Ọkụ agbaghị n'Aso Rock - Ụlọọrụ onyeisiala Naịjirịa

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọ bụghị n'ime Aso Rock ka ọkụ gbara.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Gịnị mere ndịagha awakpoghị ndị ọchịehi etu ha si wakpo ndị ESN? - Gọvanọ Ortom

    Samuel Ortom

    Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Samuel Ortom na-ekwusi ike na ndịagha Naịjirịa na-ele anya n'ihu n'etu ha si arụ ọrụ ha.

    Ortom kwuru na ọ bụrụ na ndị agha wakporo ndị otu 'Eastern Security Network', gịnị mere na ha anaghị awakpo ndị ọchịehi na-eyi ndị mmadụ egwu na Benue steeti nakwa mpaghara dị icheiche na Naịjirịa?

    O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'obi gọọmentị dị na Makurdi.

    "Gịnị kpatara ha ji gba nkịtị ka ndị Fulani si mba ọzọ bata na Naịjirịa bịa na-enye anyị nsogbu?" Samuel ortom na-ajụ.

    "Onweghị mba ọzọ ha nwere ike ịbanye otu ahụ, naanị Naịjirịa."

    "N'ọdị nso a ka ndịagha wakporo otu Eastern Security Network'. Ọ bụ eziokwu na otu ahụ ezighi ezi n'iwu, akwadoro m gọọmentị ka a kwụsị ha, mana gịnị kpatara ndị agha awakpobeghị ndị ekperima Fulani otu ahụ?"

    "Gịnị mere na gọọmentị agaghị eji ụgbọelu wakpo ndị ekperima ndị a dịka ha si awakpo ndị mmadụ na mpaghara ndị ọzọ?"

    "Ọ bụ ya ka m ji na-ekwu na ikpe ziri ezi adịghị na Naịjirịa."

  2. Ihe karịrị mmadụ nde abụọ edebanyela aha ịgba ọgwụmgbochi covid19

    Ọgwụmgbochi coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Ngalaba National Primary Health Care Development Agency ekwuola na ihe karịrị mmadụ nde abụọ edebanyela aha ịgba ọgwụmgbochi covid19 na Naịjirịa.

    Onyeisi ngalaba a bụ Faisal Shuaibu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV.

    O kwuru na n'ụbọchị Mọnde ka gọọmentị wepụtara usoro ndị mmadụ ga-esi gosipụta mmasị ha ịgba ya bụ ogwụ site n'ịntaneetị.

    "Site n'ụbọchị Mọnde ahụ ruo taa bụ Wenezde (March 3), ihe ruru mmadụ nde abụọ na ụma atọ (2.3 million) edebanyela aha ha iso gbaa ya bụ ọgwụ mgbochi)," Faisal Shuaibu kwuru.

    Ọ gara n'ihu kọwaa na ma onyeisiala Muhammadu Buhari, ma osote ya bụ Yemi Osinbajo, nakwa ya onwe ya bụ Faisal Shuaibu, ga-agbacha ya bụ ọgwụmgbochi iji gosi na ọ naghị egbu mmadụ maọbụ emerụ mmadụ ahụ.

    O kwukwara na ọbụghị eziokwu na ndị ọgaranya ga-ebu ụzọ gbachaa ya bụ ọgwụ tupu o rute ndị nkịtị.

  3. ihe gọvanọ Obiano kwuru ka eme ndị ọchị ehi nọ n'Anambra

    Willie Obiano

    Ebe foto si, Wilie Obiano's twitter page

    Aka na achí steeti Anambra Willie Obiano enyela iwu ọhụrụ igụ ndi Fulani na achị ehi na ya bụ steeti ọnụ ọgụgụ n'isi n'isi.

    Governor nyere iwua ụnyịahụ na ọgbakọ ndi nwere aka oke nokwu nchekwa na ụlọezumezu prof Dora Akunyili women centre di na Awka isi obodo ahụ.

    Obiano onye kwuru na agụrụ ndi Fulani ọnụ n'is n'iisi na afọ gara aga, gbanyere na emeche nke ọhụrụ a, na ndi uwe oji n'ụlọrụ nchekwa ga eme onye fulani ọbụla ahụrụ na akwụgharị na ya bụ steeti ihe ana eme onye omekome.

    Ọ gbanyere na ọ bụ ha na egbu, kwaso ndi mmadụ ikonike, amaja ndi mmadụ, ruturu aka na ọtụtụ nime ha n'ebu ngwa ọgụ na-eji egbe ezu ma etinyekwa aka na mkpamkpa di iche iche.

  4. A tọhapụla onye ntaakụkọ BBC anwụchiri n'ebe nsogbu Tigray dị n'Ethiopia

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    A tọhapụla Girmay Gebru bụ onye ntaakụkọ BBC ndị agha nwụchịrị n'ebe nsogbu dapụtara na Tigray dị na mba Ethiopia.

    Akụkọ na-ekwukwa na ndị ntaakụkọ anọ ọzọ anwụchiri ya na ha enwerela onwe ha.

    O nweghị ikpe a mara ha.

  5. 'Ndị ọrụ burunụ ngaghariwe bụgara ndị ụlọomeiwu n'Abuja nakwa steeti ụnụ - NLC

    Ndị otu NLC

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọtụ jịkotara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress agwaala ndị otu ha niile ka buru ngaghariwe gawa n’ụlọ ndị omeiwu malite n’ụbọchị Wednesday nke izu ụka na-abịanụ.

    Nke a gụnyere ụlọomeiwu ukwu dị n’Abuja nakwa nke niile dị na steeti dị iche iche na Naịjirịa.

    NLC nyere ndị otu ha iwu ime ngahariwe a iji gwa ndị ụlọomeiwu na obi adịghị ha mma maka etu e si nye ndị gọvanọ steeti ikike ịkanye ụgwọopekatampe ndi ọrụ.

  6. Ụtụtụọma ndị ọma

    Gwunyenụ na BBC Igbo. com ka ịmata akụkọ nile na-ekpo ọkụ ụgbụa n'ala Igbo , Naịjirịa nakwa mba ụwa.

    Nnọọ!

  7. Ekpeziela udo n'etiti Gọvanọ Bauchi na nke Benue

    Nyesom Wike, Bala Mohammed, Samuel Ortom, Ahmed Finitri

    Ebe foto si, Gov Nyesom Ezenwo Wike

    Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ekpeziela udo n'etiti Samuel Ortom na-achị Benue steeti nakwa Bala Mohammed na-achị Bauchi steeti.

    Nke a mere na isiobodo Rivas steeti bụ Potakọt dịka Gọvanọ Rivas bụ Nyesom Wike nakwa Ahmed Finitri na-achị Adamawa nyere aka mee nke a.

    Mohammed kwuru na esemokwu dapụtara n'etiti ya na Samuel Ortom maka ndị ọchiehi bu nke wutere ya nke ukwu.

  8. Akụkọ gbasara coronavirus ka ọ dị taa

  9. Ọgwụ mgbochi covid-19 awụchiela n'Abuja

    Ọgwụ mgbochi covax awụchiela na Naịjirịa

    Ọgwụ mgbochi covid-19 site n'atụmaatụ covax awụchiela n'Abuja.

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu na gọọmenti etiti nabatara ọgwụ ahụ n'ọdọugboelu 'Nnamdi Azikiwe international Airport' n'ụtụtụ a.

    Ọnụ na-ekwuru WHO kwuru na ọ bụ ọgwụ mgbochi ruru nde anọ batara taa bụ March 2,2021 n'Abuja.

    O kwuru na ọ bụ mmadụ pasenti 20 ka nke a batara ugbua ga-ekpuchi ndị bụ ndị ka nwecha mkpa ahụike.

    O kwuru na ọ ka fọrọ ọgwụ mgbochi ruru nde iri asatọ na anọ ka ga-abata na Naịjirịa.

    Cheta na ọ bụ ngalaba World Health Organisation site n'atụmaatụ COVAX mere ka ọgwụ a bata Naịjirịa aka.

    Peter hockings bụ onye ụlọ ọrụ UNICEF na Naịjirịa gwara ụmụ Naịjirịa na ụjọ atụla ha ịgba ọgwụ mgbochi makana ọ dị mma n'ahụ.

    O kwuru na ndị bee ya agbaala ya, o nweghị ihe ọjọ ọbụla o mere ha.

    Ụgbọelu bu ọgwụ mgbochi covax bata na Naịjirịa
  10. Ndị agha anwụchiela onye ntakụkọ BBC

    Girmay Gebru

    Ndi agha ejichiela onye ntakụkọ ọlụọrụ BBC na arụ ọrụ n'ogbe ebe enwere tigbuọ zọgbuo na mba Ethopia. Akụkọ kwuru na ejichiri Girmay Gebru na arurụ ụlọọrụ BBC Tigrinya ọrụ na mmadu anọ ndi ọzọ na mekelle nke isi obodo ahụ.

    Ndi ọzọ ejichiri gunyekwara ndi ntakụkọ ;Tamirat Yemane, Alula Akalu na Fitsum Berhane.

    Ụlọrụ BBC amabeghị ihe mere e ji nwụchịe nwa amadi a mana ha e gosila gọọmenti Ethiopia nwute ha maka nwuchi a.

  11. A tọhapụla ụmụakwụkwọ nwaanyị 300 a tọrọ na Jangebe

    Jangebe

    Onyeisiala Muhammadụ Buhari ekwupụtala obi nzunzu yz na enweghi atụ maka ntọghapụ atọpụrụ ụmụkwụkwọ ndi inyom na Steeti Zamfara.

    O kwuru na o sonyere ezinụlọ ha, ụmụamala Zamfara n'ala NaijIria n'ịnabata ụmụaka a arịrị ribidoro bụ ndi enwerela onwe ha.

    Cheta na atọhapụla ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị a tọrọ n’ụlọakwụkwọ obibi dị na Jangebe.

    Kọmịshọna na-ahụ maka nchekwa na steeti Zamfara gwara BBC nke a ma kwuo na ụmụakwụkwọ ahụ nọ na Gusau ugbua.

    O kwuru na ọ bụ ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị ruru 279 ka a tọrọ ma kwuo na ọnụọgụ 317 e kwuburu na ndị ekperima tọọrọ abụghị eziokwu dịka o nweghị nwata akwụkwọ ka nọ n'aka ndị ọjọ ahụ.

    A tọọrọ ụmụakwụkwọ a n'ụbọchị Fraide, March 27, 2021.

    A na-atụ anya na gọọmenti ga-agwa ha okwu n'ụtụtụ a.

    A mabeghị ma o nwere ego ọ bụla a kwụrụ ndị ekperima a iji nwete ntọhapụ ụmụakwụkwọ ndị ahụ.

  12. Ụtụtụọma ụmụ Igbo

    Dabata ka anyị malite ịwetere gị akụkọ akpụ n'ọnụ n'ala Igbo nakwa Naịjirịa nile.

  13. Kedụ ebe Coronavirus kwụ akwụ taa?

  14. Anyị kacha ndị ọzọ egbu onwe anyị - Ralph Uwazurike

    Ralph Uwazurike

    Ralph Uwazurike bụ onyeisi otu MASSOB akpọọla oku ka ndị gọvanọ ọwuwa anyanwụ mara ihe ha ga-eme ọnọdụ nchekwa n’ala Igbo.

    O kwuru ka ndị mmadụ kwụsị ihe ọbụla na-ebute ndị agha ịbịa n'ala Igbo n'ihi na ọ bụ ndị Igbo ka ha na-egbu ma ha bịa.

    O kwuru na ọnọdụ ahụ na-echekasị ya na-echekasị ndị ọzọ.

    Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru gụịnyere:

    - Onye anọghị n’ala Naịjirịa a na-ekwu ihe na-eme na Naịjirịa

    - Na-agwa ndị mmadụ ha mebie ihe, kparịa ndị ọchịchị ma tinye ndụ ndị ọzọ na nsogbu.

    -O nweghi mgbe ndị Igbo na agbụrụ ọzọ na Naịjirịa ga-alụ ọgụ chaa chaa

    - O nweghi onye ga-akwanye ndị Igbo n’esemokwu ọzọ.

    - Ndị ntorobịa anyị anaghịzị eche echiche ọfụma, ilee anya na soshal midia, ị ga-ahụ ebe ha na-akparị ndị ọchịchị anyị,ọ dịrịzie ka ọ bụ agwa e ji maara ndị Igbo

    - O kelere Hope Uzodimma na Nyesom Wike maka etu ha si mee ihe dị na Obigbo nakwa Orlu.

  15. Atụọla Nicolas Sarkozy nga afọ atọ maka nrụrụaka

    Nicholas Sarkozy

    Ebe foto si, Reuters

    Onye bụbu onyeisiala mba Fransị bụ Nicolas Sarkozy ga-aga nga afọ atọ maka nrụrụaka.

    Ikpe mara Sarkozy dị afọ 66 dịka achọpụtara na ọ nwara ịnye otu onye ọkaikpe ego aka azụ iji chọpụta ihe maka otu ndorondoro ya.

    Onye okaikpe ahụ nakwa onye bụbụ onye ọkaiwu Sarkozy nwetara otu nga ahụ udịka ikpe mara ha niile.

    Mana enyela ohere ka Sarkozy nọrọ n'ụlọ gaa mkpọro nke ya.

  16. Etu m ga-esi nyere ndị otu Ipob aka - Sheik Gumi

    Sheik Gumi

    Ebe foto si, Sheik Gumi Facebook page

    Sheik Ahmed Gumi ekwuola na ọ ga-enyere nwafọ igbo ọbụla ga-agwa otu IPOB ka o tinye nma ya n'ọbọ aka tinyekwara otu ndi ọzọ ọnụma juru obi n'ala Naijirịa.

    Gumi kpuhere nke a na mkparita ụka onwere netiti onye nta akụkọ anyi, kwuru na iwe ndi ekperima na akpamkpa na mpagara ugwu ala naijeria bụ na gọọmentị leghara ha anya jụ ikpọ ha ọkpụkpọ oku udo.

    O kwuru na mkparitaụka udo ka na-aga n’ihu n'etiti ha na ndi ekperima a tọrọ ụmụakwụkwọ ndi inyom nke ụlọakwụkwọ Government Girls Secondary School di na Jengebe nke Steeti Zamfara ịhu na ha nwere onwe ha oge na-adighi anya.

    Nwa amadi a bụ onye nkuzi otu okpukperechi ụka alakụba kwuru na ekwesighị ihụta ndi ekperima bandit dika ndi omekome kama ihụta ha dika ndi aghaọlụọọla n’uche obi ya.

    Ọ gbanyekwara na ọbụghi ndi ekperima (bandit) ya na ha adakọrita ntị bụ ndi tọrọ ụmụakwụkwọ umụnwanyị ahụ kama na maara ndi tọrọ ya bụ ụmụkwụkwọ nke ọma.

  17. Lee ka onyeisiala Ghana si gbaa ọgwụ mgbochi covid-19 taa

    Onyeisiala Ghana na nwunye ya ebe ha na-anata ọgwụ mgbochi covid-19

    Ebe foto si, Screengrab

    Onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo- Addo abụrụla onyeisiala mbụ natara ọgwu mgbochi covid-19 sitere na covax, atụmaatụ zụrụ mba ụwa ọnụ iji hụ na e kere ya bụ ọgwụ mgbochi nhatanha nye mba ndị na-enweghị ka ọ ha ha.

    Ọtụtụ mba bụ aka ji akụ agbawarịị ọgwụ mgbochi a mana mba ndị na-enweghị ego ka na-eche ka ha nata ọgbụgba ọgwụ mgbochi a nke mbụ.

    Nwunye ya bụkwa Rebecca Akufo-Addo natakwara ọgwụ a dịka a ka ga-agba mmadụ ruru puku narị isii nọ na Ghana.

    Mba ahụ na-agba mbọ ịhụ na mmadụ ruru nde iri abụọ natara ọgwụ mgbochi a tupu afọ a agwụ.

  18. Ihe gọọmenti Zamfara mere maka ntọghapụ ụmụakwụkwọ 300 ndị ntọ tọọrọ

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Reuters

    Aka na achi Steeti Zamfara Bello Mohammed etiela aka na-ala dee n’ire kwuo na ọchichị ya ga eme ihe nile aka ya ruru ihụ na atọghapụrụ ụmụakwụọ ụmụnwanyị Jengebe ahụ atọrọ na ya bụ steeti.

    Ụlọ ọrụ mgbasa ozi channels nọburu ụnyiahụ kwuo na atoghapụla ụmụakwụkwọ ndi inyom Government Girls Science seccondary school a di narị atọ na iri na asaa na aka ndi ekperima tọọrọ ha mana gọọmenti Zamfara kwuru na ọ bụghị eziokwu.

  19. Igbo ndị ọma!

    Ụnụ abọọla chi?

    Bute oche gị pasaa na BBC Igbo .com ka imata nke ekwe na-akụ n'ala Igbo nakwa Naịjirịa.