dịka "nnukwu onye eji eje mba, ma bụrụ onye ndị ntoroọbịa na-ele anya dịka ọ bụkwa onye na a na-atụkwasị obi."
E bu Maazị Bakayoko gawa mba Frans n'ọnwa Febrụawị tupu e buru ya gawa Jamini ka ahu ya na-aka njọ.
.
Ihe mere anyị agaghị ehibe atụmatụ nchekwa dịka Amotekun n'Ọwụwa Anyanwụ - Umahi
Ebe foto si, Ebonyi state government
Aka na-achị Ebonyi steeti ekwuola na ihe mere aka na-achị steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ ejighi kwenye ihibe ihe dị ka Amotekun n'Ọwụwa Anyanwụ.
Umahi sị na eziokwu eziokwu onweghi ihe
dị ka "regional security outfit" na Naịjerịa dum.
Ọ sị: "Onweghi ebe otu ndị nchekwa steeti hibere na-esi steeti ha aga ọrụ na steeti ọzọ. Iwu Naịjirịa akwadoghị atụmatụ regional security network na ụdị a."
Ọ sị na ihe ha were n'Ọwụwa Anyanwụ bụ kọmitee na-enye steeti dị iche ndụmọdụ.
Umahị sị: "Ọ bụ ihe a
iwu NAỊJIRỊA kwadoro."
Ndi na-enye nsogbu maka atụmatu a anọghi na Naịjirịa
Ụmahi gara n'ihu kwuo na ọtụtụ n’ime
ndị na-ekwu maka atụmatụ Ọwụwa Anyanwụ inwe otu ngalaba nchekwa anọghị n’Ọwụwa
anyanwụ.
Ọ sị: "Ha nọ n’ofesi na-eti mkpu. Ha amaghi ihe ọbụla na-eme."
Nsogbu ka mfe n'Ọwụwa Anyanwụ
Umahị si na ọ bụ
eziokwu na nsogbu dị na Ọwụwa Anyanwụ makana ihe na-emetụta mpaghara ndị ọzọ
na-eru ebe ahụ.
Ọ sịkwa na nke bụ eziokwu bụ na onweghi ebe dara juu ruo Ọwụwa Anyanwụ
na Naịjirịa dum.
"Obi dị ndị
na-achị ọwụwa anyanwụ mma maka etu ha siri ruo ọrụ ma dịka ndị ha na-achị."
Onweghi otu
ọrụ nchekwa ọbụla anyi ga-ehiwe n’Ọwụwa Anyanwụ.
N'ịsa ajụjụ ma ha a ga-ege ntị n'oku a na-akpọ banyere inwe ihe dị ka Amotekun, Umahị sị "Anyị were “Joint
Security Commitee” na-ahazi ọnọdụ nchekwa n’Ọwụwa Anyanwu."
Uche ya were bụrụ na nke a zuru ihe a chọrọ ka e mee.
Umahi sịkwa
na onweghi ihe dị iche na atụmatu “Community Policing nakwa vigilantee. Ọ sị na
ha achọghị na ndị uweojii chịwa ndị “community committe” makana o kwesiri ị bụ
ndị obodo nọ n’isi ya. Ọ sị na iwu eji hibe Community Policing ka nke eji hibe
vigilantee mma.
Umahi sị: "Anyị
anabataghị atumatụ nke a nke onyeisi ndị uweojii Naịjirịa wetere. Anyi
ahaziagharịala ya ugbua."
Ndị nnọchite anya Ethiopia nọ n'America 'akwarala lii' maka ọgbaghara dị na Tigary
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ọgbaghara dị na Tigray na-agbasa n'obodo ndị ọzọ dị gburugburu
Berhane Kidanemariam bụ onye nnọchite anya mba Etiopia n'Amerịka agbaala arụkwaghịm maka mkpagbu na mmegbu na-aga n'ihu n'obodo ha, Tigray dị na Etiopia.
Ọ sị "agbaala m arụkwaghị maka mkpochapụ na mkpagbu a na-eme ndị be anyị na Tigray na ndị ọzọ n'Etiopia".
Ọ tara onyeisiala ha bụ Abiy Ahmed ụta maka ịduba mba ahụ na ndagwurugwu onyinye ọnwụ na-ekwu na ya bụ onyeisiala "na-asị asị ọcha".
Isi Puku kwuru puku mmadụ tọrọ na ya bụ ọgbaghara ebe ọtụtụ mmadụ sigoro ebe ah gbaa ọsọ ndụ ha.
Aka na-achị Rivas Steeti bụ Nyesom Wike na-ajụ gọọmentị etiti Naịjirịa ihe mere ha jiri na-arụ ụzọ ụgbọ oloko akpọrọ "Narrow Gauge" ebe ọ bụ "Standard Gauge ka ụwa na-arụzị.
Wike kwuru nke a n'oge ọ na-agbape ụzọ Omuihuechi-Omuoko-Omokiri dị n'obodo Aluu nke dị n'okpuru ọchịchị Ikwerre.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 9 nke ọnwa Maachị ka Minista na-ahụ maka njem bụ Chibuike Amaechi gara njem itiwa ala maka malite ọrụ ụzọ oloko ahụ a na-atụ anya ga-esi Pọt Hacọt gawa Maiduguri.
Ada Charlie Boy bụ Dewy Oputa na-echeta afọ atọ ya na nwaanyị ya malitere ime enye
Dewy Oputa bụ ada oti egwu Charlie Boy mara ewepụtela foto o ji na-ekele nwaanyi ya dịka ha mere afọ atọ kemgbe ha malitere ime enyi.
Dewy kelere enyi ya nwaanyị ma sị ya nwere o bi aṅụrị etu o jiri bụrụ ihe niile o chere.
Cheta na Charly Boy na n'ime afọ 2018, Dewy Oputa na-agbagha onwe ha okwu n'elu soshal midia banyere ọnọdụ nwa ya dịka onye naanị nwaanyị ibe ya na-amasị nke Bekee kpọrọ 'Lesbian'.
Ihe kpalitere okwu ahụ bụ na Charles Oputa, a ma dịka Charly Boy, jiri ihe ya na nwa ya jerela n'afọ anọ ọ chọpụtara na ọ bụ naanị nwaanyị na-amasị ya were dụọ ndị nne na nna ọdụ.
Ya bụ okwu Charly Boy kwuru gbara nwa ya nwaanyị iwe, o wee katọọ nna ya sị na ọ bụ "ọkaa mma n'ama'.
Gụọ maka etu okwu ahụ siri kwụrụ n'oge ahụ n'ebe a
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Atumatụ Onyeisiala Joe Biden ịgbarị ịtarị dọla 1.9 iji tie ndị Amerịka aka n'obi maka mkpa mkpa Covid-19 na-akpa abụrụla iwu dịka ndị omeiwu nta na mba ahụ binyere aka na ya.
Ndi omeiwu 220 sị ka iwu ahụ gawa n'ihu dịka ha meriri mmadụ 211 sị na ha achọghị ya.
Onweghi onye patị Repọblịkan binyere aka ka iwu a gaa n'ihu dịka e mere ntuliaka ya n'ụbọchị Wenesde.
Ndị Sineti Amerịka binyeburu aka na ya bụ atụmatụ tupu enye ya ndị Omeiwu nta.
Ugbua, ya bụ atụmatụ ga-agazị n'ihu Biden ka o mee ya ka ọ bụrụ iwu.
Otu onye omeiwu pati Demokrat ekweghi soro ibe ya binye aka na ya bụ iwu.
Ọ bụ n'ụbọchị Fraịde ka Biden ga-ebinye aka n'atụmatụ a iji me ya iwu.
Biden kwekwere nkwa na ya ga-eke mba ụwa ọgwụ mgbochi Covid-19 mafụtara ma ndị Amerịka natachaa nke ha.
Ebe foto si, Getty Images
Covid-19 gburu mmadụ 2,286 na Brazil n'ime ụbọchị Wenesde
Ebe foto si, Reuters
Ndị Covid-19 gburu kwa ụbọchị na Brazil agafeela mmadụ 2,000 dịka ọrịa ahụ na-abanwanye.
Mba ahụ bụ ebe coronavirus kachasị gbuo mmadụ n'ụwa dum.
Ọ bụ mmadụ268,370 nwụrụla site na ya bụ ọrịa na mba ahụ
Brazil na-eso mba amerịka n'azụ n'ọnụọgụgụ ndị ọrịa gburu. Mmadụ 2,286 nwụrụ n'ụbọchị Wenesde.
Ndị ọkachamara n'akọwa na ụdịrị ọrịa a pụtara ọhụrụ mere ka ọ na-efesa ndị mmadụ karịa ụdị nke dibu mbụ.
Onye bụbu onyeisiala mba ahụ bụ Luiz Inacio Lula da Silva katọrọ aka na-achị mba ahu bụ Jair Bolsonaro maka etu o si kpaa agwa dịka ọrịa na-abanwanye.
Maazị Bolsonaro, bụ onye foto gosiri ka o yi mkpuchi ime mbụ n'ime otu ọnwa n'ụbọchị Wenesde nọbụ na-eme ekwu okwu ma na-akpa agwa ka ọrịa enweghị ihe ọ bụ.
Anyị ga-ewetere unu akụkọ sepụtere isi si ụwa dum tupu anyị emechie akwụkwọ nke taa.
Ya gaziere unu.
Kedụ ebe Coronavirus kwụ akwụ taa?
Ndị niile a jụrụ ịnye visa n'oge nke Trump nwereike itinyegharị akwụkwọ ugbua
Ebe foto si, Reuters
Ụlọọrụ mba Amerịka bụ State Department ekwuola na ndị niile anapụrụ visa sịte na mkpachị onyeisiala mba ahụ chiburu bụ Donald Trump, ọkachasị ndị ụka Alakụba na ndị ọzọ sị Afrịka nwereike itinyegharị akwụkwọ ugbua.
Onyeisiala Joe Biden tụgharịrị ya bụ iwu Trump tiri o ji kpachie mba Alakuba iri na atọ na mba Afrịka ndị ọzọ mgbe ọ banyere ochịchị n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Jenụwarị ọ malitere ọrụ.
Biden kpọrọ ya "mmetọ aha obodo anyị" bụ ihe ndị ahụ Trump mere.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Dept of State bụ Ned Price sị ndị niile a jụrụ ịnye visa tupu Jenụwarị 20, 2020 bịa tinye akwụkwọ ọhụrụ ma kwụọ ụgwọ maka ya.
Mana ndị ọbụla a jụrụ ịnye akwụkwọ ikike visa na 20 2020 Jenụwarị maọbụ tupu mgbe ahụ eruo ga-abịa tinyegharịa akwụkwọ ma ghara ịkwụ ụkwọ obula.
Agaghịzị agbanye ndị ọzọ a jụrụ ịnye akwụkwọ ikike "diversity Lottery" tupu afọ a eruo.
Gọọmentị mba US mepụtara "diversity lottery" maka ndị mba ana awọkarị njọ visa.
Cristiano Ronaldo akwarala ngwongwo
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Cristiano Ronaldo na Andre Pirlo bụ onye nkuzi Juventus
FC Porto agbapụla Cristiano Ronaldo na ndị otu ya bụ Juventus n'asọmpi
Champions League oge ha zutere onwe ha n'abalị Tuzde.
Juventus meriri asọmpi ahụ n'abalị Tuzde site n'inye goolu atọ asatara abụọ, mana FC Porto meriburu ha site n'inye goolu abụọ asatara otu oge ha zutere nke mbụ izuụka atọ gara aga.
Nke a pụtara na ha nyere onwe ha ọkpụ goolu anọ anọ, mana FC Porto gafere n'agba nke ọzọ n'ihi iwu 'away goal'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ihe anyị ga-eji ego James Ibori mee - Gọọmentị etiti
Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha na-atụ anya ịnata ego dị nde paund anọ na ụma abụọ n'aka mba UK, bụ nke aka chịburu Delta steeti bụ James Ibori zuru n'ohi.
Cheta na a tụkpuru Ibori n'ụlọ mkpọrọ na UK n'afọ 2012 n'ihi na o zuuru ego gọọmentị Delta steeti oge ọ bụ gọvanọ.
Ugbua, gọọmentị Naịjirịa na nke UK ekwetala na ha ga-eweghachi ego ahụ Ibori zuru n'ohi.
Ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami kwuru na ego ahụ ga-aba n'ọrụ dị icheiche gọọmentị ji n'aka.
Malami kọwara na ego ahụ agaghị agara Delta steeti n'ihi na mbọ niile a gbara iji nata ego ahụ bụ gọọmentị etiti gbara ya.
Ọrụ dị icheiche gọọmentị ga-eji ego ahụ rụọ gụnyere: Akwa mmiri Niger nke abụọ, Okporoụzọ Abuja-Kano, nakwa okporoụzọ Lagos-Ibadan.