Etu NDLEA si jichie 'Cocaine' ruru 30bn naira

Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru naira billion iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo and Chioma Obianinwa

  1. Naịjiria enwetakwuola ọgwụ mgbochi nde 41

    Osagie Ehanire bụ minista ahụike na Naịjiria ekwuola na Naịjiria enwetakwuola ọgwụ mgbochi Covid-19 ruru nde iri anọ na otu, mana a mabeghi mgbe ya bụ ọgwụ ga-atụ ụkwụ na Naịjiria.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba ahụike NCDC chọtakwuru mmadụ narị asatọ na iri isii na anọ bu ya bụ ọrịa na Naịjiria.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Ndeewo

    Nnọọ dịka ị bịara ịnọnyere anyị taa.

    Ị ga-ahụ akụkọ ndị ga-amasị gị ebe a taa.

  3. Ka ọ dịnụ echi

    Igbo bụ Igbo, n'ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa na nke taa.

    Rahụnụ jụụ.

  4. E wetara m mgbanwe pụrụ iche n'otu ndị agha Naịjirịa - Tukur Buratai

    Tukur Buratai

    Ebe foto si, Nigerian Army

    Nkọwa foto, Buratai kwuru nke a oge ọ hafere ọchịchị n'aka Ibrahim Attahiru onye nọchiri anya ya

    Tukur Buratai, onye jibu ọkwa 'Chief of Army Staff' na Naịjirịa ekwuola na ọchịchị ya wetara mgbanwe bụ ọpụrụiche n'otu ndịagha Naịjirịa.

    Buratai kwuru nke a n'Abuja oge ọ na-enyefe ọchịchị n'aka Ibrahim Attahiru bụ onye ọhụrụ onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere n'ọkwa ahụ.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ The Cable si depụta, Buratai kwuru na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ọ rụrụ dịka onyeisi ndị agha Naịjirịa.

    O kwuru sị: "Ọtụtụ ihe dị iche adịla n'otu ndịagha Naịjirịa n'ihi ọkpụrụkpụ atụmatụ dị icheiche m webatara nakwa ihe niile m mere dịka 'Chief of Army Staff'."

    "Ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa kawanyere mma oge m nọ n'ọchịchị."

    "Ihe a ga-eji echeta ọchịchị m bụ na omume ndịagha kawanyere mma, ọnọdụ ọdịmma ndị agha kawanyere mma, ọchịchị onye kwuo uche ya esiwanyekwala ike na Naịjirịa."

    Buratai gwara onye na-anọchi anya ya ka o soro nzọụkwụ ya ma mere gaa n'ihu.

    Attahiru kwere nkwa na ọ ga-agbalị ike ya dịka onye isi ndị agha, ma rịọkwaa nkwado ndị agha ibe ya iji hụ na ọchịchị ya gara nke ọma.

  5. Gere akụkọ coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji.

  6. Ihe mere ọgụ jiri daa n'ụlọ omeiwu Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde

    Ọgụ PIB

    Ebe foto si, Youtube Screengrab

    Ọsọ gbara ihu agbaala azụ dịka ọgụ dapụtara n'ụlọ ndị omeiwu Naịjirịa n'Abụja n'ụbọchị Tọzde.

    Ọgụ a dara n'ọgbakọ ndị omeiwu kpọrọ iji tulee iwu 'Petroleum Industry Bill' bụ nke a na-achọ imepụta ọhụrụ.

    Ndị omeiwu kpọrọ oku ka ndị obodo e si na be ha amịpụta mmanụ agbidi bịa tinye ọnụ ha n'iwu PIB ahụ, n'ihi na ọ bụ ha ka iwu ahụ ga-aka metụta.

    Mana oge a kpọrọ oku ka ndị obodo kwuo okwu, otu onye biliri ọtọ ikwu okwu, mana onye nke ọzọ ekweghị ya kwuo.

    Nghọtahie a butere nnukwu ọgụ, ebe dimkpa abụọ ahụ malitere ịpịarịta onwe ha ọkpọ.

    Ọ bụ ndị ọrụ nchekwa nọ nso oge ya bụ ihe na-eme bịara gbosaa ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  7. Naịjirịa gbara ndị nke 149 na mba ebe nrụrụaka kacha njọ

    Buhari na Osinbajo

    Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa

    Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo

    Naịjirịa gbara ndị nke otu narị na iri anọ na itoolu (149) na ngụkọ mba ebe nrụrụ aka kacha njọ nke a kpọrọ 'Corruption Perception Index' na bekee.

    Ọ bụ ụlọọrụ 'Transparency International' wepụtara mpụtara ngụkọ a n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.

    Ha kwuru na ọ bụ mba otu narị na iri asatọ (180) ka ha nyochara na nke afọ 2020.

    Mpụtara nke afọ 2019 gosiri na Naịjirịa gbara ndị nke otu narị na iri anọ na isii, mana ha dakwara ogoogo atọ ruo otu narị na iri anọ na itoolu n'afọ 2020.

    Dịka 'Transparency International' si kwuo, ihe mere Naịjirịa ji nọrọ n'ọnọdụ a gụnyere: enweghị ụzọ doro anya e si eme ihe, ịma mmadụ, enweghị atụmatụ doro anya e si ebuso nrụrụaka agha, ịna aka azụ nakwa ịnapụ mmadụ ihe n'ike nke e ji mara ndị uweojii Naịjirịa, nrụrụaka na mpaghara nchekwa nakwa ndị ọzọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Mmadụ 384 tọrọ atọ na Saudi Arabia alọghachila Naịjirịa

    Ndị si Saudi Arabia lọta

    Ụmụ Naịjirịa dị narị atọ na iri asatọ na anọ bụ ndị tọrọ atọ na mba Saudi Arabia alọghachila.

    Gọọmentị malitere ịgba mbọ ịkpọghachi ndị ahụ oge ha bere akwa arịrị n’ihe onyonyo pụtara na soshal midịa iji kọwaa etu e si emekpa ha ahụ na mba ahụ.

    N'elekere mbụ nke ehihie ụbọchị Tọzde ka ụgbọelu bu ha tụrụ ụkwụ n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed dị na Legọs.

    Ha dị ụmụnwoke narị atọ na ụmụnwaanyị iri asatọ na atọ nakwa otu nwatakịrị e ku n'aka.

    Dịka ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ofesi si kwuo, ndị Naịjirịa narị asatọ na anọ bụ ihe tọrọ atọ na Saudi Arabia.

    Ndị ọzọ fọrọ afọ ga-alọghachi n'ụbọchị Fraịde dịka ha si kwuo.

    Ndị si Saudi Arabia lọta
    Ndị si Saudi Arabia lọta
  9. Ndị agha ụmụnwaanyị Alakụba ga-eyiwazị mkpuchi isi ha bụ Hijab n'elu uwe ndị agha a

    N'Afrịka, ụmụnwaanyị ndị agha Alakụba mba South Africa e nwetala mmerị dịka ndị agha mba ahụ nyere ha ikike iyiwezị akwa mkpuchi isi ha kpọrọ Hijab n'elu ụwe agha ha

    Nke a sitere na mkparịta ụka ndị Legal Resource Centre bụ otu kwuuru onwe ha na ndị South African National Defence Force.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Aka ndị uweojii Anambra steeti akparala otu nwoke ji shọvelụ kụgbụọ nwunye na nwa ya nwaanyị

    Shọvelụ

    Ebe foto si, Haruna Mohammed

    Aka ndị uweojii Anambra steeti akparala otu nwoke ji shọvelụ gbụọ nwunye na nwa ya nwaanyị gbara afọ anọ. Kọmishọna ha na steeti ahụ bụ John Abang enyela ndị ọrụ ya iwu ka ha malite ịma imi n'ala ịmata ihe mere ya bụ nwaamadị jiri kpaa ụdịrị arụ ahụ.

    Chukwuemeka Obijofa gbara afọ iri abụọ na asatọ ka ha na-akọwa na o ji shọvelụ gbụọ nwunye na nwa ya gbara naanị afọ anọ werekwa ya bụ shọvelụ meruo onye nche bịara igbo ya ọgụ ahụ.

    Ndị uweojii bụ ndị bịara ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mechere sị na ha buuru nwaanyị ahụ na nwa ya gawa ụlọọgwụ dị na Ozubulu bụ ebe ndị ọrụahụike nọ kpebịe na ha anwụọla.

    Ndị uwojii enwebeghị ike ịkọwa ihe tinyere ya bụ nwaamadị n'ụdị agwa ahụ.

  11. Ndị agha nwaanyị 300 agawala ilusọ ndị omekome ọgụ

    Ndị agha Naịjirịa akpọpụla ụmụ nwaanyị ndị agha ruru narị atọ n'okporụzọ Abuja - Kaduna nke ndị ntọ wegharala kemgbe otu afọ gara aga.

    Ha kọwara na nke a bụ iji mee ka oke ntọrọ, oke izuohi na ogbugbu na-eme ebe ahụ belata.

    Dịka ha si gwa BBC, ihe ruru ụmụnwaanyị otu narị nọ ebe ahụ ugbua ebe ndị ọzọ ka nọ n'ụzọ a ga-ebe ahụ.

    Ndị agha nwaanyị

    Ebe foto si, Defence HQ

  12. Sheffield United emeela Manchester United njọahia site n'ịgba ha ọkpụ goolu abụọ asatara otu.

    Manchester United na Sheffield United

    Ebe foto si, Reuters

    N'egwuregwu, Sheffield United e jirila ọkpụ goolu abụọ asatara otu wụọ Manchester United n'ala n'asọmpị Premier League agbara ụbọchị Wednezde n'Old Trafford.

    Ihe ịtụnanya na ya bụ egwuregwu bụ na ebe Manchester United bụ ndị abụọ, Sheffield United bụ ndị ikpeazụ n'okpokoro Premier League.

    Sheffield United mere Manchester United njọahịa dịka ọ fọrọ ha naanị akara atọ ka ha gbagoro ọnọdụ mbụ n'okpokoro premier League.

  13. EU na UK etinyewala ọnụ n'esemokwu ha gbasara ọgwụ mgbochi coronavirus

    Ọgwụ mgbochi Coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Mba EU na Uk ekwuola na ha ga-agba mbọ kpezie okwu dapụtara n'etiti ha abụọ gbasara ọgwụ mgbochi coronavirus.

    Ụlọọrụ UK na arụpụta ọgwụ Astrazeneca kwuburu na ha agaghị enyezu EU ọgwụ ole ha kweteburu na ha ga-eresi ha bụ nke EU jiri gbaa isiakwara na nke ahụ agaghị eme.

    AstraZeneca kwuburu na ha agaghị emezụ nkwa ha maka ịresị EU ọgwụ mgbochi ole ha na ha kwekọrịtaburu n'ime ọnwa January ruo Maachi 2021.

    Nke bụ eziokwu bụ na EU etinyebeghị aka n'akwụkwọ nke gosiri na ha nabatala ya bụ ọgwụ ahụ bụ nke ha kwesiri ịme echị bụ Fraịde, mana ga atụọla ahịa ya bụ ọgwụ ndị Mahadum Oxford ruputara.

  14. Aka ndị uweojii Anambra steeti akparala Onyeze Jesus

    Onyeze Jesus

    Ebe foto si, ABS

    Aka ndị uweojii Anambra steeti ji nwaadị ahụ bụ Onyebuchi Okocha bụ onye na-etu Onyeze Jesus.

    Ama gbaara ụlọọrụ ntaakụkọ ABS dị n'isiobodo steeti ahụ sị na e nwere ike ịkpụpụ ya ụlọikpe taa bụ tọzde maka ịmetọ ego Naịjirịa nakwa ịgba dị mmadụ o ji n'ọrụ n'anwụ na soshal midia.

  15. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Anyị amalitela njem ọzọ taa!

    Akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ ka anyi ga na-ewetara unu.

  16. Ụnụ na Onyeze Jesus emekọkwala ihe - Gọọmentị Anambra

    Onyeze Jesus

    Ebe foto si, Facebook Screengrab

    Gọọmentị Anambra adọọla ụlọọgwụ nakwa ụlọ ozu dị icheiche na steeti ahụ aka na ntị ka ha na otu nwoke kpọrọ onwe ya onye ụkọchukwu aha ya bụ Onyeze Jesus ghara ịmekọ ihe ọbụla.

    Ha dọrọ aka na ntị a dịka Onyeze Jesusu kwuru na ya ga-akpọlite mmadụ asaa nwụrụ anwụ n'ọnwụ n'ụbochị Tọzde, abali iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

    Onyonyo ebe ya bụ ụkọchukwu na-etu ọnụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ agbasaala ebe niile na soshal midia.

    Mana gọọmentị Anambra adọọla aka na ntị ka onye ọbụla zeere ya bụ nwa amadị.

    N'akwụkwọ ozi si n'aka Mazi Nwankwo Nwabueze, onye ji ọkwa 'Permanent Secretary' na ngalaba ahụike Anambra, gọọmentị kwuru na ụlọọgwụ ọbụla maọbụ ụlọ ozu ọbụla ha na Onyeze Jesus mekọrọ ihe, ga-anata ntaramahụhụ.

    Akwụkwọ ozi si n'aka ngalaba ahụike Anambra

    Ebe foto si, Gọọmentị Anambra

    Nwabueze kwuru sị: "Ndụ na ahụike ndị Anambra bụ ihe kacha anyị mkpa n'oge ugbua."

    "Dịka ọrịa coronavirus na-efegharị, ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ nwereike inwe ya bụ nje mana ha agaghị nnyocha tupu ha anwụọ."

    "Ọ bụrụ na mmadụ metụ ozu dị otu a ahụ, nje coronavirus nwere ike ife onye ahụ. Nke a ka anyị achọghị."

    Nwabueze gara n'ihu kwuo na Onyeze Jesus bụ onye "magic", nke na-aghọgbu ndị mmadụ ma na-anakọrọ ha ego.

    "Gọọmentị Anambra agaghị ekwe ka e were ụlọọgwụ na ụlọ ozu dị na steeti a were mee ihe ezighi ezi n'iwu," Nwankwo Nwabueze kwuru.

  17. Atiku agbazuola ọgwụ mgbochi Covid

    Abubakar Atiku, bụbu osote onyeisiala Naịjirịa, agbazuola ọgwụmgbochi Covid-19 ya.

    Onyonyoo mgbe Atiku na-agbazu ya bụ ọgwụ pụtara n'ụbọchị Wenezde n'ọbaozi ụlọọrụ ntaakụkọ Punch.

    Atiku gbara ọgwụmgbochi nke mbụ n'izuụka gara aga, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ghara ige ntị n'asịrị niile na-efegharị gbasara ya bụ ọgwụ mgbochi.

    Ọ bụ n'ụlọọgwụ dị n'obodo Dubai nke mba United Arab Emirates ka Atiku gbara ọgwụ a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Buhari ezutela ndị isi nchekwa ọhụrụ

    Service Chiefs

    Ebe foto si, Presidency

    Nkọwa foto, Ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari zutere n'Aso Rock n'Abuja n'ụbọchị Wenezde

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ezutela ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ ọ họpụtara n'ụbọchị Tuzde.

    Ha bụ Leo Irabor onye ji ọkwa Chief of Defence Staff; I. Attahiru onye e nyere ọkwa Chief of Army Staff, A.Z Gambo bụ Chief of Naval Staff; na I.O Amao bụ Chief of Air Staff.

  19. Were naanị otu nkeji gere akụkọ gbasara coronavirus n'Afrịka taa bụ Wenezde.

  20. Bịa gere akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a