Ọkụ agbaghị n'Aso Rock - Ụlọọrụ onyeisiala Naịjirịa
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọ bụghị n'ime Aso Rock ka ọkụ gbara.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chioma Obianinwa
Pope agaala njem nleta na mba Iraq
Ebe foto si, getty
Onyeisi ụlọụka Katọlik mba ụwa niile bụ Pope Francis agaala njem nleta mba Iraq.
O mere nke a n'agbanyeghị na adọrọ ya aka gbasara ọrịa coronavirus nakwa okwu nchekwa dị na mpaghara ahụ.
Njem ya dị mkpa n'ihi na ọ bụ mbụ Pope ọbụla na-aga njem na Iraq.
Ọ bụkwa njem mba ọzọ o merela kemgbe ọtụtụ mba ụwa malitere ịmachi obodo n'ihi ọrịa coronavirus.
Dkt. Cyprian Nyong abụrụla onye mbụ gbara ọgwụ mgbochi coronavirus na Naịjirịa.
Dkt. Cyprian Nyong abụrụla onye mbụ gbara ọgwụ mgbochi coronavirus na Naịjirịa.
O so n'otu na ndịisi ọrụahụike ịnara ọgwụ mgbochi a. O so na ndị buru ụzọ rụwa ọrụ n'ụlọọgwụ nnọpụiche dị na ụlọgwụ nọ na mahadum, Gwagwalada dị n'Abuja.
O so na ndị na-eleta ndị bu ọrịa Coronavirus kamgbe March 2020.
D kt Nyong na dọkịnta ndị ọzọ ruru 150 na-arụ ọrụ ahụike sokwa nara ya bụ ọgwụ mgbochi a.
OPEC agbaala afa maka ọnụahịa mmanụ ụgbọala irielu
Ebe foto si, Reuters
Otu mba na-emepụta mmanụ agbidi n'ụwa bụ Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC) agbaala ama na ọ bụrụ na ọnụahịa mmanụ agbidi gafee dọla iri asaa na ọnụahịa mmanụ ụgbọala nwereike iru narị Naịra abụọ na Naịjrịa.
Ihe nwereike ibete nke a bụ maka mbuda otu ahụ budara mmanụ agbidi ole ha na-eresi ndị ụwa maka ịme ka ha nwetekwuo uru na ya bụ ahịa.
Ọkụ agbaala ebe ana ere ngwaahịa rọba n'Ọnịcha
Ebe foto si, Haruna Mohammed
Ụgbụa ndị uweojii na-elebe anya n'ihe butere ọkụ ọgbụgba n'ahịa rọba dị n'Amobi street n'Ọnịsha n'ime abalị Fraịda.
Agbanyụọla ya bụ ọkụ ka ọ dị ugbua bụ nke agbagbughị onye ọbụla.
Ndị uweojii sị na ha agbichibidola ebe ahụ maka igbochi ndị aka ntụtụ.
Akụkọ anyị nụrụ sị na ọ bụ ịnyeaka ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ ka ya bụ ọkụ jị nyụọ.
Onyeisi ndị uweojii n'Anambra steetti bụ Monday Bala Kuryas bụ onye gara ebe ahụ na-arịọ ndị mmadụ ka ha na-ejisike agbanyụcha ọkụ latirki ha tupu ha alaa mgbe ha gbasara ọrụ.
Chelsea arọwala Donnarumma nke AC Milan anya
Ebe foto si, European Pressphoto Agency
N'asiri gbakaa ute egwuregwu taa, Chelsea na arọ Gianluigi Donnarumma nke AC Milan anya ịnọchi ochee goolu ha bụ Kepa Arrizabalaga na sizin n'abịa.
Ha dị nkwadebe itinye ọkpụrụkpụ nde Euro iri n'isi ya.
Chaịna abanyela ọrụ ịkpachikwu Hong Kong
Ebe foto si, Getty Images
Chaịna e kwuola na ha ga-emegharị iwu e ji atụ vootu na Hong Kong nke ga-enyeaka ịhọpụta ndị ga-erubere gọọmentị ha isi.
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị patị National People's Congress ga-etinye ọnụ na ya bụ okwu n'ọgbakọ ha ga-enwe otu izuụka bụ nke ọtụtụ ndị otu ha gbakọgoro na Beijing.
Nke a na-abịa dịka Hong Kong mechere isiike ịmegharị usoro ọchịchị ga-eme ka ha si na okpuru Chaịna pụọ.
Aka akparala otu nwoke na-ere SIM kardị adịgboroja
Ebe foto si, Reuters
Aka ndị ọrụnchekwa ndị Nigeria Civil Defence akparala otu nwoke na-ere SIM kardi mba ofesi na Computer Village Legọs.
Ndị ọrụnchekwa ahụ ha na ndị Nigeria communication Commission na-arụkọ sị na ya bụ nwaadị gbara afọ iri atọ na ise dara iwu dị na agba nke iri atọ na otu nke NCC Act 2003.
Ndị beanyị ụnụ asaala chi e! Chiokike nọnyere anyị niile taa bụ afọ
Supreme Court mba Ghana enyela Nana Akufo-Addo mmeri
Ebe foto si, Facebook
Nkọwa foto, Nana Akufo-Addo na John Mahama
Ụlọikpe kachasị na mba Ghana akụchapụla akwụkwọ John Mahama gbara nke o ji agbagha mmeri Nana Akufo-Addo na ntuliaka mba Ghana e mere n'ọnwa Disemba afọ 2020.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ Nana Akufo-Addo meriri na ntuliaka ahụ, ma kwukwaa na John mahama ejighi okwu.
John Mahama gbara akwụkwọ n'ụlọikpe wee kwuo na Nana Akufo-Addo emerighi ntuliaka ahụ, kama na nrụrụaka dị na ya.
Mana ụlọikpe kwuru na ihe akaebe o gosiri ha ezughị iji kwuo na Akufo-Addo emerighi.
Buhari na Osinbajo ga-ebu ụzọ Gbaa ọgwụmgbochi coronavirus
Ebe foto si, Yemi Osinbajo
Nkọwa foto, Buhari na Osinbajo
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo ga-ebu ụzọ gbaa ọgwụ mgbochi coronavirus.
Onyeisi ngalaba 'National Primary Health Care Development Agency' bụ Faisal Shuaib kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.
Faisal Shuaibu kwuru na Buhari na Osinbajo ga-agba ya bụ ọgwụ n'ụbọchị Satọde, abalị isii nke ọnwa Maachị afọ 2020.
O kwukwara na odeakwụkwọ gọọmentị bụ Boss Mustapha ga-agbakwa ya bụ ọgwụ na Satọde, ebe ndị Mịnịsta na ndị ọzọ ha na Buhari na-arụkọ ọrụ ga-agba ya n'ụbọchị Mọnde.
Nke a bụ iji mee ka ndị mmadụ nwee ntụkwasị obi na ọgwụmgbochi coronavirus anaghị egbu mmadụ, ọnaghịkwa emerụ mmadụ ahụ.
Shuaibu kwuru na gọọmentị ga-ekwupụta oge onyeisiala na osote ya ga-agba ya bụ ọgwụ n'ụbọchị Satọde.
Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo bịara njem otu ụbọchị n'Enugu
Ebe foto si, @Osinbajo
Osote President, Yemi Osibanjo bịara mmemme ekpere otu ụbọchị nke ndị Penticostal Fellowship of Naijiria agalaba nke Enugwu chịkọbara n'Okpara square.
Ya bụ Ekpere otu ụbọchị nke ekpere na ụbọchị wenezde 3rd n'ọnwa March 2021 bụ nke ndị isi ụka Pentikọstal niile nọ na Naijiria chikọbara.
Isi okwu ya bụ ekpere otu ụbọchị bụ "Unguenchable Light"
Ka ọ dị ugbua Osote Onyeisiala Yemi Osibanjo alaghachila Abuja.
Ndị ụlọakwụkwọ Anambra steeti emeela ngagharịiwe maka mwakpo ụmụakwụkwọ
Ebe foto si, Haruna Mohammedu
Ka ọ dị ugbua otu jikọrọ ndi nwe ụlọakwụkwọ emela ngagharị udo iji kwo oloo nyere mmetọ ụmụaka na steeti Anambra.
Dika ọ na anabata ha,onyeisi ndi uweoji na ya bụ steeti Bala Kuryas nke onye osote ya nọchịrị anya ya kwuru na alọọrụ ndi uweoji na steet ahụ ga-eme ka mmetọ ụmụaka na steeeti ahụ bụrụ akụkọ ochie.
Sadiq Daba alaala mmụọ
Ebe foto si, Sadiq Daba
Otu nwa amaadi bụ akaochie na mgbasaozi n’ikuku na ime ejije bụ Sadiq Daba anwụọla.
Akụko onwụ ya tikapụrụ n’ikuku n'abalị ụnyaahụ bụ Wenezdee.
Nwa amaadi a bụ ejewe ahaghị na-ime ejije nọ na akwaọria kamgbe tupu ọkawanye njọ bụkwanu nke butere ọnwụ ya.
Cheta n'afọ 2017, Sodiq Daba pụtara kwuo na o nwere ọria ọbara nwa bekee kpọrọ Leukemia, ebe ọtụtụ ndi ọnụrụ ube nwanne gbata ọsọ n'ala Naijrịa gbatara ya ọsọ enyemaka.
Ndi mmadụ gụnyere onye buburu osote onyeisiala Atiku Abubarkar , Kunle Afolayan, Joe Odumakin na ndi ọzọ ezigalara ezinulọ nwamaadi a lara nmụọ ozi itiaka n'obi..
Onye Eze na Legọs steeti bụ Ọba Riwan Akiolu ekwuola ihe furu na be ya mgbe awakpọrọ ya na ngwụcha ngagharịiwe Endsars
Ebe foto si, LSG
Onye Eze Lagos, Eze Riwan Akiolu ekwuola na ndi ekperima wakporo ụlọ ya n'oge emere ngagharịiwe #ENDSARS zuru ego ya di ijeri dọla abụọ tinyekwara nde naịra iri na asaa.
Nna ọdinla a kwupụtara nke a ụnyaahụ n'ihe omume igbape ụlọezumezu glover memorial hall di na Lagos.
Mmadụ iri atọ na-asatọ anwụọla na ọgbaghara Myanmar
Ebe foto si, Reuters
Opekata mpe mmadu iri atọ na asọtọ anwụọla na mba Myanmar ụnyaahụ site na ihe otu mbaụwa hụtara dika ikwafu ọbara ana ahutụbeghi mbụ kamgbe nsogbu ịdọkpụrụ ọkwa ọchichi n’ike malitere na mba ahụ n’ ime otu ọnwa .
Onye ji anya ya hụ kwuru na ndi ọrụ nchere kwawara igwe mmdụ mgbọ egbe aghara aghara.
Onye ọrụ otu mbaụwa na mba Myanmar bụ Christine Schraner Burgener kwuru na ihe onyonyo esetere na awụ akpataoyi.
Enwela ọtụtụ ngaghariiwe na obodo ahụ tinyekwara enweghi nrube isi na aka ndi nkiti gbagburugburu ya bụ mba kamgbe ndi agha dọkpụrụ ọkwa ọchichị kamgbe abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afo a.
Ndi n’eme ngagbarịwe agala n’ihu ikpọ ọkpụkpọ oku ka akwụsị ọchịchị ndi agha nakwa ntọghapụ ndi isi ọchichi mbahụ batara site na ntuliaka mba ahu mere, tinyekwara Aung San Suu Kyi onye ndi agha kwapụrụ noche nike ma jichie kwaya
Ụmụ ibe unu asaala chi e! Ndụ mmiri, ndụ azụ.
Ka chi fo
Ụmụ Igbo, ka anyị wụsa ọwa ebe a na nke taa.
Ka ọ dị nụ echi.
Ndị oji egbe egbuola nwanne Gabriel Suswam, aka chịburu Benue Steeti
Nkọwa foto, Terkura Suswam
Ndị ekperima agbagbuola Terkura Suswam bụ nwanne Gabriel Suswam aka chịburu Benue steeti.
Onye enyemaka ya aha ya bụ Solomon sokwa nwụọ oge ndị ekperima ahụ wakporo ha.
Ndị uweojii Benue steeti kwuru na ihe a mere n'abalị Tuesday oge Terkura Suswam nọ n'ihu ụlọ ya di nso na Elohim Plaza na-elepụ anya.
Ndị ekperima ahụ bu ụgbọala Toyota Camry.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Benue State bụ Anene Sewuese Catherine, kwuru na tupu ebuga mmadụ abụọ ahụ n'ụlọọgwụ NKST, ọ bụrụ na ha anwụọla.
Gọvanọ Samuel Ortom kwuru na gọọmentị ya ga-agba mbọ ịgba ndị ekperima kpara arụ ahụ n'anwụ.
Ndị Fada 25 na ndị Rev. Sr 60 anwụọla na Tanzania n'ihi ọrịa yitere covid19
Ebe foto si, TEC
Nkọwa foto, Fr Charles Kitima bụ odeakwụkwọ nke otu Tanzania Episcopal Conference
Ụka Katọlik
na mba Tanzania ekwuola na ndị ụkọchukwu iri abụọ na ise nakwa ndị Rev Sister
iri isii anwụọla n’ime ọnwa abụọ gara aga n’ihi ọrịa yitere covid19.
Fr Charles Kitima bụ odeakwụkwọ nke otu Tanzania Episcopal Conference kwuru na ọrịa covid19 na-akpa ike na Tanzania n'agbanyeghị na gọọmentị achọghị ime ihe ọbụla maka ya.
Gọọmentị Tanzanịa anaghị ekwe ewepụta ezigbo ngụkọ maka ọrịa covid-19 na mba ahụ.
Fr Kitima kwuru sị: "Ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ichekwa onwe anyị n'ihi ọrịa a, ọ kachasị ndị okenye na ndị na-arịabu ọrịa."
"Nke ka njọ bụ na ndị mmadụ anaghị enyocha onwe ha. ụlọụka anyị nwere ụlọọgwụ 500 n'obodo a mana anaghị ekwe ka anyị nyochaa maka covid19, anyị enweghịkwanụ akụrụngwa eji eme ya bụ nnyocha."
Cheta na onyeisiala Tanzania bụ John Magufuli kwuru na coronavirus abụghị maka ndị kwere na Chineke.