Gịnị mere ndịagha awakpoghị ndị ọchịehi etu ha si wakpo ndị ESN? - Gọvanọ Ortom

Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Samuel Ortom na-ekwusi ike na ndịagha Naịjirịa na-ele anya n'ihu n'etu ha si arụ ọrụ ha.
Ortom kwuru na ọ bụrụ na ndị agha wakporo ndị otu 'Eastern Security Network', gịnị mere na ha anaghị awakpo ndị ọchịehi na-eyi ndị mmadụ egwu na Benue steeti nakwa mpaghara dị icheiche na Naịjirịa?
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'obi gọọmentị dị na Makurdi.
"Gịnị kpatara ha ji gba nkịtị ka ndị Fulani si mba ọzọ bata na Naịjirịa bịa na-enye anyị nsogbu?" Samuel ortom na-ajụ.
"Onweghị mba ọzọ ha nwere ike ịbanye otu ahụ, naanị Naịjirịa."
"N'ọdị nso a ka ndịagha wakporo otu Eastern Security Network'. Ọ bụ eziokwu na otu ahụ ezighi ezi n'iwu, akwadoro m gọọmentị ka a kwụsị ha, mana gịnị kpatara ndị agha awakpobeghị ndị ekperima Fulani otu ahụ?"
"Gịnị mere na gọọmentị agaghị eji ụgbọelu wakpo ndị ekperima ndị a dịka ha si awakpo ndị mmadụ na mpaghara ndị ọzọ?"
"Ọ bụ ya ka m ji na-ekwu na ikpe ziri ezi adịghị na Naịjirịa."













