Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru naira billion iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Jessica Nwankwo and Chioma Obianinwa
O nweghị ihe anyị na-ezo maka Bojeti 2021- Onyeisiala Buhari
Ebe foto si, Muhammadu Buhari Twitter Page
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọchịchị ya agaghị ezo ihe ọbụla gbasara ime ihe niile dị na bọjeti 2021.
O gwara ndi natakụkọ nke a na Daura dị na Katsina mgbe ọ gara ndenye aha n'akwụkwọ nke pati ya bụ All Progressive Congress nso nso a.
Onyeisiala Buhari kwuru na ya bụ bọjeti 2021 bu ọtụtụ ihe ọchịchị bu n'obi imere ụmụ Naịjirịa, ya mere a ga-eme ihe niile iji hụ na e mezuru ihe ndị n'ime ya.
Igbo ndịoma ụtụtụọma nụ!
Ụbochị taa mara ụnụ mma.
Sonyere anyị taa ka ịmata akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa.
Ka chi foo nu!
Daalụ dịka ị sonyere anyị taa...rahụ nụ duuu
Gụọ akụkọ ga-amasị gị n'otu Nkeji
WHO ekwuola na otu EU na-egbochi mba ndị ọzọ ịnweta ọgwụ mgbochi Covid-19
Ebe foto si, Reuters
Ngalaba WHO akatọọla atụmatụ ndị ọchịchị European Unin wepụtara nke ha sị na-egbochi ịkesa ọgwụ mgbochi emepụtara n'etiti EU.
WHO na-ekwu na ya bụ atụmatụ jọgburu onye ya ma sịkwa na ọ ga-eme ka ọrịa covid-19 nọtee aka krịa etu ọ kwesiri.
Ọ bụ dịka ndị EU hiwere iwu na mba ọbụla nọ n'etiti EU na emezubeghị nkwekọrịta ya na mba ọzọ nọkwa na EU nwere maka ọgwụ mgbochi covid-19, agaghị eresi mba ọzọ ọgwụ ahụ tutu ha mezuo ya bụ nkwekọrịa.
Kama ndị EU kwuru sị, "ọ bụ ịchekwa ndị nke anyi bụ ihe kacha dị mkpa ugbua, ọ bụ nsogbu chere anyị n'ihu mere anyị jiri hiwe atụmatụ a".
CHAN 2021: Otu egwu bọọlụ mba DRC anabataghị nyocha Covid-19 emere ha.
Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-erute anyị ndị na-akọwa na ndị otu egwu bọọlụ Democratic Republic of Congo bụ ndị eji 'Leopards' mara ajụla ịnabata nyocha vocid-19 emere ha.
Ya bụ nyocha gosiri na ndị otu ha mmadụ iri na atọ bụ ya bụ ọrịa.
Otu bọọlụ mba DRC na nke mba Kamerun kwesiri ga-agba asaompi agba nke anọ iko African Nations Cup nke afọ 2020 n'ụbọchị Satụde.
Mmadụ iri na atọ a gụnyere onye nkuzi otu ndị DRC bụ Florent Ibenge .
Mana enweghị onye otu bọọlụ mba Kamerun nyocha gosiri bụ ya bụ ọrịa nke mere ka ndị otu DRC gbaa isi akwara were sị ka emegharịa ya bụ nyocha.
Mpụtara nyocha a ga-apụta taa tupu ebido ya bụ asọmpị na-elekere asaa nke abali satụde.
Gọọmentị Rivers State arụọla ụlọọrụ ọhụrụ nye ndị uweojii steeti ahụ.
Ebe foto si, Nyesom Wike/ Twitter
Gọọmeti Rivas steeti enyela ndị uweojii ụlọọrụ ọhụrụ nke dị na Kpopie n'okpuruọchịchị Gokana na steeti ahụ.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Nyesom Wike kwuru na arụchara ya bụ ụlọ ọrụ kamgbe afọ abụọ gara aga, kama ndị omekome wakporo ya bụ ụlọọrụ.
Wike nyefere kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Joseph Mukan ya bụ ụlọ nke gụnyere ebe ha na-arụ ọrụ nakwa ebe obibi ha.
Tammy Danagogo bụ onye nọchitere anya Gọvanọ Wike kwuru na gọọmentị rụrụ ya bụ ụlọ iji nyere ndị uweojii aka ịchekwa akụnaụba na ndụ ndị mmadụ.
Mukan kelere gọọmentị Rovas steeti ma sị na ọ bụ ndị uweojii pụrụ iche ga-ewere ọnọdụ na ya bụ ụloọrụ ọhụrụ.
Ọ rịọkwara Wike ka ọ nyere ndị uweojii aka zụtara ha ụgbọala na ihe ndị ọzọ ga-eme ka njem dịrị ha nfe.
Mukan gwakwara ndị obodo na steeti ahụ na ndị uweojii ha na-ahụ n'obodo ha bụ maka nchekwa obodo ha.
Ndị uweojii anwụchiela otu nwaanyị zoro ozu nne afọ iri
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na Japan anwụchiela otu nwaanyị zoro
ozu nne ya nwụrụ kemgbe afọ iri gara aga.
Ha kwuru na o mere nke a n’ihi na ọ chọghị ịkwapụ n’ụlọ
ahụ ebe ya na nne ya bi n’isiobodo Tokyo.
Nwaanyị ahụ aha ya bụ Yumi Yoshino zoro ozu nne ya n'ime igwe njụoyi tupu achọpụta ozu ahụ mgbe a na-ehicha ya bụ ụlọ.
Ndị uweojii kwuru na o nweghi ihe ngosi dị n'ahụ nwaanyị ahụ gosiri na emerụrụ ya ahụ tupu ọ nwụọ.
Yoshino nọ n'otu ụlọoriri dị na obodo Chiba tupu anwụchie ya n'ụbọchị Fraịde.
Anambra steeti ebidola nnyocha ahịa ha maka covid-19
Ebe foto si, ABS Radio Tv
Gọọmentị Anambra steeti abanyela ahịa atọ na steeti ahụ
gụnyere ọchanja, ahịa new tyre nakwa ahịa new parts ịchọpụta etu e si edebe iwu
covid-19 ebe ahụ.
Nke a na-abịa dịka gọọmentị etiti na-etule ụfọdụ
steeti ndị ha ga-agbachi iji belata mfesa ọrịa covid-19.
Kọmịshọna ahụike na steeti ahụ bụ Maazị Ọkpala kọwara na steeti ya na-agba mbọ n'ihe gbasara covid-19 site n'ikuziri ndị ahịa ahụ etu ha ga-esi chekwa onwe ha.
Ahịa ndị ọzọ ha gara na ya bụ ndị nọ na mpaghara Ọnịcha.
Kadụna steeti ga-agbape ụlọakwụkwọ na Febụwarị 1
Ebe foto si, Unicef/Facebook
Kadụna steeti ga-agbape ụlọakwụkwọ pramarị na sekọndrị
n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị
Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahụ maka ahụike nakwa
nke na-ahụ maka agụmakwụkwọ nwechara nzụkọ.
Ụlọakwụkwọ ndị a ga-agbape gụnyere SS3, JS3 nakwa JS1 ebe Pramarị 6, 5 nakwa 4 n'ụloakwụkwọ ndị gọọmentị enweghi ga-agbape.
Onyeodeakwụkwọ ebighebi na ngalaba agụmakwụkọ bụ Phoebe Yayi bụ onye kwuputara nke a.
Klasị ndị ọzọ n'ụlọakwụkwọ pramarị nke gọọmentị agaghị emepe rue mgbe etinyere usoro gbasoro iwu nchekwa covid-19 na ha.
Mmadụ ise anwụọla na mberede ụgbọelu na Cuba
Mmadụ ise anwụọla na mba Kuba dịka ụgbọelụ helikọpta
nke ndị agha mba ahụ kpọkasịrị n’akụkụ uguwu.
Ụgbọelu ahụ na-eme njem site na Holguin gawa
Guantanamo mgbe nke a mere.
Mmadụ 27 ọzọ anwụọla site n'ọrịa covid-19
Mmadụ iri
abụọ na asaa anwụọla na Naịjirịa site n’ọrịa coronavirus dịka ngalaba NCDC si
kwuo.
Ọzọ, mmadụ
ruru otu puku na otu narị na iri na anọ bụkwa ọnụọgụgụ ndị butere ya na Naịjirịa
n’ụbọchị Fraịde.
N’otu aka
ahụ Mukhtar Muhammad bụ onye na-elekọta etu ihe sị aga n’otu gọọmentị etiti
kpokọbara maka ọrịa coronavirus ekwuola na e nwereike ịgbachị ọtụtụ obodo ukwu
maka ọrịa a.
O kọwara na
nnyocha ha mere gosiri na ọ bụ na obodo ukwu dịka Legọs, Abuja nakwa Plateau ka
ọrịa a kachasị efe efe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Umu Igbo unu abọọla chi?
Nnọọ nụ na peeji anyị taa.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok enwerela onwe ha
Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-ekwu na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị otu Boko Haram tọọrọ kamgbe afọ 2014 n'obodo Chibok dị na Borno steeti enwerela onwe ha.
Otu n'ime nna ụmụakwụkwọ a gwara BBC na ya na nwa ya nwaanyị kpara nkata o were gwa ya na ọ nwerela onwe ya.
Nwoke a gwara BBC na nwa ya gwara ya na ọ bụ mgbe a na-alụ ọgụ ka ya na ndị atọrọ si mpaghara ọzọ were ohere ahụ gbaa ọsọ.
Akụkọ na-ekwu na ya bụ nwata nwaanyị nọ Maiduguri ugbua.
Cheta na otu Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ ruru narị atọ na obodo Chibok nke mere ka ụwa niile tie mkpu.
Gọọmentị Naijirịa agbalịala n'ime afọ isii ịnapụta ụmụaka otu narị n'ime ndị a tọrọ site n'aka Boko Haram.
EU egosila ụwa akwụkwọ nkwekọrịta ha ji zụta ọgwụ mgbochi AstraZeneca
Otu European Union egosila ụwa akwụkwọ nkwekọrịta ha ji gote ọgwụ mgbochi coronavirus n'aka ụlọọrụ AstraZenaca.
Nke a n'abịa dịka Kọmishọna ha bụ Ursula von der Leyen mailtere ịkwa ụlọọrụ na-arụpụta ya bụ ọgwụ ọkụ n'ike kemgbe ha sị na ha agaghịzị enweike ibunyecha EU ọgwụ ole ha kwụrụ ụgwọ ya na mbido.
Ursula sị na ya bụ akwụkwọ ha tinyere aka na ọnwa Ọgọst gara aga "nwere iwu dị n'ime ya nke onye ọbụla kwesiri idebe".
EU siri onwu gbaa ya bụ akwụkwọ nkwekorịta n'anwụ iji gosi na Britain enupula isi na nkwekọrịta ha.
Mba Uk na otu EU na-enwe nghọtahie maka ọgwụ mgbochi coronavirus bụ nke Britain na-akọwa na ha agaghị enweike ibunyecha ha ole ha kweburu na nkwa na mbụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Nnyọcha egosila na ọgwụ mgbochi Novavax dị ire ruo pasentị 89
Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi Novavax dị ire iji gbochie coronavirus ruo pasentị 89.
Ọgwụmgbochi a bụ Novavax dịkwa ire iji gbochie ụdị nje coronavirus a chọpụtara na ọhụrụ na UK.
E nyochakwara ọgwụmgbochi Novavax na mba South Afrịka, ebe mpụtara ya gosiri na ọ dị ire ruo pasentị iri isii (60%) iji gbochie ụdị nje coronavirus ọhụrụ a chọpụtara na mba ahụ
Praịm Mịnịsta UK bụ Boris Johnson kwuru na nke a bụ nnukwu oziọma ma kwukwaa na ngalaba ahụike mba ahụ ga-amalite nnyocha nke ha maka ya bụ ọgwụmgbochi.
Mba UK enwetalarị ihe ruru nde iri isii maka ọgwụ ahụ bụ nke a ga-arụpụta n'obodo Stockton-on-Tees na mba England.
Ọ bụrụ na ngalaba ahụike a kpọrọ 'Medicines and Healthcare Products Regulatory Agency' (MHRA) kwadoo ọgwụmgbochi a, a ga-amalite ịgba ya ndị mmadụ n'agba nke abụọ afọ 2021.
Ugbua, mba UK akwadola ọgwụmgbochi atọ maka iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus, ha gụnyere: nke ndị ụlọakwụkwọ Oxford University na ụlọọrụ Astrazeneca rụpụtara, nke ụlọọrụ Pfizer na BioNTech rụpụtara, na nke ụlọọrụ Moderna rụpụtara.
Ụlọikpe Holland ekwuola ka ụlọọrụ Shell kwụọ ndị ọrụ ubi ụgwọ maka imebi ala ha.
Ebe foto si, Reuters
Ụlọikpe nọ na mba Holland enyela iwu ka ụlọọrụ Shell nke Naijirịa kwụọ ndị mmadụ anọ bụ ndị ọrụ ubi na Naijirịa ego iti aka n'obi maka imebi ugbo ha.
Ekpere ya bụ ikpe afọ iri na atọ.
Ụlọkipe mkpesa a nke dị na Hague kwukwara na ụlọọrụ Shell ga-elinye pịpụ nke ga-egbochi mmanụ agbidi imebi ala.
Otu 'Friends Of the Earth' nke mba Holland bụ ndị na-ama ọkwa maka ọdịmma ụwa dọnyekwara ndị ọru ubi a ukwu.
Ndị ọrụ ugbo a si obodo Goi, Oruma na Ikot Ada Udo ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa.
Ndị Naijirịa 424 tọrọ na mba Saudi Arabia alọtala Naijirịa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naijirịa nọ mba ofesi bụ Baike Dabiri edepụtala n'akara Twitter ya na mmadụ narị anọ na iri abụọ na anọ bụ ndị Naijirịa tọrọ na mba Saudi Arabia atụọla ụkwụ na Naijirịa.
O kwuru n'akara Twitter ya sị, " Ndị a niile ga-edopu onwe ha iche abalai iri na anọ dịka iwu nchekwa covid-19 siri dị".
Dabiri dọkwara ndị Naijirịa aka na ntị ka ha hapụ iji ụzọ na esighị ezi abanye mba ndị ọzọ.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Cicely Tyson
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, N'afọ 2018, Cicely Tyson ritere ntuurugo Oscar, nke mere ya nwaanyị isi ojii mbụ na-erite nturuugo a site na nkwanye ugwu
Cicely Tyson bụ ome ejije Hollywood a ma
ama anwụọla ka ọ dị afọ 96.
Tyson megidere ejije ruo na nka, ọkachasị
ejije na-akụziri ndị mmadụ maka ndị isi ojii bụ akwaa a kwụrụ.
Ọ bụkwa onye na-eji ahụ ya ere ahịa nke
Bekee kpọrọ “fashion model”.
Lee ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya:
A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Disemba 1924 ọ nwụọ n'ụbọchị 28 nke Jenụwarị 2021
Ọ lụrụ di mbụ ya mgbe ọ dị afọ 18 n'afọ 1942, mana mgbe di ya hapụrụ ya ka ọnwa 18 ha lụchara gafere, o mechara lụgharịa di ọzọ n'afọ 1981 mana ha gbasakwara n'afọ 1989
Ọ mụru nwa nwaanyị mgbe ọ dị afọ 17
Na ndụ ya, ọ naghị ata anụ, naanị akwụkwọ nri na mkpụrụosisi; ọ bụ ihe Bekee kpọrọ "Vegetarian"
O ritere
nturuugo Emmys abụọ maka ejije o mere nke a kpọrọ "The Autobiography of Miss Jane Pittman"
O ritere mkpokọta Emmy atọ, nrite Black Reel anọ, otu Screen Actors Guild, otu Tony Award nakwa otu Peabody Award wdgz
Onyeisiala Barack Obama nyere ya ihe nrite "Presidential Medal of Freedom" n'afọ 2016 n'ihi ihe ndị o meterela dịka onye na-eme ejije nakwa etu o si eji ejije akụzi ihe ndị mere mgbe gboo
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
O kweghi eme ejije ọbụla na-anaghị egosi na ụmụnwaanyị ndị isi ojii bụ akpụrụka; o kweghi eme ndị nke na-egosi ndị isi ojii dịka ndị omekome, ndị odibo maọbụ ndị ọjọọ
O mere ejije ihe ruru afọ iri asaa (70)
A ka biputara akwụkwọ gbasara ndụ ya nke a kpọrọ "Just As I Am" n'ụbọchị 26 nke ọnwa Jenụwarị 2021
O nwetala kpakpando e dere aha ya nke a kpọrọ "Hollywood walk of fame" maka ejije
Ebe foto si, Getty Images
Ya na Tyler Perry bụ ome ejije ndị isi ojii a ma ama mekọrọ ọtụtụ ejije
Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ Ophelia Harkness n'ejije How To Get Away With Murder, bụrụ Binta (nne Kunta Kinte) n'ejije Roots bụ ejije maka ihe ndị ohu gabigara n'aka ndị ọcha na-ere ohu
Ọ bụ Myrtle n'ejije ndị Tyler Perry mere ndị gụnyere Diary of a Mad Black Woman nakwa Madea's Family Reunion
Ọ bụkwa Alice n'ejije A Fall from Grace nakwa Regina "Nana Mama" Cross n'ejije Alex Cross
Taiwan kwanyekwara onwe unu ugwu o - Chaịna
Ebe foto si, Getty Images
Chaịna adọọla
Taiwan aka na ntị na atụmatụ ha isi n’okpuru Beijijng nweta nnwereonwe bụ agha
ka ha na-achọ.
Ịdọ aka na ntị a
na-abịa dịka ndị agha Beijing kekwuru nkwụcha ma ziga ụgbọelu e ji alụ agha nso
obodo ahụ.